E kwesiri imeghari ntuliaka eji họpụta Uzodinma - Nnamdi Kanu

Nnamdi Kanu Image copyright @MaziNnamdiKanu

Onyeisi otu na-achọ ka ekwewapụta mba ha kpọrọ Biafra na Naịjirịa bụ "Indigenous Peoples of Biafra" (Ipob) bụ Nnamdi Kanu sị na e kwesiri imegharị ntuliaka nke nyere Hope Uzodinma ohere ị bụrụ aka na-achị Imo steeti.

Kanu kwuru nke a n'ozi ọ gbasara n'akara Facebook Radio Biafra London ụnyaahụ.

Ọ sị na mmeri Uzodinma site n'ikpe ulọikpe Ukwu Naịjirịa kpere bụ ihe mmegide dịrị ndị Igbo makana ọ bụ ụzọ ndị ọ sị bụ ndi "Fulani" jiri si chọọ ịchị ala Igbo.

Ihe ọzọ ọ sị mere ikpe a ekwesịghị ịkwụ bụ makana "ọ ga-abụzị usoro a ga-eji na-ekpe ụdịrị ikpe a site n'atụmatụ Bekee kpọrọ Legal Presedence".

N'ịga n'ihu, Maazi Kanu sị: "Ihe e kwesiri ime bụ ịkagbụ ntuliaka a kpam kpam ka ndị Imo jiri aka ha họpụta onye ga-achị ha."

Maazị Kanu kwukwara na ọ bụ ezigbote ihe ọjọ mmadụ ibinyere onye masịrị ya aka ma emecha onye ga-emeri abụru onye ahọpụtara n'Abuja.

Ọ sị na ọ bụ ihe mere ya jiri sị na "Fulani ewerela ọnọdụ n'Imo steeti."

Ọ sịkwa: "Ihe a ha mere n'Imo bụ ụdịrị ihe ha na-eme n'ala Igbo kemgbe, nke bụ ịmanye ndị Igbo eze, dika ndị Briten meburụ na mbụ.

Ọ sị na ihe mere ndị mmadụ anaghị eme ngaghari iwe maka ihe na ihe ndi ọzọ bụ maka ụdịrị agwa gọọmentị Naịjirịa kpasịrị Ipob.

N'ime ozi ya, Maazi Kanu jụrụ ndị otu ya ma "o nwere ihe oma ga-apụta n'ọchịchị Hope Uzodinma?"

Ihe ọzọ o tinyere ọnụ n'ozi a bụ atumatu nchekwa obodo aka na-achịgasị steeti dị iche iche na Ọdịda Anyanwụ Naịjirịa Hibere.

Kanu sị na ya na ndị otu ya ga-enye atụmatụ a nkwado nke gunyere inye ndị Ọdịda Anyanwu ndị mmadụ ga-ensonye na ya bụ atụmatụ.

"Atụmatụ bụ ihe anyị chere oge anyị hibere ngalaba anyị kpọrọ "Biafra Secret Service (BSS), ya mere anyị ji akwado ya ọfuma."

"Ugbua, ị gaghị anụ maka mwakpo nwaanyị maọbụ mkpa mkpa ndị Fulani n'Ọdịda Anyanwụ Naịjirịa."

Ihe ọzọ o tinyekwere ọnụ bụ ihe ọ sị bụ etu e jiri na-agba ndị Ipob mgba okpuru, nke ọ sị na Facebook, Reuters, Channels TV nakwa BBC Igbo so na ndị na-eme.

Dịka o si na-ekwu kwamgbe, Kanu si na ndi ntaakụkọ bu ndị ilo ya na Ipob makana ọ bụghi ihe ọ chọrọ ịnụ ka ha na-ede.

Agbanyeghị okwu Kanu kwuru, mkpebi Ụlọikpe Ukwu maka Imo enweghi mgbagha.

Ọchịchi Hope Uzodinma abụrụla ihe ga-aga n'ihu ruo afọ anọ etụ ọbụla o siri gaa.

Akụkọ ga-amasị gị:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionNnamdi Kanu: Azikiwe tinyere ndi Igbo n'ọmị ha nọ na ya