Corruption Perceptions Index: Obasanjo,Ezekwesili nyụrụ ihe na-esi- Onye ọrụ Buhari

Olusegun Obasanjo, Oby Ezekwesili na Laureta Onochie Image copyright Getty/Ezekwesili/Onochie

Onye nnyemaka pụrụiche nke Onyeisiala Muhammad Buhari bụ Laurette Onochie na-arụ Olusegun Obasanjo na Oby Ezekwesili aka maka ajọ aha nnyocha Transparancy International nyere Naijiria na nsonso a.

Nnyocha nke otu na-eme ngụkọ maka ịkwụba aka ọto n'ụwa niile bụ "Transparency International" gosipụta na Naijirịa kpụụ afọ n'ala ada ngụkọ mba na-akwụba aka ọto nke afọ 2019.

Ha kwuru na Naịjirịa bụ mba nke anọ ebe nrụrụaka kacha njọ n'Ọdịda Anyanwụ Afrịka.

Mana Onochie kwuru na nnyocha ha adabaghị n'ihi na ọ bụ ndị 'iweobi' Obasanjo na Oby Ezekwesili nyụrụ ihe na-esi n'ihi na ọ bụ ha hiwere otu Transparency International.

O gara n'ihu gwaa ụmụ Naijria ka ha ghara iji nnyocha ahụ Transparency International wepụtara kpọrọ ihe.

"Onyeisiala Buhari bụ onye ọkaibe n'ibu agha megide nrụrụaka n'Afrịka."

Na-agbanyeghị na ọchịchị Buhari na-etisi mkpu ike sị na ha na-ebu agha megide nrụrụaka, nnyocha Transparency International kwuru na Naijiria na-agba ọnụba.

Mana ya bụ nnyocha na-arụ ngalaba gọọmenti na-ebu agha megide nrụrụaka dịka EFCC na ICPC afọ.

N'onwe ya Ezekwesili onye sị okwu Collin Powell tụọ ilu kwuru na ọ bụ kụrụ ka ọ ga-aghọrọ.

O kwuru n'akara Twitter sị' "Okwu Collin Powell nke sịrị na 'O nweghị ụzọ nzuzo e si enwe ọganihu karịa nkwado, itinye uchu nakwa ịmụta ihe site na ọdịda' bụ ihe gbatara m n'obi oge m hụrụ nnyocha Corruption Perception Index ọhụrụ."

Nrụrụaka n'ọdịda anyanwụ Afrịka: Naanị Chad, Guinea Bissau na Cameroon ka Naịjirịa ka mma

Naịjirịa bụ mba nke anọ ebe nrụrụaka kacha njọ n'Ọdịda Anyanwụ Afrịka.

Nke a bụ dịka nnyocha ọhụrụ ndị otu 'Transparency International' wepụtara n'ụbọchị Tọzde si kwuo.

Naanị Cameroon, Chad nakwa Guinea Bissau ka Naịjirịa ka mma na mpaghara ọdịda Anyanwụ Afrịka.

N'Afrịka niile Naịjirịa gbara 33 n'ime mba 48 e nyochara.

N'ụwa niile, nnyocha ahụ gosiri na Naịjirịa bụ ndị nke 146 n'ime mba 180.

Nke a bụ na-agbanyeghi na ọchịchị Muhammadu Buharị etuola ọnụ na ha ebutuola nrụrụaka na Naịjirịa.

Nkenke aha onyonyo Ọ bụ kwa afọ ka ha na-edepụta etu mba uwa niile sị kwuba aka ọtọ

Otu 'Civil Society Legislative Advocay Centre' (CISLAC) nke bụ otu na-anọchite anya 'Transparency International' kọwara ihe nrụrụaka jị aka njọ na Naịjirịa.

Auwal Rafsanjani, onyeisi otu CISLAC kwuru na gọọmentị etiti ka na-enupu isi nye mkpebi ụlọikpe.

Rafsanjani kwukwara na nrụrụaka na ndọrọndọrọ ọchịchị bawanyere na Naịjirịa n'afọ gara aga.

Nkenke aha onyonyo Ndị nyere aka na nyocha a

Lee ka ụfọdụ mba ndị ọzo bụ agbata Naijirịa sị kwụrụ

Mba Ebe ha nọ Akara
Ghana 80/180 41/100
Cameroon 153/180 25/100
Benin Republic 80/180 41/100
South Africa 70/180 44/100
Togo 130/180 29/100
Egypt 106/180 35/100
Nigeria 146/180 26/100

Ihe gọọmentị kwuru

Nkenke aha onyonyo Abubakar Malami bụ Ọkaiwu ukwu gọọmentị etiti

Mana gọọmentị etiti ekwenyeghi n'ihe ndị Transparency International kwuru.

Ọkaiwu ukwu bụ Abubakar Malami kwuru na otu ahụ ejighi ihe akaebe ọbụla wee mee ya bụ nnyocha.

Malami kwuru na ọchịchị onyeisiala Muhammadu Buhari emeela ka nrụrụaka gbadata nke ukwu na Naijiria

Ọ gara n'ihu maa Transparency International aka n'ihu ka ha gosipụta etu ha si mee nnyocha ha.

'Lassa Fever' ka na-akpa ike

Nkenke aha onyonyo Eburula

Iba Lasa aribatala n'Enugwu steeti.

Onye ntaakụkọ BBC gara ụlọọgwụ Parklane ebe ndị ọrụ nọ na gbagharia dịka orịa lassa Fever gburu otu nwaanyị gbara afọ iri asaa na ise ebe ahụ.

Ka ọ dị ugbua, enwetela mkpesa Lassa fever na Ondo,Abia, Delta na Kano steeti.

ọrịa a egbuola dọkinta abụọ na nwaanyị dị ime na Kano, mmadụ iri na isii na Ondo steeti, otu nwoke n'Abia steeti.

Mmachị obodo Wuhan nke dị na China

Nkenke aha onyonyo Nje Corona egbuola mmadụ iri na asaa na mba China

Ka akụkọ nje na ọrịa na-aga n'ihu, ndị mba China amachiela mbata ma ọ bụ ọpụpụ na obodo Wuhan maka nje Corona nke na-egbu ndị mmadụ ka ọrịa SARS.

Nyocha na egosi na ọ bụ na Wuhan ka ya bụ nje siri bido site na-ire anụ ọhia. Mmadụ iri na asaa anwụọla ebe ihe dịka mmadụ narị ise na iri asaa bụ ya bụ ọria ma otutu ha bị na Wuhan.

Ọkụ Ọstrelịa

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ọkụ a egbuola otutu mmadụ ma mebie kwa ihe

Mmadụ atọ anwụọla dịka ụgbọelu eji emenyu ọku dara na mba Ọstrelịa.

Mmadụ atọ a bụ ndị mba Amerịka sọ na mmadụ iri ato na atọ nwurula maka ọku a bidoro gbawa kamgbe ọnwa Seputemba 2019.

Dịka ọ dị ụgbụa, amabeghị ihe mere ka ya bụ ụgbọelu daa.