Nnamdi Kanu: Yoroba agakwala n'ụlọomeiwu steeti ime iwu maka Amotekun

Onye ndu otu Ipob Nnamdi Kanu adọọla ndị ọdịda-anyanwụ aka na ntị sị ha ha chọọ ka okwu Amotekun nwee isi ha agakwala ụlọomeiwu steeti ha ime iwu maka Amotekun.

N'ozi ọ gbasara n'abali Fraide, na soshal midia, o kwuru na a ga-eji ndọrọndọrọchị na ego mesaa ndị ụlọomeiwu ha anya ma ekposa ya bụ otu nche.

Kanu , onye tụrụ arịrị n'ogbugbu mmadụ ka na-arị elu na Naijria, toro ndị gọvanọ ndị steeti nọ na Ọdịda anyanwụ maka ịtụpụta atụmatụ Amotekun. maka ichekwa mpaghara ha.

Ọ gara n'ihu kwaa ndị gọvanọ Ọwụwa anyanwụ emo maka ị nọ ịnọ mmadụ mmadụ na-esi mmụọ mmụọ.

Ọ gara n'ihu " Ihe ndị Ugwu ji ka anyị mma bụ na eche anyị ego n'ihi anyị ara ụmụ nne anyị ree agbụụ anyị."

Brexit: Anyị ga-apụ n'Jenụwarị- Boris Johnson

A họpụtala Boris Johnson ka Praim Minista Briten ọhụrụ Image copyright @BorisJohnsonTwitter

Boris Johnson ebinyela aka na Mba Briten ga-apụ na EU n'aabalị 31 nke ọnwa Jenụwarị afọ a.

Naijiria na mba Macao ga-agbanwerịta ndị nke ha a tụrụ mkpọrọ

Muhammadu Buhari e Image copyright NGRPresidency

Onyeisiala Muhammadu Buhari ebinyela aka na nkwekọrịta ka Naijiria na Obodo Macao dị n'okpuru China ịgbanwerịta ndị nke ha a tụrụ mkpọrọ. na mba abụọ ahụ.

Ozi sị akara Twitter ụlọọrụ onyeisiala kwuru na nke a na-eso nkwubi okwu nke imeobi gọọmenti etiti nwere maka ya bụ okwu n'abalị mbụ nke ọnwa Ọgọst afọ 2018.

Ha nọrọ ebe ahụ nọrọ nye ọkaikpe ukwu Naijiria ntụzịaka ka ọ kwado akwụkwọ nkwekọrịta ahụ.

Kingsley Moghalu edegarala Ụlọomeiwu Ukwu akwụkwọ mkpesa

Kingsley Moghalu Image copyright @MoghaluKingsley
Nkenke aha onyonyo Kingsley Moghalu bụbu osote onyeisi ụlọakụ etiti bụ CBN n'aha ịchafụ

Kingsley Moghalu bụ nwa afọ zọrọ ọkwa onyeisiala n'aha otu YPP edegarala ụlọomeiwu Ukwu Naijiria akwụkwọ mkpesa were kpọọ oku ha haziharịa iwu ntuliaka.

Moghalu chọrọ ka e me ya iwu iji teknụzụ eme ntuuliaka dịka ịdeba aha,inyocha aha nakwa ikpokọta mpụtara vootu a tụkọtara na ntuliaka.

Ọchọrọ ka iwu Naijiria nabata 'smart card reader.'

O kpokwara oku ka enye ohere ka ụmụ Naijiria nọ mba ọzọ nwe ike ịtụ vootu ebe ọbụla ha nọ.

Na nkọwa ya inwe ntuliaka kwụ ọtọ bụ ihe ga-eweta ezi ntọala nye ọchịchị onye kwuo uche ya nakwa idinotu Naijiria.

Ifeanyị Ubah: Ụlọikpe enyela iwu ka Inec gbaa jim

Ifeanyi Ubah Image copyright IFEANYI UBAH

Ụlọikpe Ukwu dị n'Abuja enyela Inec iwu ka ha cheregodị n'okwu mkpebi ụlọikpe nyeburu ka achutuo Ifeanyị Ubah dịka Senetọ na-anọchite Anambra South.

Cheta na ụlọikpe nke Jọstis Bello Kawu no n'isis ya chụtụburu Ubah maka ebubo iji asambodo NECO adgboroja were zọọ ọkwa Senetọ na ntuliaka e mere n'ọnwa Februwarị afọ 2019.

Kawu nọkwara n'abali 17 nke ọnwa Jenụwarị afọ jụụ ịkagbu mkpebi e nyeburu n'ikpe ahụ.

Grand Slam nke 24 akwaala Serena Williams

Image copyright Getty Images

Serena Wiliams ka na-agba mbọ inweta ntụrụụgo Grand Salm iri abụọ na anọ nke Tenis, oruola mgbe ọ ga-ezu ike?

Williams apụọla na asọmpị Tenịs nke Australian Grand slam dịka Wang Qiang meriri ya na-agba nke atọ.

Wang jị akara 6-4 6-7 (2-7) 7-5 were merie Williams.

Ọ bụ kamgbe 2006 ka agbapụrụ Williams na agba nke atọ na asọmpị Grand slam n'ime afọ iri abụọ na atọ ọ pịawara Lọn Tenisi.

Williams emeribuola Wang gbara afọ iri abụo na asatọ n'asọmpị US open na ọnwa Sepụtemba 2019.

Williams gbara afọ iri atọ na asatọ na-agba mbọ ịnweta nturu ugo grand slam nke iri abụọ na anọ ya ma Wang abụrụla ya ọgbatauhe.

Maka ọkụ Latrik na Naijirịa

Image copyright AFP
Nkenke aha onyonyo Ọkụ LAtrik na-anyụ Naijirịa ịkpakụ

Gọọmentị Naijirịa na-atụli ma ha a ga-enwụgharị ngalaba niile na-ahụ maka ọkụ latrik n'ihi na kamgbe 2013 enyefere ya n'aka ndị abụghị gọọmentị, ndị Naijirịa nde iri asatọ enwebeghị ọkụ Latrik.

Nke a pụtara ihe dịka ha mere nzụkọ National Economic Council n'ụbọchi Tụzde ebe Gọvanọ Kaduna steeti sị na a ga-achọ ụzọ ị dozi nsogbu a ma sị kwa na ngwọta nsogbu a agaghị atọ ọchị.

N'Imo steeti

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ndị uweojii

Ndi uweojii si na ha nwuchiela onye ha si na o bu ya egburu otu nwoke oge ndị isioche ọkpuru ọchichi iri abụọ na asaa mere ngagharịiwe n'imo steeti maka mwepụ ewepụrụ ha?

Ha sị na Osuji Sabinus na ndị otu ya kpara mkpa mkpa ga-aga ịzara ọnu ha n'ulọikpe

N'Ofesi

Nke a bụ maka ndị chọrọ ịga Amerịka mụọ nwa ga-enwe akwụkwọ ikike dịka nwaafọ Amerịka.

Onyeisiala Mba ahụ bụ Donald Trump si na atụmatụ ahu abịala na njedebe dịka ha sị na ha agaghị enyezi ụdịri umụaanyi a akwụkwo ha ga-eji baa Amerịka.

Akụkọ ga-amasị gị