Imo governorship Judgement : Ihe mere ụlọikpe kachasị jiri wụọ Ihedioha n'ala, mee Uzodinma Gọvanọ

Ndị okaiwu

Ụlọikpe kachasị ewepụtala akwụkwọ maka ikpe ha kpere nke mere ka ha ji chụpụ Emeka Ihedioha ma tinye Hope Uzodinma dịka Gọvanọ Imo steeti.

Ihe ise gbara ọkpụrụkpụ na ya bụ akwụkwọ ikpe bụ;

1. Na ndị okaiwu Hope Uzodinma gbara akwụkwọ gosipụtara akwụkwọ nke ha jiri gosi mpụta n'ọgbọ atụmvootu dị narị atọ iri isii na isii n'Imo steeti.

2. Ndị okaiwu Emeka Ihedioha egosighị ihe igba ama ga-egosi na akwụkwọ mpụta ntụliaka ndị okaiwu Hope Uzodinma ji bụ "adigboroja" dịka ha siri kwuo.

3. Akwụkwọ ndị uweojii nke gosiri mpụta ntụliaka na ọgbọ 366 ndịa gosiri na nke ndị Okaiwu Hope Uzodinma jị bụ eziokwu.

4. Ndị Inec eweteghị ihe igbaama ga-egosi na akwụkwọ ọkaiwu Uzodinma ji abụghị nke ezigbo ya.

5. Ụlọikpe Kachasi sitere n'ikike iwu Naijirịa nyere ha were nye Hope Uzodinma ọchịchị Gọvanọ Imo steeti n'ihi na Ọkaiwu Emeka Ihedioha na ndị Inec enweghị ihe Igba ama gosiri na ikpe Hope Uzodinma gbara enweghi isi.

Ọkaiwu bụ Ugo Egbujo kọwara BBC ihe mere ikpe jịrị gaa etu o siri gaa -

Akwụkwọ Hope Uzodinma gbara megide Emeka Ihedioha

Lee ihe ndị gbara ọkpụrụkpu Hope Uzodinma na ndị Okaiwu ya jiri bia ikpe

  • Ha ji mpụta ikpe ekpere n'ọdọ ntụliaka narị atọ iri asatọ na asatọ
  • Ha kwukwara na ntụliaka ndịa gara nke ọma
  • Kama na INEC sị na akagburu ntụliaka n'ebe ndị ahụ
  • Mmadụ narị pụkụ abụọ na iri na atọ (213,000) mere ntụliaka n'ebe ndị ahụ
  • Na n'ime ntụliaka 213,000, na Hope Uzodinma nwetere otu pụkụ na narị itolu (1,900)
  • Ha kwuru na etinye ntụlịaka otu puku na narị itolua a, na Hope Uzodinma meriri dịka Gọvanọ Imo Steeti

Ihe Emeka Ihedioha na ndị Okaiwu ya jiri bịa ikpe

Ndị ọkaiwu Emeka Ihedioha kwuru sị na ihe mere INEC anabataghị mpụta ntụliaka ndịa bụ maka na enweghị ntụliaka ọbụla emere ebe ahụ.

Ihe INEC kwụrụ maka ikpe ndị okaiwu Hope Uzodinma gbara

Ndị ngalaba na-ahụ maka ntụliaka na Naijirịa bụ Independent NAtional Election Committee (INEC) sị na ha anabataghị akwụkwọ mpụta Hope Uzodinma jiri bia n'ihi na emeghị ntụlịaka ọbụla n'ebe ndị ahụ.

Etu ikpe siri gaa n'ụlọikpe mkpegharị

Hope ụzodinma na ndị okaiwu ya jị akwụkwo ha sị na ọ bụ mpụta ntụliaka emere n'ọgbọ ntụliaka 388.

Ulọikpe gwara ha ka ha kpota ndị ọrụ INEC ndị rụru ọrụ na ọgbo ntụliaka ndịa ahụ ka ha kwuo na ọ bụ eziokwu na emere ntụliaka n'ebe ndị ahụ.

Kama naanị mmadụ iri abụo na itolu n'ime narị atọ na iri asatọ na asato rụru ọrụ ebe ahụ.

Ma sịkwa na ndi uweojii ha kporo kwesịrị ịkpọ ndị uweojii niile no n'ebe ndi ahu ka ha bia kwuo ka ọ sịrị gaa.

Ụlọikpe ndịa sị na ọbụghị nanị Komishọna ndi uweojii Imo steeti ga-ekwuchitere ndi uweojii ahụ.

Ihe merziri ụlọikpe kachasị jiri nyefee Hope Uzodinma ọchichi gọvanmọ Imo steeti

Ụlọikpe kachasi si na ekwesịghị ikpota ndị ọrụ INEC rụru ọrụ n'ọgbọ ntụliaka ndị ahu na ọ dịri INEC iwepụta akwụkwọ mpụta ntụliaka ahụ ma ọ bụru na ha sị na nke Uzodinma ji bu adigboroja.

Dịka ndi INEC na adoola azu maka iwepụta ya bu akwụkwo, ndị uweojii wepụtara akwụkwo ntụliaka nke ha.

Uloikpe kachasi chọpụtara na o bụ otu ihe na nke Hope Uzodinma weputara.

Emeka Ihedioha na ndi okaiwu ya eweputaghi akwụkwọ mpụta ntụliaka nke ga-egosi na nke Uzodinma bụ asị.

Dịka ndi INEC na ndị okaiwu Emeka Ihedioha enweghi ike iwepụta akwụkwọ mpụta ya bụ ntụliaka, ụloikpe kachasị gbebiri na ọ bụ Hope Uzodinma meriri ya bu ntụliaka.

Ụlọikpe kachasị meziri Hope Uzodinma Gọvanọ Imo steeti.

Isiokwu Ndị Emetụtara