Nigerian Army: Ha bịara na-amaja ndị Afaraukwu Ibeku - Emmanuel Kanu

Ndịagha Naịjirịa Image copyright Getty Images

Nwanne Nnamdi Kanu bụ Emmanuel Kanu sị na ọ bụ eziokwu na ndịagha Naịjiria batara n'obodo ha bụ Afaraukwu Ibeku dị n'Umuahia Abia Steeti.

Ọ gwara BBC Igbo nke a mgbe a kpọrọ n'ekwentị maka kepupu a nụrụ banyere ya.

Ọ sị na ha bu ngwaagha dị iche iche bata n'obodo ha n'ehihie ụbọchị ụka ma bido ịmaja ndị mmadụ.

Kanu sị na nke a butere oke egwu n'obodo dịka onweghi onye mara ihe ha bịara ime.

Ọ sị na ọ bụ ụdị ihe ha mere n'afọ 2017 butere ọnwụ nne na nna ya bụ ndị a na-akwado ili.

BBC Igbo kpọrọ ọnụ na-ekwuru ndịagha Naịjirịa bụ Musa Sagir n'ekwentị ịnụta n'ọnụ nke ha mana ọ zaghị.

Daniel Amokachi ga-anọchite anya Naịjirịa n'okwu ịgba bọọlụ

Image copyright Getty Images

Onyeisiala Muhammadu Buhari ahọpụtala Daniel Amokachi dịka onye ga-anọchiteanya Naịjirịa n'ihe banyere egwuregwu bọọlụ.

Ọ ga-enyere mịnịstrị na-ahụ maka egwuregwu na ndị ntoroọbịa aka ịnyopụta ndị na-eme nke ọma n'egwuregwu bọọlụ.

Cheta na Amokachi so n'ime ndị Super Eagles mabutere iko mba Afrịka n'afọ 1994 nakwa ọlaedo n'Atlanta Olympics n'afọ 1996.

Nkeji

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Ihe nkiri

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionImo State Election: Agbawara ndị Imo Steeti aka napụ ha ọchịchị

Naịjirịa ewpụtala okpụrụ visa ọhụrụ

Image copyright Twitter/Bashir Ahmad

Onyeisiala Muhammadu Buhari enyela ndị ya na-arụ ọrụ ụkpụrụ 'visa' Naịjiria.

Dịka ọnụ na-ekwuchitere Buhari bụ Bashir Ahmad si dee na Twitter, ya na ndị na-arụrụ ya ọrụ gụnyere Lai Mohammed bụ minista na-ahụ maka mgbasaozi na Naịjiria, nọ n'ime nzụkọ ime ụlọ ebe ọ na-egosiputa atụmatụ a.

Tolu Ogunlesi bụkwa ọnụ na-ekwuchitere onyeisiala Buhari kọwara etu atụmatụ a si metụta ma ndị chọrọ ịbịa mee ihe dị iche iche na Naịjirịa.

'World Cancer Day'

Taa bụ ụbọchị anọ nke ọnwa Febrụwarị, bụ ụbọchị mbaụwa wepụtara kwa afọ maka ọrịa akpụ a kpọrọ Cancer na Bekee.

Ị nyochaala onwe gị? Kwadokwa ndị na-arịa ya nakwa ndị si n'ọrịa a gbakee.

Lee akụkọ onye meriri ọrịa a:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media caption'Eji m ụkwụ bịa ụlọọgwụ mana ozigbo m nụrụ ihe na-eme, aganwụzịghị m ije'

Dịka ọrịa coronavirus na-abawanye na Chaịna nakwa mba ndị ọzọ, otu nwata akwụkwọ Naịjirịa nọ na mba ahụ emepeela mpio etu ọnọdụ ha ebe ahụ si kwụrụ.

Nwa ahụ na-achọghị ka a kpọọ aha ya, gwara BBC Igbo na ọnọdụ ha na Chaịna, bụ ebe ọ na-agụ mahadum, adịghị mma ma ncha, na ha "ahụghị gọọmentị anya nke ha ji anụ ọnụ okwu ha".

Gụọ akụkọ a n'uju ebe a:

arap Moi anwụọla

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Daniel arap Moi chịrị dịka onyeisiala mba Kenya site n'afọ 1978 ruo 2002

Daniel arap Moi bụbu onyeisiala mba Kenya anwụọla n'afọ iri itoolu na ise.

Arap Moi rituru n'ọkwa n'afọ 2002 ka ọ chịchara afọ iri abụọ na anọ, nwụrụ n'isi ụtụtụ taa.

N'egwuregwu,

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo John Mikel Obi gara Trabzonspor n'ọnwa Julaị afọ 2019 ka o si Middlesbrough gafete

Otu egwuregwu Trabzonspor akatọọla ịkpa oke agbụrụ ndị mmadụ kpasoro John Mikel Obi bụbu onye ndu Super Eagles, na soshal midia ka ha zutechara ma merie Fenerbahce n'ụbọchị Satọde.

Trabzonspor kwuru na ha emeela mkpesa maka okwu a n'ụlọikpe.

A ga-emegharị ntuliaka ọkwa onyeisiala mba Malawi

Image copyright AFP
Nkenke aha onyonyo Lazarus Chakwera (n'aka ekpe) na Saulos Chilima (n'etiti) wetere mkpesa ka e nyochaa mpụtara ntuliaka ahụ kpọpụtara aha Peter Mutharika (n'aka nri) dịka onyeisiala

Ụlọikpe dị na mba Malawi enyela iwu ka e megharịa ntuliaka, dịka ọ kagburu mpụtara kpọghachịtara onyeisiala Peter Mutharika n'ọkwa n'ụbọchị 21 nke ọnwa Mee afọ 2019.

Ọkaikpe nyere iwu ahụ ka a chọpụtara na mpụtara ntuliaka ahụ agaghị n'anya ya etu o kwesịrị, ma kwuo ka e mee ntuliaka ọzọ n'ime ụbọchị 151.

Ụlọikpe ahụ kwukwara na Onyeisiala Mutharika ga-anọkwa n'oche ọchịchị ya ruo mgbe e mere ntuliaka ọzọ.

Nke a emeela ya ntuliaka mbụ a ga-agbagha n'ụlọikpe kemgbe Malawi nwetara nwereonwe ha n'afọ 1964.

Eduola iyi ọrụ n'Imo steeti

Eduola Cosmas Iwu bụbu odeakwụkwọ gọọmentị Imo steeti n'oge Ikedi Ohakim n'iyi ọrụ n'otu ọkwa ahụ n'okpuru Hope Uzodinma.

E dukwara Cyprian Akaolisa iyi ọrụ dịka Ọkaiwu kachasị na kọmishọna na-ahụ maka ikpe ziri ezi nke steeti ahụ, ma dukwaa Nnamdi Anyaehie iyi ọrụ dịka onyeisi ndị ọrụ nke steeti ahụ.

'Ịza nwunye ka mma'

A na-abọkasị Adamu Garba zọburu ọkwa onyeisiala Naịjirịa ka ọkụkọ n'elu soshal midia, dịka o kwuru na nwaanyị ịza 'nwunye' ka mkpa karịa ịchị ụlọakụ CBN.

Ndị mmadụ akpọkachaala ya ntu maka okwu ya:

Cheta na Garba bụkwa onye kwuru na ọ bụ ndụ ndị Amerịka ndị Naịjirịa na-ebi ka e kwesịrị ịta ụta maka etu ụfọdụ ndị Naịjirịa si echefu onwe ha na ebe ha si.

Ọnọdụ Neymar

Neymar agaghị eso ndị PSG mgbe ha ga-ezute Nantes taa dịka e kwuputara na ọ merụrụ ahụ n'egwuregwu nke satọde.

Image copyright Getty Images

Neymar dị afọ 28 na onwe ya, kpọrọ pati ụbọchị ụka iji mee emume ụbọchị ncheta ọmụmụ ya.

Gere akụkọ BBC Igbo n'otu nkeji:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Ihe nkiri a ga-amasị gị:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media caption' Ọ bụrụ na Naịjiria dị mma echeghi m na a ga-enwe IPOB' - Fr. Ebube Mmụọnsọ

Isiokwu Ndị Emetụtara

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a