Africa Eye: Etu ndị ọrụ nchekwa Naịjirịa si eji 'tabay torture' ata ndị mmadụ ahụhụ

Africa Eye: Etu ndị ọrụ nchekwa Naịjirịa si eji 'tabay torture' ata ndị mmadụ ahụhụ

Ịdọ aka na ntị: Ihe onyonyo a gosiri ihe ntaramahụhụ dị icheiche.

BBC Arican Eye mere nnyochapụta pụrụ iche nke gosiri na ndị ọrụ nchekwa Naịjirịa na-eji ọtụtụ ụzọ ntaramahụhụ emekpa ndị mmadụ ahụ.

Iwu Naịjirịa megidere ịta mmadụ ahụhụ, mana usoro ntaramahụhụ a kprọrọ 'tabay' bụ nke ndị ọrụ nchekwa Naịjirịa na-ejikarị emenyụ ndị mmadụ anya.

Nnyochapụta gosiri ebe 'tabayi si malite ma gosikwa ndị kacha eji ya ata ndị mmadụ ahụhụ.

Anyị chọpụtakwara na otu onyeisi ndị uweojii ji ụzọ dị otu a taa otu nwata ahụhụ n'afọ 2014.

Nkọwa foto,

Onye e ji 'tabay torture ata ahụhụ

Nwata nwoke ahụ mechara nwụọ n'ihi ahụ o merụrụ.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: