Bayelsa Judgment: Njem APC abịala na njedebe tupu ọ malite na Bayelsa

David Lyon and Muhammadu Buhari

Ebe foto si, Nigeria Presidency

Ụlọikpe ukwu n'Abuja ewerela ọchịchị Bayelsa Steeti nyeha patị Peoples Democratic Party (PDP).

Nke na-abịa dịka ulọikpe kpebiri na onye zọrọ ọchịchị dịka osote Gọvanọ Bayelsa n'okpuru patị All Progressives Congress bụ Biobarakuma Degi-Eremieoyo etozughi ịzo ọchịchi.

Ndị Ọkaikpe nke Mary Odili no n'isi ha sị na nkagbu njem Degi-Emeriewoyo metụtara vootu David Lyon jiri pụta dịka gọvanọ Bayelsa nke mere na ya onwe ya etuzughi.

Ha sị na ọchịchị ga-efezi n'aka Douye Diri nke PDP.

Ọ bụ n'ụbọchi 14 nke ọnwa Febụwarị ka a na-elebu anya na David Lyon kwesiri ịṅụ iyi ọrụ.

Ọ bụ Maazị Diriga anụzị iyi ọrụ n'oge ahụ.

A kwụrụ ndị mmadụ ụgwọ ịkwa Buhari emu - Garba Shehu

Ebe foto si, Buhari Salad

Ndị ọrụ onyeisiala Buhari sị na ọ bụ ndị na-agba ọchịchị ya ụkwụ kwụrụ ndị mmadụ ụgwọ ka a kwaa ya emu na Borno Steeti mgbe ọ gara njem nleta.

Ọnụ na-ekwuru onyeisiala Buhari bụ Garba Shehu gwara BBC na nke a abụghị uche ndị Borno niile.

Ọ sị na mgbe ha rutere n'ọdọụgbọelu dị na Borno, na ọtụtụ ndị mmadụ malitere ikele Onyeisiala Buhari na ndị otu ya.

Mana enwere ụfọdụ ndị nọ na-eti mkpu na ha achọghị onyeisiala, na ndị a bụ ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị kwụrụ ụgwọ ime nke a.

Ọkaikpe Ijeoma Ojukwu nke ụlọikpe ukwu dị n'Abuja agbatiala ikpe Omoyele Sowore onye nchịkọta Revolution Now ruo ụbọchị 11, 12 na 13 nke ọnwa Maachị.

Ụbọchị ndị a ka ọ ga-achabi ikpe a dị n'ebubo gọọmentị etiti boro Sowore na Bakara.

Ndị ọkaiwu gọomentị nke A.A Aliyu nọ n'isi ya sị na gọọmenti sepuru aka n'ebubo eboro ha na mbụ ma bo ha nke ọhụrụ abụọ ọzọ.

Ebubo ndị a gụnyere ịkpa nkata ịgba ọchịchị mgba okpuru nakwa ajọ ịgba ọchịchị mgba okpuru.

Mana Sowore na Bakare site n'ọnụ ọkaiwu hụ Abdul Mahmud sị na aka ha dị ọcha n'ebubo ndị a.

N'ofesi

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto,

Sajid Javid

Minista na-ahụ maka akụnauba na mba Briten bụ Sajid Javid agbaala arụkwaghịm.

Nke a na-abịa dịka kepu kepu na-ekwu na ya na Praịm Minista Briten bụ Boris Johnson nwere nghọtahie.

Ebe foto si, AFP

Otu ụgbọmmiri si Hong Kong tọrọ n'etiti osimmiri mgbe ọdọụgbọmmiri ise jụrụ ịnabata ya n'ihi egwu ọrịa coronavirus emechaala gbasa ụkwụ na mba Cambodia.

Nke a na-abịa dịka ọrịa a egbuola mmadụ narị abụọ na iri anọ na abụọ n'ụbọchị Wednezde na mpaghara Hubei nke Chaịna.

N'egwuregwu

Ebe foto si, Getty Images

Odion Ighalo bụ onye Manchester United zụrụ ọhụrụ esoghi ibe ya akwado n'otu ebe n'izu a maka ike nkwụcha n'ihi na o si mba Chaịna lọta.

Mana a na-atụ anya na ọ ga-eso ha gaa Stamford Bridge maka asọmpi ha na ndị Chelsea n'ụbọchị Mọnde.

Ebe foto si, Getty Images

Onye nchịkọta otu bọọlụ ndị Ijipt bụ Shawky Gharib ekwuola na ọ bụ Mohamed Salah na Liverpool ga-ekpebi ma ọ ga-eso Ijipt gbaa asọmpi Olympics na Tokyo.

Gharib sị na ọ masịrị ya ka Salah soro ha gbaa asọmpi a kama na ọ gaghị amagide ya n'ike.

Nkeji

Aha nkeananụānụ,

Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Ihe nkiri

Aha onyonyo,

Ihe ndị ị kwesịrị ime tupu ị nyapụ ụgbọala gị kwa ụbọchị