Imo state: Ụlọikpe ukwu ekwetala itinye anya n'ikpe ntuliaka gọvanọ Imo steeti

Úlóikpe Image copyright Getty Images

Nke kpọtụrụ ụmụibe bụ na Ụlọikpe ukwu dị n'Abuja ekwetala ilebanye anya na mkpebi ha nyere maka ntuliaka ọkwa gọvanọ Imo steeti.

Anyị nụrụ na ya bụ ụlọikpe etinyela ụbọchị iri na asatọ nke ọnwa Febuwarị maka ilebanye ya bụ ikpe anya.

Nwoke mabara mmiri na 3rd Mainland Bridge

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo A rụrụ akwa mmiri 'Thirdmainland' na 1990 n'ọchịchị Ibrahim Babangida

Akụkọ na-eru anyi ntị bụ na otu nwoke amakpuola na akwa mmiri nke atọ na Legọs gbuo onwe ya.

Akụkọ na-akọwa na ya bụ nwoke amatabeghị onye ọ bụ pụtara n'ụgbọ ala ya maba mmiri.

Ndị ọrụ mgbatagbata na-achọ ya bụ nwoke ka ọ dị ugbua.

Coronavirus egbuola mmadụ n'Irop

Image copyright Getty Images

Otu onye bụ onye Chaịna anwụọla n'aka ọrịa Coronavirus na France.

Minista ahụike nke France bụ Agnès Buzyn kwuputara nke a ụbọchị Satọde.

Nke a bụ onye mbụ nwụru na Europe kemgbe ya bụ ọrịa malitere ịkpa mkpa mkpa.

Norwich na Liverpool na-akwata

Image copyright Getty Images

N'egwuregwu, Liverpool na Norwich bụ ndị nke mbụ na ndị nke ikpeazụ na okpokoro Premier league na-ezute ugbua.

Norwich emerunbeghị Liverpool na ụgbọrọ iri na atọ ha gbagoro bọọlụ ebe Liverpool merigoro ha ugboro isii.

Image copyright Instagram/emperortelu1

Oluwo nke Iwo bụ Abdulrasheed Adewale Akanbi agbarala isi onwe ya n'okwu gbasa ọgụ a sị dara n'etiti ya na Agbowu nke Ọgbaagbaa bụ Sikirulahi Akinropo.

N'okwu ya, ọ sị na ọgbaghara a dapụtara n'ihi na Agbowu kpọrọ ya "onye ara" ma chọọ igwunye ya ọfọ ya n'anya.

Oluwo (bụ eze ndị obodo Iwo) kwuru na ha zara oku ndị uweojii kpọrọ ha ikpe udo maka oke ire ala ndị isi obodo ya na nke Agbowo na-ere ma na-azọ, mana Agbowo malitere ịkparị ya ma chọkwaa ịrụkpọ ya anya.

Oluwo kwuru na ọ bụ okwu ịgbata ala ndị eze nọ ya n'okpuru nke Agbowo so n'ime ya na-erefusi, butere okwu ọgụ na mgba a mere ka ọ na-agọrọ ọnụ ya.

Lee ihe ndị o kwuru n'elu Instagram ya:

A tọrọla onye ụkọchukwu ọzọ na Naịjirịa

Image copyright Facebook/St John Church Ladipo, Oshodi

Akụkọ na-eru anyị ntị na-akọwa na ndị ntọrị mmadụ atọrọla Fada Nicholas Oboh bụ otu ụkọchukwu na-arụ n'Uromi dayọsis n'Edo steeti.

Fada Oseabulu Odenore bụ onye na-achịkọta dayọsis ahụ dere na Facebook sị na ha ma na ọ ka dị ndụ dịka ha na-agba mbọ ịhụ na a tọghapụrụ ya na-enweghị nsogbu ọbụla, ma sị ndị mmadụ tinyekwa ọnọdụ ahụ n'ekpere.

Dịka ha si kwuputa, a tọrọla ụkọchukwu a n'ụbọchị Valentine bụ 14 nke ọnwa Febrụwarị.

Nke a na-abịa dịka elichara otu n'ime mmadụ anọ na-agụ akwụkwọ Fada ndị ntọ nwụchiri na Kaduna.

Ka anyị jikọọ aka ọnụ na Bayelsa

Gọvanọ ọhụrụ nke Bayelsa steeti bụ Douye Diri akpọkuola onye ọbụla ka ha jikọọ aka ọnụ wee dozie steeti ha n'agbanyeghi pati onye nọ.

Aka chịburu Bayelsa nakwa Naịjiria bụ Goodluck Jonathan kwukwara otu ihe ahụ ma tinyekwa ọnụ ịgwa Diri na ọ na-atụ anya na ọ ga-eme ọfụma n'oche ahụ.

Ọrịa Covid-19 atụọla ụkwụ n'Afrịka

Image copyright Reuters
Nkenke aha onyonyo Ihe karịrị mmadụ 63,000 bu ọrịa coronavirus a na Chaịna

Ngalaba World Health Organization (WHO) ekwuola na ha ga-enyere Ijipt aka ibuso ọrịa Coronavirus a na-akpọ Covid-19 agha dịka ha kwuputara na otu onye ebutela ọrịa a na mba ha.

N'otu aka ahụ, obodo Beijing dị na mba Chaịna enyela iwu si onye ọbụla na-alọghachite n'obodo kpọchie onwe ha maka nnyocha ọrịa coronavirus n'izu abụọ tupu ha agagharịwakwa.

Chelsea a ga-azụ Isco?

Kepu kepu si n'ọgbọ egwuregwu apụta na-akọwa na Chelsea na Arsenal na-achọ etu ha ga-esi gote Isco n'aka ndị Real Madrid.

Ebe Jose Mourinho na-achịkọta otu Tottenham na-ekwu na ha 'na-esi' nrigote n'ọkwa ịbụ ndị nke anọ na tebulu mgbe Premier League afọ a ga-agwụ.

Image copyright Getty Images

Gịnị na-eme na Bayelsa steeti?

Ndị uweojii Bayelsa steeti amachiela ndị mmadụ ịgagharị na steeti ahụ site n'abalị ruo n'isi ụtụtụ, dịka ọgbaghara dapụtachara ebe ahụ.

Uche Anozia bụ kọmishọna uweojii steeti ahụ kwuputara nke a tupu e duo Duoye Diri n'iyi ọrụ dịka gọvanọ ọhụrụ nke steeti ahụ.

N'ofesi,

Ihe ruru mmadụ iri atọ gụnyere ndịagha itoolu anwụọla dịka ndị omekome wakporo mpaghara atọ na mba Malị.

Enwebeghi ndị kwenyere na ọ bụ ha bu mwakpo a n'isi, mana Aly Ousmane Barry bụ igwe otu obodo a wakporo kwuru na mwakpo a suru na-erughi awa ole ndịagha gọọmentị kwarala ngwongwo ha pụọ n'obodo ahụ.

N'egwuregwu,

Image copyright PA Media

A machiela otu egwuregwu Manchester City maka isonye n'asọmpi nke Yurop n'afọ 2020/21 ruo 2021/22 maka imebi iwu otu jikọrọ otu egwuregwu niile nke Uefa.

Iwu ndị ahụ gbasara akwụkwọ ikike ha nakwa usoro mkpata na mmefu ego nke ndị otu a.

Gụọ akụkọ a n'uju ebe a: A machiela Manchester City n'egwuregwu nke Uefa

Gere akụkọ BBC Igbo n'otu nkeji:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionBBC Nkeji

Ihe nkiri a ga-amasị gị:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionIhe mere ụlọ aja jiri bụrụ ọkachamma na mpaghara Afịrịka - Demas Nwoko