Anambra state: Aka akparala nwanyi ji arịrịọ mere akaọrụ

Nwaanyí na-arịọ arịrịọ Image copyright Haruna Mohammed

Aka ndị uweojii n'Anambra akparala otu nwaanyi ji aghọghọ ariọ ego na Orie Olisa dị na Ogbunike dị n'okpuruọchịchị Oyi.

Haruna Mohammed bụ ọnụ n'ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ sị na ama gbara na ya bụ nwaanyi kpọ ụmụaka abụọ arịọ arịrịo n'ahia na-eme na ya kpuru isi.

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionWorld Disability Day: Nwaanyị kpuru isi na-eme achịcha

Nwaanyị ahụ ndị uweojii sị na ọ gbara afọ iri atọ na asaa bụ onye Umuaka dị n'okpuruọchịchị Njaba nke Imo steeti.

Dịka Harụna kwuru ya bụ nwaanyị kpọ ụmụaka ụmụnwaanyị abụọ gbara afọ iri na otu (11) nakwa afọ asatọ (8) sicha Imo steeti.

Ọ sị na ya bụ nwaanyị gbara ama na ha kwara ndị nwe ụmụaka ahụ na ya ga-azụ ha na-akwụkwọ.

Dịka ndị uweojii na-enyocha ya bụ ihe, onyeisi ndị uweojii n'Anambra steeti bụ John Abang na-adọ ndị mmadụ aka na ntị ka ha kpachara anya maka udi mmadụ ha na-akpọnye ụmụ ha.

Ndị uweojii ekwuola nke ha maka mwakpo mere na Delta steeti

Image copyright AFP

Ọzọ ndị uweojii na Delta steeti agọọla were sị na ọ bụ nanai otu onye ka ha hụrụ ozu ya na mwakpo nke mere n'okpuruọchịchị Ugheli .

Cheta na akụkọ na-efegharị kwuru na gọvanọ steeti ahụ bụ Ifeanyi Okowa sị na aka ndị agha Naịjirịa dị na mmadụ asatọ egburu n'ebe ahụ.

Ighalo alta oyoyo!

Image copyright Press Association

N'egwuregwu, ahụchatala Odion Ighalo n'isiụlọọrụ ndị Manchester United dị na Carrington dịka ọ nọzuru oge ya n'ebe edowere ya maka nyọcha ọrịa Coronavirus.

Cheta na Ighalo nọ na mbibi na Shanghai Shenhua kemgbe afọ 2017 bụ ebe o si abata ugbua.

Edowere Ighalo n'akụkụ ebe ana enyocha ya maka Coronavirus kemgbe izuụka abụọ ebe ọ nọ eme ọzụzụ nke ya.

Mgbe ajụburu onye nkuzi ndị Manchester United bụ Ole Gunnar Solskjaer ma Ighalo a ga-eso sọọ na asọmpi ha nwere na Monde, ọ sị na ya ekwughị otu ahụ mana Ighalo ga-eso ha mee njem ya bụ egwuregwu.

Ọ sị na-ekwesiri ịnyetụ ya nwamgbe ka ọnwere ghọtachaa ụkwụ egwu ha na Manchester Untied tupu o soro gbawabọọlụ.

Ole siri, "Ọ bụ Ighalo ka ọ dịara ịgba mbọ sonye n'ihe a na-eme ngwangwa",

Ọchụchụ onye makpuru mmiri

Nkenke aha onyonyo Ndị gbata gbata gbatụtụ 'brake' n'ichọta nwoke ahụ

Ndị ụlọọrụ gbatagbata Legọs bụ Lasema, agbatụla brake n'ịchọta nwoke chọrọ igbu onwe ya site na isi n'akwammiri 3rd Mailnland maba na mmiri ụnyaahụ.

Ndị Lasema kwuru na ihe mere e ji kwụsịtụ ịchọ nwaamadi ahụ bụ maka etu mmiri si adọ ndị makpuru ịchọ ya nakwa ike ọgwụgwụ ji ndị na-achọ ya.

"Ụnụ e mekwala ngaghariwe"

Image copyright Getty Images

Ụlọọrụ onyeisiala adọọla aka ndị Naịjirịa aka na ntị maka kepu kepu na a chọrọ ime ngagharịiwe gbasara ndị isi ọrụ nchekwa Naịjirịa, n'ụbọchị Mọnde.

Ozi a si n'ọnụ na-ekwuchitere onyeisiala bụ Garba Shehu, kwuru na ha nụrụ na e goola ihe ruru mmadụ puku abụọ ga-eme ya bụ ngagharịiwe.

Enyemaka na-abịara mba Ọstrelia

Image copyright AFP

N'ofesi, Puku kwuru puku mmadụ agbakọọla maka emume ndị na-agụ egwu na mba Ọstrelịa ebe a na-atụ anya iji egwu tụkọta nde dọla iri.

A na-atụ anya na ego a ga-atụkọta ga-ezu iji nyere ndị bi na mpaghara obodo ebe nnukwu ọkụ ọhịa gbarichara n'ime ọnwa ole gara aga, aka.

Aha Kobe Bryant ga-dịgide

Image copyright Getty Images

N'egwuregwu, ndị NBA bụ ngalaba na-achịkọta egwu bọolụ nkata n'Amerịka ekwuola na nturuugo "onye kacha baa uru" n'asọmpi nke ndị a ma ama, ga-azawazị aha Kobe Bryant nwụrụ n'ihe mberede

ụgbọelu. Mara na oge ọ dị ndụ, Bryant ritere nturuugo ahụ ugboro anọ.

Coronavirus ọ nọzị n'ụzọ ụla?

Image copyright Reuters
Nkenke aha onyonyo Ọrịa Coronavirus na-ada n'ike n'ike

N'ofesi, Mba Chaịna ekwuola na ọnụọgụgụ ndị bu ọrịa Coronavirus arịghị elu n'izu a, dịka ọ bụ naanị mmadụ puku abụọ na itoolu bu ya.

Ka ọ dị ugbua, ihe karịrị mmadụ puku iri isii na asatọ bu ọrịa a na mba ahụ, ebe o gburula mmadụ otu puku na narị isii na iri isii na ise.

Mkpu na akwa n'Anambra

Image copyright FRSC

Ihe mgbawa obi mere dịka mmadụ atọ nwụrụ oge otu ụgbọala kpọnyere onwe ya n'ụgbọala kwụ n'ụzọ n'Amansea dị n'Anambara steeti.

Pascal Anigbo bụ ọnụ na-ekwuchitere ụlọọrụ ndị nchekwa okporoụzọ na steeti ahụ kwuru na mmadụ asatọ merụkwara ahụ dịka mberede a dakwasịrị ụgbọala ahụ si Jalingo na-aga Legọs.

Mmmadụ iri atọ na atọ anwụọla na Katsina

Ihe ruru mmadụ iri atọ anwụọla dịka ndị omekome bu egbe wakporo obodo Tsauwa na Dankar dị na Katsina steeti.

Kọmishọna uweojii nke steeti ahụ bụ Sanusi Buba gwara ndị ntaakụkọ na ọ bụ ndị agadị nwaanyị na ụmụaka ka a kacha gbuo n'ihi na ha agbanwughi ọsọ ka ndị obodo ndị ọzọ si mee.

Arsenal apịkaala Newcastle ga ụdara

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Obi bụzi ndị Arsenal pọlịnapolịna

Ndị Arsenal ji iwe were sị ndị Newcastle' Anyị abụghị ọgbọ' dịka ha ji ọkpọ goolu anọ were sị ha lawa.

Ọ bụ Aubemeyang bidoro ịnye goolu na nkeji iri ise na anọ ebe Pepe, Ozil na Lacazette were goolu nke ha were mezuo ya anọ.

Dịka ọ dị ugbua, ha bụzi ndị nke iri na tebulu asọmpị premiership.

Liverpool e nwere olileanya?

Image copyright Reuters

N'egwuregwu, a ka nwere olileanya ichukwude Liverpool n'ọsọ ibute iko Premier League nke bụ mbụ ha ga-ebu ya n'ime afọ iri atọ?

Echeghikwa m oo, n'ihi na mmeri ha meriri Norwich n'abalị emeela ka ha jiri pọintị iri abụọ na ise na-aga Manchester City bụ ndị na-eso ha n'azụ.

Nkeji nke taa

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionBBC Nkeji

Ihe nkiri a ga-atọkacha gị ahụ

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionIhe mere ụlọ aja jiri bụrụ ọkachamma na mpaghara Afịrịka - Demas Nwoko

Isiokwu Ndị Emetụtara