A tọhapụla Agba Jalingo n'ọnọdụ nwamgbenta

Image copyright @AmnestyNigeria

Njem onyentaakụkọ Agba Jalingo na mkpọrọ abịala na njedebe n'ọnọdụ nwamgbenta dịka e nyere ya ohere ịla ma siri be ya na-abịa ikpe.

Jalingo nọ mkpọrọ ụbọchị 179 ka e boro ya ebubo na ọ dara iwu site n'ihe o dere.

Ngalaba na-ahụ maka mmegide mmadụ akpọrọ "Amnesty International" so na-enwe anụrị maka ntọhapụ nwa amadị a.

Ndị uweojii amachiela ngagharị iwe maka ikpe Ihedioha na Imo steeti

Image copyright PDP
Nkenke aha onyonyo Ụmụnwaanyị na-ebe akwa oge ha mere ngagharịiwe n'Owere ụbọchị ụka

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Imo steeti bụ Godson Orlando Ikeokwu sị na ha amachiela ngagharị iwe maka mkpebie Ụlọ Ikpe Ukwu banyere ọkwa gọvanọ Steeti ahụ.

Maazị Ikeokwu sị na atụmatụ a bụ makana ha nụrụ kepu kepu na onwere ndị omekome na-akpa nkata ihe ọjọọ n'ogige ngagharị iwe ahụ.

Ha sịkwa dịka Ụlọ Ikpe Ukwu nabatara mkpesa Emeka Ihedioha maka mkpebi ya, ya bụ okwu abanyere ụlọikpe ọzọ, nke mere na-ekwesiri ịhapụ okwu n'aka ha.

Ọ nọkwa n'otu aka ahụ na-ekele ndị niile mere ngagharị iwe n'izu ụka gara aga n'etu ha jiri mee ha n'udo.

Ndị nkuzi mahadum dinara nwata akụkwọ nwereike gaa mkpọrọ afọ ise

Ụlọ Omeiwu na Naịjirịa na-eme nzukọ ụmụnna maka atụmatụ iwu ọhụrụ banyere inye ụmụakwụkwọ nsogbu idina ha na mahadum.

Iwu na-achọ ka atụọ onye nkuzi ọbụla dinara nwata akwụkwọ na mmanye nwereike ịga nga afọ ise.

Atụmatụ a pụtara dịka BBC mechara akụkọ gbasara inye nwaanyị nsogbu ndịna na mahadum e mere n'ogige Africa Eye a kpọrọ "Sex for Grades".

Sex bill

Iwu a na-achọkwa ka achụọ nwatakwụwkọ maọbụ onye nkuzi ọbụla achọputara na mkpesa ya maka mwakpo bụ asị.

Ya bụrụ na ndị omeiwu binyere aka n'iwu a, ha ga-enye ya ndị ọmeiwu obele ka ha binye aka tupu e nye ya onyeisiala.

Onweghi ndị wakporo m n'ụzọ Kaduna - Amaechi

Rotimi Amechi Image copyright Ministry of Transport
Nkenke aha onyonyo Rotimi Amechi minista na ahụ maka njem

Mịnịsta na-ahụ maka njem bụ Chibuike Amaechi ekwuola na onweghi mwakpo ọbụla ndị ntọrị wakporo ha n'ụzọ Kaduna n'ehihie Sọnde.

Nke a bụ iji katọọ akụkọ sị na ndị ekperima wakporo ụgbọoloko si Kaduna gawa Abuja bụ nke Amaechi so n'ime ya.

Amaechi bụ onye depụtara n'akara twitter sị ka ndị mmadụ ghara ị na-akọ ihe ha na-amaghị maka ya.

N'ozi a ọ sara otu nwaanyị a kpọrọ Aisha Yesufu, ọ sị na oweghi ihe ọbụla mere ya.

Ọsịsị ya a ebutele ọtụtụ okwu na soshal midia ebe ndị mmadụ na-akatọ ya n'ụzọ dị iche iche.

Otu nwaanyị a kpọrọ Aisha Yesufu sị na ihere kwesịrị ị na-eme Amaechi;

Etu nwata Afrịka si gbakee n'ọrịa coronavirus

Image copyright PAVEL DARYL KEM SENOUA

Mgbe Kem Senou Pavel Daryl dị afọ iri abụọ na otu butere ọrịa a kpọrọ Coronavirus na mba Chaịna ebe ọ na-agụ akwụkwọ, o kwuru na ọ gaghị ebu ya si Chaịna pụta.

Daryl rịara iba, ụkwara kpọrọ nkụ nakwa ihe ndị ọzọ gosiri na o bu ya bụ ọrịa.

O kwuru na o chetara mgbe ọ na-arịa ọrịa "Malaria" mgbe ya bụ njirimara Coronavirus ji ya.

N'okwu ya, " mgbe m na-aga ụlọọgwụ ịnata ọgwụgwọ maka Coronavirus, ana m eche ka ọnwụ ga-esi gbuo m."

Ọ nọ n'ụlọọgwụ ruo abalị iri na atọ na mba Chaịna ebe a na-enye ya ọgwụ mgbochi ọrịa "antibiotics" nakwa ọgwụ a na-enye ndị nwere ọrịa "HIV".

Dịka izuụka abụọ gachara, achọpụtara na ọrịa ahụ anwụọla pịị n'ahụ ya.

Nke a mere ka Daryl bụrụ onye mbụ n'Afịrịka butere ọrịa ahụ ma natakwa ọgwụgwọ gbakere ya.

Cheta na a chọpụtara onye bụ ọrịa Coronavirus virus na mba Egypt nso nso a.

Buhari akatọọla ogbugbu ndị mmadụ na Katsina Steeti

Image copyright Getty Images

Onyeisiala Buhari akatọọla ogbugbu ndị ekperima gburu ndị ọrụ ugbo ruru mmadụ iri atọ n'obodo Damkal na Tsanwa dị na Katsina Steeti n'ụbọchị Fraịde.

Onye enyemaka ya na mgbasaozi bụ Garba Shehu sị ka ezinaụlọ ndị a kara obi ma ka e nye ndị ọrụ nchekwa ohere inyocha ma taa ndị kpara mkpa mkpa a ahụhụ.

Asụsụ Igbo agaghị anwụ

Ohanaeze Ndigbo aṅụọla iyi ma kwuo na asụsụ na omenala Igbo agaghị anwụ n'ọdịnihu dịka United Nations si chee.

Onyeisi otu a bụ Nnịa Nwodo kpọkuru nne na nna nakwa ndị nkuzi ka as gbaa mbọ kụnye mkpụrụ asụsụ a n'ime ụmụ ha iji hụ na e chekwara ya.

Na Kamerrun

Otu United Nations sị na e gburu ihe ruru mmadụ iri abụọ na abụọ n'obodo Ntumbo dị na Kameruun n'ụbọchị Fraide.

Ha sị na ọkara n'ime ndị a e gburu bụ ụmụaka ndị a gbara ọkụ na ndụ.

Onwebeghi ndị sị na aka ha dị na mkpa mkpa a mana pati na-anọghị n'ọchịchị na-ata ndị agha ụta.

N'egwuregwu

Image copyright Enyimba FC

Ọgbaghara dapụtara n'asọmpi NPFL dị n'etiti Abia Warriors na ụmụnne ha bụ Enyimba n'ọgbọegwuregwu dị n'Umuahia nke mere e ji kagbuo ya.

E nyela iwu ka agbagharịa asọmpi a n'elekere iri nke ụtụtụ Mọnde n'ọgbọegwuregwu Okigwe dị n'Imo Steeti.

Nkeji

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Isiokwu Ndị Emetụtara