Enyimba na Abia Warriors: Kedụ ihe na-esere ụmụnne abụọ?

Egwuregwu bọọlụ Image copyright Osinachi Nwachukwu/Kennedy Onwunali

A na-ahụta otu egwuregwu bọọlụ Enyimba na Abia Warriors dịka ụmụnne n'ihi na ọ bụ otu gọọmentị Abia Steeti na-akwado.

Mana mgbe ọbụla ha abụọ zutere n'asọmpi NPFL ọ na-adị ka ebe agụ abụọ na-alụ ọgụ, etu o si dị n'ụbọchị Sọnde.

Otu egwu bọọlụ abụọ nọ na-agba bọọlụ n'ọgbọegwuregwu dị n'Umuahia mgbe ndị nkwado ha malitere mawa ibe ha okwute.

Image copyright Osinachi Nwachukwu/Kennedy Onwunali

Nke a butere mmerụ ahụ ọtụtụ ndị mmadụ gụnyere onyeisi ndị Enyimba bụ Felix Anyansi Agwu.

Minista egwuregwu bụ Sunday Dare sị na ya na ndị isi na-ahazi bọọlụ na Naịjirịa ga-ezuko maka ọgbaghara dara n'etiti Enyimba na Abia Warriors n'ụbọchị Sọnde.

Ihe ndị otu Abia Warriors nwere ikwu

Onye na-ekwuchitere ndị otu Abia Warriors bụ Chigozie Nwosu kọwara etu ha sị huta ihe mere.

Nwosu kwuru na ọ bụ ihunanaya ndị nkwado otu abụọ ndị a butere ọgbaaghara ahụ.

O kwuru na dịka asọmpị na-ebido, ndị nkwado Enyimbe a na-akpọ 'Colombians' nọrọ n'akụkụ nke ha ebe ndị nke Abia Warriors a na-akpọ "Ụmụafrịka" nọkwa na akụkụ nke ha.

O kwukwara na ọ bụ mgbe enyere ndị otu Abia Warriors penariti mana onye otu ha bụ Emeka Issac gbafuru ohere ịjị nye goolu.

Mgbe ọ gbafuru bọọlụ ahụ, onye otu nkwado nke ndị Enyimba jị ọṅụ were karama plastic na-akụ onye nkwado Abia Warriors n'isi, na-akwa ya emu maka ohere ha gbafuru.

Onye nke Abia Warriors si ebe ọnọ gbaga ebe ndị otu ya nọ ha were jụọ ya na onye ahụ na-akụ ya ihe n'isi ọ bụ enyi ya, ọ were sị ha mba.

Ndị nke Abia warriors were iwe kụkwara onye 'Colombian' nke mere ka ndị otu ya hụta ihe na-eme wee chee na ọgụ adaala.

Nwosu kwụkwara sị " ọ bụ ndị nke Enyimba bu ụzọ tụo okwute", nke mere ka ndị nke ụmụafrịka tụghachi kwa ya azụ.

Dịka ihea na-eme asọmpị ka na a gakwa na ihu.

Nke a mere ka onyeisi ha bụ Emeka Inyama na nke Enyimba Felix Anyansi Agwu bụ bilie ịrịọ ndị otu ha abụọ ka ha dere juu.

Nwosu kwuru sị "Ọ bụ onye otu enyimba chọrọ ịtụ ndị ụmụafrịka okwute na-amaghị ama were tụọ ya onyeisi ndị Enyimba".

Mgbe ha hụrụ na onyeisioche ndị Enyimba emerụọla ahụ, ndị otu Enyimba jiri iwe bata n'ogige asọmpị nke mere ka akwụsị asọmpị ahụ.

O kwukwara sị " ha mebiri otutu ihe, mwakpo kwa ọtụtụ ụgbọala, nara otu nwaanyị ego ya ,ma banye be otu nwaanyị na-ere ihe mebie ihe ma taa anụ ya na-akwụghị ụgwọ.

Nwosu kwukwara sị " anyị nụkwara na mgbe ndị Aba a na-ala, ha zukwara otutu ndị mmadụ ego".

O kwukwara na onyeisioche ha depụtara akwụkwọ were rịọ ka ndị Enyimba gbahara na ejighị ọgbaaghara mara ndị Abia Warriors.

Nwosu sị na onyeisioche sị na ọ ga-ahụ ndị nkwado ha bụ ụmụafrịka ka ụ dịri ihea hapụ ime ọzọ ma sịkwa na ha nwere ike iwelite ọnụ ọgụgu ndi nchekwa n'ụbọchi asọmpi ọbụla.

Ihe ndị otu Enyimba nwere ikwu

Image copyright @EnyimbaFC
Nkenke aha onyonyo Enyimba FC

Ọnụ na-ekwuchitere ndị otu Enyimba bụ Samuel Zazi Bariza kwuru na ha na-akagbu ọgbaaghara n'ụzo obụla o siri bia na egwu bọọlụ.

Bariza sị; "Anyị agaghị kwa ata onye ọbụla ụta ma ọ bụ si na ọ bụ onye a bidoro ọgba aghara , n'ihi na ihe kacha mkpa bụ ikwusi ọgbaaghara n'asọmpi futubọọlụ".

O kwukwara na ihe gbasara nchekwa ama egwuregwu, " Ọ bụ otu na-achịkọta bọọlụ bụ FA ka ọ dịrị ihụ na ama egwuregwu nwere ọnụ ọgụgụ ndị nchekwa dịka ọ kwesiri".

Ọ kwuru na ọ bụ ihe ọchi na ndị nwe ama egwuregwu na-ekwu na ọ bụ ndị mbiarambia bidoro ọgba aghara, ma ị sị kwa na ọ bụ onye otu anyị merụrụ onyeisioche anyị ahụ bụ ihe ọchị"

Kama dịka ọ sị kwuo, "ọ bụghị maka ịta ụta, ọ bụ maka udo ị di na egwuregwu bọolụ".

Ma sịkwa sị; "Eee anyị nwere ndị nkwadọ a na-akpọ 'Colomboians'.

Akụkọ ndị ga-amasị gị

Isiokwu Ndị Emetụtara