Delta State: Anyị abọpụtala ozu mmadụ itolu ndị ọchịehi gburu - LGA Chairman

Ndị nche obodo bu egbe Image copyright AFP
Nkenke aha onyonyo Ufọdụ ndị obodo dị na mpaghara ebe ndị ọchịehị nọ ebidola ị chekwa onwe ha

Akụkọ na ndị ọchiehi wakporo ndị obodo Uhwerụ nke dị n'okpuru ọchịchị Ughelli ebutela ọtụ kepukepu na nghọtahe.

Nke a na-eme dịka ndị obodo sị na ndị uweojii ekwuputaghị na-ezie mmadụ ole ndị ha si bụ ndị ọchiehi gburu.

BBCIgbo mere nyọcha ka enyọchapụta nke bu eziokwu.

BBCIgbo kpọtụrụ onyeisioche okpuruọchịchi Ughelli Nọt ka ọ jiri ọnụ ya kwuo ihe na-eme na ihe mere.

Onyeisioche ọkpuruọchịchi a bụ Godwin Adobe kwuru sị na ọ bụ ozu mmadụ itolu ka ha chopụtarala.

O kwukwara na otu onye merụrụ ahu ọnodụ ya dị njọ ka ha zịkarala ụlọọgwụ mahadum nke dị na Bịnị, ebe ụfọdụ ndị ọzo gara ịnweta ngwọta ebe ndị ọzọ.

Adobe kwuru na ọmaghị ihe butere mwakpo a wakporo ndị obodo Uhweru.

O kwukwara sị " anyị butere ozu atọ n'ụbọchi sụnde, anyị butekwara ozu isii ọzọ echi gara aga (Mọnde) na ụbọchị frịde ka e buru otu ozu bụlaa ala nna ya dị na obodo Isoko maka olili".

Adobe kwuru na ọ bụ ozu itolu ka ha chọpụtara ma sịkwa na ndị nchekwa na ndị uweojii nọ na obodo Uwheru maka ihe mere.

Ihe ndị uweojii nwere ikwu

Ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii nke Delta steeti bụ Onome Onovwakpoyeya gwara BBC na ọ bụ ozu mmadụ asatọ ka ebutere ha.

Onvowakpoyeya sị na ọ bụ ndị obodo bụpụịtara ozu ndị ahu were bute ya n'ụloọrụ ndị uweojii.

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionOdeakwụkwọ Mgbasaozi Abia State.

O kwukwara na obodo ahụ ederela juu ma sị kwa na enwebeghị onye ha nwụchiri maka mkpamkpa kpara n'obodo Uhweru.

Ọ sị kwa na ha ka na-eme nyocha ịmata ndị kpara mkpa mkpa.

Akụkọ ga-amasi gị