Mark Angel Comedy: 'Ime ihe ọchị anaghị egbochi Emmanuella ịgụ akwụkwọ'

Nwatakịrị nwaanyị aha ya bụ Emmanuella eritela nturuugo dị icheiche maka ime ihe ọchị.

Ihe nkiri ya karịrị akarị n'ọba ihe nkiri 'Youtube' nke mere ka ndị mmadụ na-ajụ ma ọ na-enwezịkwa ohere ịgụ akwụkwọ.

Mana onye nlekọta ya bụ Mark Angel gwara BBC Igbo na ime ihe ọchị anakwaghị egbochi ya ịgụ akwụkwọ.

Mark Angel kọwakwara ebumnuche ya gbasara Emmanuella na Success n'ọdịnihu.

Kirie mkparịtaụka ha na BBC Igbo nwere.

Onye mepụtara ihe nkiri a bụ Nnamdị Agbanelo.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: