Ihedioha vs Uzodinma: E yigharịala ụbọchị nlebanya n'ikpe Ihedioha and Uzodinma

Ihedioha Image copyright Facebook/Ihedioha

Ụlọikpe kachasị agbatịala ụbọchị ha ga-elebanye n'ikpe ha kpere n'isi Emeka Ihedioha na Hope Uzodinma gawa 2 Maachị, 2020.

Ndị ọkaikpe mmadụ asaa nke ọkaikpe Tanko Mohammed nọ n'isi tụlere mkpesa Ihedioha ma yigharịa ụbọchị ha ga-etinye ọnụ ya.

Ọnụ na-ekwuru Emeka Ihedioha bụ Adaora Onyechere gwara BBC Igbo n'ekwentị na nke a bụ eziokwu.

Emeka Ihedioha bụ onye a na-apụrụ ọkwa na ndị ọkaiwu ya mere mkpesa ka ụlọikpe nyochaa ikpe ahụ nkeọma.

Nke a mere ụlọikpe ji nọrọ n'ụbọchị Tọzde iri na atọ nke ọnwa Febụwarị nabata ilebanya n'ikpe a ha kpere.

Image copyright Darlington Ibekwe

Ụfọdụ otu na-akwado Hope Uzodimma bụ gọvanọ Imo steeti ugbua emeela ngagharị igosi nkwado ha n'ọchịchị ya.

Ha bụcha ọkọlọtọ ndị APC wee mee ya bụ ngagharị.

Cheta na ndị uweojii Imo steeti machiri ime ngagharịwe na steeti ahụ ụnyahụ.

Ọ bụ n'ụbọchị iri na anọ nke ọnwa Jenụwarị ka ha chabiri ikpe ahụ chụpụrụ Ihedioha ma tinye Hope Uzodinma.

Kamgbe ahụ, ndị pati PDP na ndị ọtụtụ ndị Imo steeti na-eme ngagharịiwe n'Imo, Abuja nakwa ebe ndị ọzọ sị ka e kpegharịa ikpe ahụ.

Mana ndị uweojii Imo Steeti nọọrọ ụnyaahụ machie ime ngagharịiwe na Steeti ahụ.

Ha sị na ụfọdụ ndị omekome chọrọ iji ohere ahụ mee mpụ dị iche iche n'Imo Steeti.

Slow Dog asaala ndị DJ Enugwu

Image copyright Instagram/Iamslowdog

Otiegwu a ma dịka Slow Dog asaala mmachi otu ndị na-akpọ egwu a kpọrọ DJ machiri ya n'Enugwu steeti.

Slow Dogg gwara BBC Igbo na ọ bụghị ya na ndị DJ niile nwere okwu, kama na ọ bụ akpọ nke onyeisi ha bụ DJ Grandfingaz na-ebusa ya wetere nsogbu mmachi a.

Mara na ndị DJ Enugu steeti gbakọtara kwuputa na ha agaghị akpọzị egwu ya n'ọha nakwa na redio.

Innoson na ndị omeiwu Naịjirịa:

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Innocent Chukwuma

Innocent Chukwuma asaala ndị Naịjirịa sị na ha anaghị amanye ndị mmadụ ịzụ ụgbọala ha n'agbanyeghi na ha na-arụrụ ya ndị be anyị.

Nke a na-abịa dịka ndị ụlọomeiwu jụrụ ụgbọala nke e mere na Naịjirịa, sị na ọ bụ nke e mere na mba ofesi masịrị ha.

Gụọ maka okwu a n'uju ebe a: Anyị anaghị amanye ndị mmadụ ka ha zụọ ụgbọala anyị - Innocent Chukwuma

N'ofesi,

Image copyright Getty Images

Ụlọikpe dị na mba Denmark ga-ekpebi ikpe otu nwaanyị a kpọrọ Britta Nielsen bụ onye a na-ebo ebubo maka izu ego gọọmentị ruru nde dọla iri na asaa n'ime ihe ruru afọ iri abụọ na ise.

Ọ rụrụ ọrụ dịka onye na-enyere ndị ụwa na-atụ n'ọnụ aka, tupu e jide ya n'afọ 2018 ka ọ na-ezukpu ego n'ọbaego nke ya.

Nsogbu Tottenham nwere

Image copyright PA
Nkenke aha onyonyo Son Heung-Min adịghị achi ma ncha

Jose Mourinho na-achịkọta Tottenham na-atụ ụjọ na Son Heung-Min agaghị esozi ha gbazuo bọọlụ n'afọ a.

A ga-awa Son gbajiri aka n'ụbọchị ụka ahụ, ma chere mgbe ọ ga-agbake.

Kenya nwuchiri ndị ji akpa wakịrị ere ihe n'okporoụzọ

Ọtụtụ ndị mba Kenya ewela iwe maka nwuchi gọomenti ha nwụchiri ndị ji akpa wakịrị wakịrị ere ihe n'okporoụzọ.

Mmadụ atọ ka a kpọpụrụ n'ụlọikpe taa n'iwu sị na ha ga-akwụ nde shịlịn anọ maọbụ gaa mkpọrọ.

Ndị nkuzi Mahadum Gana na-emetọ ụmụakwụkwọ

Mahadum Gana akwụsịtụla ndị nkuzi abụọ ọrụ maka ihe onyonyo BBC Africa Eye gosiri ka ha na-emetọ ụmụakwụkwọ.

A gaghị akwụ ha ụgwọ ruo oge niile ha ga-anọ n'ọnọdụ a.

Nkeji

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionBBC Nkeji

Ụlọikpe amachiela Inec iwepụ aha pati

Image copyright Inec/Twitter

Ụlọikpe ukwu dị n'Abuja nke ọkaikpe Anwuli Chikere nọ n'isi ya amachiela ụlọọrụ Inec iwepu aha pati ọbụla site n'isonye na ntuliaka.

Ụlọọrụ Inec nọrọ n'ụbọchị isii nke ọnwa Febụwarị wepu aha pati iri asaa na anọ ka ha ghara isonye na ntuliaka.

N'ofesi

Image copyright Getty Images

Ụlọọrụ na-arụ ekwenti Iphone bụ Apple ekwuola na ọrịa coronavirus na-arị elu na mba Chaịna emetụtala ego mbute ha.

Ha kwukwara na ọnọdụ a ga-akpachịtụ etu ha si ekesasị ekwentị Iphone na mbaụwa.

N'egwuregwu

Image copyright Getty Images

Ịnụla etu Manchester United sị rie Chelsea ka ọkpa dị site n'inye ha ọkpụ goolu abụọ asataghị otu n'asọmpi Premier League.

Chelsea nyere goolu abụọ n'asọmpi a mana ihe onyonyo na-enyere ogbu opii aka a kpọrọ Video Assistant Referee gụpụrụ ha.

Nkeji

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionBBC Nkeji

Ihe nkiri

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media caption'Ime ihe ọchị anakwaghị Emmanuella ịgụ akwụkwọ'