Coronavirus outbreak: 'Obodo Wuhan dị ka ịkpa a na-eli mmadụ' - Nwata akwụkwọ Naịjirịa

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionOkwu nwata akwụkwọ Naịjirịa nọ Wuhan dị na Chaịna kwuru maka ọnọdụ ha

Chukwuma Nzube bụ onye na-agụ akwụkwọ na Wuhan, na mba China akọwala etu ndụ siri dịrị ha na obodo Wuhan bụ ebe ịba Corona sị bido na Disemba 2019.

Nkenke aha onyonyo Nwa akwụkwọ Naijirịa nọ Wuhan

Nzube kwuru na ndị Naijirịa bi Wuhan ruru iri asaa na otu ma ọtụtụ n'ime ha bụ ndị na-agụ akwụkwọ n'obodo a.

O kwukwara na obodo Wuhan nwere ihe dịka mmadụ nde iri na otu bị na ya mana ị pụta n'ezi, ị gaghị ahụ otu onye.

Ọ sịkwa na ọ bụ naanị ndị nwere akwụkwọ ikikere ọkachasị ndị ọrụ gọọmentị nwereike ịgagharị.

Onye ntaakụkọ BBC Igbo jụrụ ya sị, 'ked etu ụnụ si ebi kamgbe mmachịrị ngagharị?'

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo A na-eme nyocha na Chaịna ka amata onye bụ ọrịa Ịba Corona

Nzube sị na o bi n'ụlọ ụmụakwụkwọ ma sịkwa na kamgbe izuụka atọ, ọ pụbeghị ezi.

Ọ sị na dịka ọ dị ugbua, ha ayọgidela ndị gọmenti Naịjirịa maka enyemaka na obi ha adaala mba n'ihi na o nweghị ihe ha nwereike imezi ọzọ.

O kwukwara na ọtụtụ mmadụ apụọla n'ebe obibi ha ma sịkwa na mmadụ ole na ole fọrọ na atụ ụjọ izute onwe ha maka ibute ọrịa Corona.

Ụjọ na-atụkwa ha nke mere na ụkwara kwaa ha ma ọ bụ ahụ ọkụ mee ha obi amapụ ha ma ha ebutela ya bụ ọrịa.

nụ a na-eri kwa nrị?

Nkenke aha onyonyo Njirimara ọrịa Corona Virus

O kwuru sị "ndị gọomentị Chaịna na-enye anyị nri ugboro atọ n'ụbọchị na ihe ndị ọzo anyị na-eji ebi ndụ"

Nzubechukwu kwuru sị "Ana m arịdata ogogo iri na abụọ ma rigoo kwa tupu m rie nri n'ihi na achọghị m iji igwe nritu gbada ala maka ụjọ ibute ọrịa".

O kwuru na onye chọro ịzụ ihe ga-azụta ya n'intanetị mana ọ na-adazị oke ọnụ.

Ked ihe gọọmentị ndị Naijirịa merela unu?

Nzubechukwu kwuru sị "mgbe m nọ Naijirịa, ana m anụ na gọọmentị anaghị elekọta ndị Naijirịa nọ na mba ofesi mana ejirila m anya m hụ na ọ bụ eziokwu".

O kwukwara "Ọ bụ naani na Naijirịa ka ndị ọmeiwu ga-eji ihe dịka corona ama njakịrị, na ndị sị obodo ọzọ dịka Ghana, ndị gọmenti ha na-akpọ ha ma na-ezitere ha ihe".

Ọ mere ka BBC Igbo ghọta na kamgbe a machiri ha ịgagharị, gọọmentị Naijirịa ezitebeghị ndị Naijirịa nọ na Wuhan ozi ọbụla.

O kwukwara na ọ bụ nani onye nnọchite anya naijirịa bụ Baba Ahmad Jidda sitere n'akpa nke ya nye ha otu nde naira.

Ma ọ sị kwa na kamgbe ọ nyechara ha ya bụ ego, na ha anụbeghi umere ya ọzọ.

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionOlu onye Naịjirịa nọ na China na-ekwu maka ihe ha na-agabiga n'ihi Coronavirus

O kwuru sị "Minista na-ahụ maka ahuike siri ezigbote asị mgbe ọ sị na e nweghị onye Naijirịa nọ Chaịna chọrọ ịlọta".

Kedkwanụ etu ịsị echekwa uche maka isi mgbaka?

Nzube sị kwa na ọ na-emegharị ahụ nke ndị Bekee na-akpọ 'Exercise'.

Ọ sị kwa na o bidoro ịgụ akwụkwọ asambodo ọzọ n'intanetị iji chekwa onwe ya maka isi nkoropu.

Ihe nlekọta Naijirịa nọ n'ofesi kwuru

Onye na-ekwuchitere Odoziakụ Dabiri-Erewa nke bụ onyeisi ndị na-elekọta nhazi ndị Naijịrịa bi n'ofesi bụ Abdurahman Balogun sị na ha enyela ndị otu ụmụ ụlọakwụkwọ bi na Chaina ekwenti ha ga-akpọ n'inwete ozi aka ndị gọọmenti.

Mana Abike Dabiri bụ onye na-elekọta ndị Naịjrịa nọ n'ofesi dere n'akara Twitter ya sị:

Akụkọ ga-amasị gị

Isiokwu Ndị Emetụtara

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a