Coronavirus and Lassa Fever: Ihe ị ga-eme ma etinye gị na 'quarantine' n'ihi ọrịa ndị a

Corona Virus Image copyright Getty Images

Kamgbe ọrịa coronavirus tịpụtara isi, o dosala ọtụtụ ndị mmadụ n'ọnọdụ nyocha ebe ha na ndị ọzọ anaghị enwe mmekọ.

Ụfọdụ n'ime ndị a bụ ndị buterela ọrịa a ebe ndị ọzọ ka na-enyocha ma ọrịa a onwereike igosipụta n'ahụ ha.

Ọ na-adịkarị ndị nọ n'ọnọdụa ka ụwa ọgwụla dịka nwata akwụkwọ Naịjirịa bi na Wuhan Chaịna ebe coronavirus malitere si kọọrọ BBC Igbo.

Nwa akwụkwọ a bụ onye hụtara onwe ya n'ọnọdụ a kpọrọ 'House quarrantine' sị na ọ na-emetuta ya n'ụbụrụisi.

Kedụ ihe bụ ụzọ mgbapụta n'ọnọdụ a?

Otu onye dọkịta bụ Mcginger Ibeneme gwara BBC Igbo ụfọdụ ihe ndị hụrụ onwe ha n'ọnọdụ a ga-eme.

Ihe ha ga-eme gụnyere:

Dọkịta Ibeneme sị na onye dị etu a kwesịrị i na-emega ahụ kwa ụbọchị o tetere n'ụra ka ahụ ya na-esi ike.

Ọ gara n'ihu kwuo na onye ahụ ga-agba mbọ na-ezu ike nkeọma.

Onye ahụ ga na-eme ihe dịka ikiri TV, ịgụ akwụkwọ, ị pịị ekwentị ya bụ ihe ndị ga-akpọpụ uche ya n'ọrịa a.

Nke kachasị nke bụ na onye ahụ ga-enwe echichie ọma mara na ọnọdụ ọ nọ n'ime ya bụ nwa mgbe nta ka ọ ga-ebi.

Onye a gaa na-ege ntị n'akụkọ ka ọ mara etu ihe si a aga, ọ ga na-ekpe ekpere nakwa ime onwe ya obiụtọ.

Dọkịta Ibenema gara n'ihu kwuo ka onye dị etu a ghara ịhụta onwe ya dịka onye agbahapụrụ.

Kama ka ọ mara na ọ bụ maka ọ dị mma nke ya nakwa nke mba niile butere e ji tinye ya n'ọnọdụ ahụ.

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionOkwu nwata akwụkwọ Naịjirịa nọ Wuhan dị na Chaịna kwuru maka ọnọdụ ha

Akụkọ ga-amasị gị

'Obodo Wuhan dị ka ịkpa a na-eli mmadụ' - Nwata akwụkwọ Naịjirịa

Gọọmentị Anambra agbapeela Ahịa 'Electronics' Nnewi

BBC Igbo agbaala afọ abụo... Ụnụ aṅụla ngwọ na nkwụ na-abịa