Pete Edochie: Ịga 'honeymoon' na ihe ndị ọzọ a mụtara n'aka ndị ọcha

Di na nwunye gbara akwụkwọ n'ụlọụka

Ọlụlụ di na nwunye bụ ihe dị oke mkpa na ndụ ndị mmadụ n'agbanyeghi agbụrụ ndị ahụ si.

Mana agbụrụ ọbụla nwere usoro dị iche iche ha ji eme emume ọlụlụ di na nwunye nke ha.

Igbo nwere omenala pụrụiche n'ihe banyere ọlụlụ di na nwunye mana ọ dịka a ga-asị na ha akụrụla ụfọdụ omenala ndị ọcha.

Ngwa ka anyị tụlee ụfọdụ omenala ndị ọcha a nke ndị Igbo ṅomiri.

Isekpuru ala arịọ nwaanyị ọlụlụ

Nke a bụ omenala ọgbara ọhụrụ na-arị ibe ya elu ugbua n'ọlụlụ di na nwunye bụ nke na-adịghị n'ala Igbo n'oge mbụ.

O so na omenala ndị e ṅomiri n'aka ndị ọcha nke ọtụtụ ndị ọdịnala Igbo dịka Pete Edochie katọrọla ọtụtụ oge.

Pete Edochie hụtara ya dịka nwoke ị gbara nwaanyị ohu. Ọ sị na omenala Igbo anabataghị nwoke isekpuru ala arịọ nwaanyị ọlụlụ.

Mana e nwere ọtụtụ mmadụ karịsịa ụmụnwaanyị sị na nwoke isepkuru ala arịọ nwaanyị ọlụlụ gosiri ụdị ịhụnanya o nwere n'ebe nwoke ahụ nọ.

Ịgbanye ọla aka

Image copyright Getty Images

Itinye ọla n'aka dịka a na-ahụta ugbua abụghị njirimara ndị Igbo n'ihe banyere alụm di na nwunye.

O sokwa n'otu ihe ndị a mụtara n'aka ndị ọcha bụ nke a ga-asị zuru Igbo ọnụ ugbua.

N'agbanyeghi na o nwere ụfọdụ ihe Igbo ji egosipụta nwoke maọbụ nwaanyị lụrụla nwunye maọbụ di mana ọ bụghị ịgbanye ọla aka.

Ụfọdụ ihe ndị a gụnyere nwaanyị ịma ukwu akwa abụọ, ịgbanye ọla olu nakwa ụfọdụ akara dị iche iche.

Ịgba akwụkwọ n'ụlọụka nakwa n'ụlọikpe

Image copyright Idika Franklin

Ndị a bụ omenala alụm di na nwunye e ji mara ndị ọcha nke ọtụtụ ndị mmadụ na-agbakwunye n'omenala ha bụ.

Omenala nke e ji mara ndị Igbo bụ ịgbankwụ a kpọrọ 'Traditional Marriage' nke gụnyere ịkwụ ụgbọ isi nwaanyị na ihe ndị ọzọ so ya.

Ọ bụrụ na a gbaghị nkwụ nwaanyị nke ahụ pụtara na a lụghị nwaanyị ahụ alụ.

Mana ụfọdụ ndị ụka Kraịst na-etinyere nke ha ịgba akwụkwọ n'ụlọụka ebe ụfọdụ na-agba akwụkwọ n'ụlọikpe.

Emume 'Bachelor's Eve'

Nke a bụ emume a na-eme iji nye nwoke okokporo ohere ka o mee ihe ndị ahụ nwunye ya nwereike agaghị anabata ma ọ lụọ ya.

Ọ bụ ohere nwoke a na ndị enyi ya nwoke ga-anọkọ ọnụ, rie oriri, ṅụọ mmanya, tee egwu nakwa ihe ndị ọzọ.

Nke a esoghi n'omenala Igbo n'ọlụlụ di na nwunye mana ọtụtụ ndị na-emezi ya ugbua.

Mana e nwere ndị sị na ọ bụ ụzọ ọzọ e ji atụfu ego n'ọlụlụ di na nwunye.

Ezumike 'Honeymoon'

Nke a bụ ezumike di na nwunye lụrụ ọhụrụ na-enye onwe ngwa ngwa ha lụchara.

Ụfọdụ di na nwunye na-aga ebe dịka ụlọ ndina, ụlọ oriri na nkwari ogogo ha dị elu gụnyere ndị nọ n'ofesi n'oge ezumike a.

A bịa n'omenala ọlụlụ di na nwunye n'ala Igbo, onweghi ihe dịka ezumike n'ụdị a akpọrọ 'honeymoon' mana ugbua a na-emezi ya.

N'oge mbụ, ọ bụrụ na di na nwunye gbacha nkwụ taa, echi ha abụọ nwereike itinye isi n'ọrụ ugbo bụ ọrụ dị n'oge ahụ.

N'agbanyeghi etu omenala ọgbara ọhụrụ ndị a ji arị elu n'ala Igbo, e nwere ndị ka ji omenala Igbo hiwe isi.

Ndị a ka na-agbaso omenala e ji mara ndị Igbo n'okwu banyere ọlụlụ di na nwunye, na-etinyeghi ya nnu maọbụ ose.

Ihe nkiri ga-amasị gị:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionMarriage: Ị ga-agwa di maọbụ nwunye gị ego ole ị na-akpata?