Diet and Nutrition: Ihe ndị a ị na-etinye n'ọnụ nwereike igbu gị

Ndị na-eri nri Image copyright Getty Images

Nnyocha egosila na nri anyị na-eri nwereike ibute ọnwụ erughi eru ihe ruru mmadụ nde iri na otu (11) kwa afọ.

Ị ma na ụfọdụ oge nri ị na-etinye n'ọnụ nwereike ịkpa mkpamkpa n'ahụ gị karịa ịfụ anwụrụ nakwa ịṅụ oke mmanya ọkụ?

Ihe ndị a na-etinye na nri dịka nnu, ụfọdụ mmanụ nakwa ihe ndị ọzọ adịchaghị mma n'ahụ dịka ndị nnyocha si chọpụta, nke bụ na iri ya ebe ọ dị nnukwu nwereike itinye gị na nsogbu.

Ngalaba Global Burden of Disease Study bụ ndị ọkachamara n'ihe gbasara etu ndị mmadụ si anwụ na mpaghara ụwa, kwuputara ụdịrị nri na-egbu ndị mmadụ na mmadụ ole ọ na-egbu.

Dịka ha si kwuo n'afọ 2019, mmadụ nde atọ nwụrụ site n'iri oke nnu, nde atọ ọzọ nwụkwara site n'iri obere nri akụkụ-ubi nke Bekee na-ackpọ "grain", ebe nde abụọ nwụrụ site na-erighi mkpụrụosisi maọbụ iri ya ebe ọ dị obere.

Ihe ndị ọzọ na-egbukwa mmadụ gụnyere: erighi nnukwu mkpụrụ akị dị iche iche, erighi akwụkwọ nri, ihe si n'oke osimiri na-enye nke a kpọrọ Omega-3 nakwa faịba, nakwa ịṅụ mmanya ndị bụ ọtọ bịrị bịrị a gbara na karama.

Kedụ etu o si egbu mmadụ?

Oke nnu na-ebute nsogbu gụnyere iwelite kọlesterọl, ọbara mgbalielu nke nwereike ibute ọrịa mkpọnwụ ahụ nakwa ọrịa obi (obi nkoropu).

O nwekwara ike ikochi obi nakwa okporo ebe ọbara si agafe, nke nwereike ime ka obi mmadụ daa mba.

Ụfọdụ nri na-emekwa ka ndị mmadụ nwee ọrịa akpụ nakwa ọrịa shuga.

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo A na-ejikarị nnu eghe azụ na ndukwu

Kedụ ihe i nwereike iri?

Mkpụrụosisi na akwụkwọ nri na nri akụkụ-ubi na-egbochi ọrịa obi maọbụ na-eme ka o nwee naanị obere ohere inye mmadụ nsogbu.

Ihe ndị ọzọ gụnyere mmiri ara ehi, ịṅụ mmiri ọtụtụ oge ka o nwee ike na-asachapụta akụrụ ahụ gị nke Bekee kpọrọ "kidney", nakwa ịta ihe mkpụrụ dịka kashu, almọndụ, pịstachio nakwa ndị ọzọ.

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Mkpụrụ kashu

Iri ihe ndị nwere oke faịba dịka ụfọdụ mkpụrụosisi dịka apụlụ, agwa, karọt, nakwa nke Bekee kpọrọ oat, na-akwụsị oke ịchị nsị nke Bekee kpọrọ "constipation" ma mee ka ahụ mmadụ dị mma.

Faịba na-eme ka afọ ju mmadụ, nke ga-eme ka ị ghara iri oke nri ga-eme ka ị dọrọ ka ọdọkọ.

Ndị ọkachamara na-adụ ọdụ iwetu aka n'iri ihe e ghere eghe, iwetu aka na nnu, nakwa iwetu aka na shuga.

Ihe ndị a ga-eme ka ị dị ndụ, ghara ibu oke ibu, ka ị hapụ inwe ọbara mgbalielu nakwa ihe ndị ọzọ.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Ihe nkiri a ga-amasị gị:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionIgbo delicacies: Ị hụtụla ụgba pụrụiche ndị na-asọ anụ?

Isiokwu Ndị Emetụtara