Nigerian Foods: Onye afọ nri! Lekwa ihe mere ụtọ agwa ji aba n'ụmị

Akara, agwa agwọrọ agwọ na Mọịmọị Image copyright Matsecooks

Onye ọbụla nrị na-amasị ma na agwa bụ asa na nrị. Eziokwu agwa bụrụ nwaanyị ọ ga-abụ asa dị egwu. Otụtụ nrị eji agwa esi nke mere na ị jụọ mụ, m ga-asị gi na agwa bụ oyoyo na nrị.

Ndị afọ nrị nille ma na agwa na-edozi ahụ ma na enyere aka n'ihe gbasara ahụisiike.

O nweghị etu ọbụla ị ga-esi sie agwa ka ọ hapụ ịtọwa ntị.

Ị ma na e nwereike ighe agwa eghe, ma ọ bụ kwọchaa ya ka ọ bụrụ flawa e jizi eme ihe dị iche iche.

Ngwa weta oche, nọrọ ọdụ ka-anyị zọpụ njem ka ị mara ihe agwa ji bụrụ sawam maka nri oriri.

Gịnị ka agwa na-enye n'ahụ?

Image copyright FoodAce
Nkenke aha onyonyo Lekwa etu agwa na anụ ọkụkụ siri dịka dị na nwunye

Onye ọbụla na-eri agwa nke ọma na-agbatị ndụ ya. Nkea bụ maka na ihe agwa nwere ọtụtụ ihe dị n'ime ya na-edozi ahụ.

Ụfọdụ n'ime ihe ndịa na-edozi ahụ gunyere Kalori, purotin, abụba, Kọpa, zịnkị, potashium, Vịtamin B6 na ọtụtụ ihe ndị ọzo na-edozi ahụ.

Mana n'ụzọ ọga-adị mfe, lekwa etu agwa si edozi ahụ

Agwa na-enyere aka maka ọnye chọrọ ịta ahụ. Nkea bụ maka na onweghị oke abụba nke na-ebute ibu.

Nke abụọ bụ na agwa na-enyere aka maka mgbarị nrị maka na o nwere fịba.

Ọzọ bụkwa na ọ na-edozi obi maka na ọnweghị oke abụba nke mere na onye na-erikarị ya anaghị arịa ọrịa obi.

Lee ụzọ dị iche iche e si esi agwa

Agwa agwọrọ agwọ

Image copyright Matsecooks

Agwa bụ nrị na-amasị ndị Igbo.Ụzọ esi eri agwa ndị mmadụ kachamara bụ agwa agwọrọ agwọ.

Enwere ike ịji ọtụtụ ihe ndị ọzọ rie agwa mana ọtụtụ n'ime nri ndịa na-ebido n'agwa agwọrọ agwọ.

Image copyright Matsecooks
Nkenke aha onyonyo Ufọdụ na-akpo agwa na achịcha bụ kwa ezigbo enyi

Ihe eji esi agwa agwọrọ agwọ

Image copyright Matsecooks
Nkenke aha onyonyo Negodi agwa agwọrọ agwọ nwere 'Visa'
  • Iko beans anọ
  • Ọkara mmanụ nri
  • tomantọ anọ
  • ose
  • yabasị
  • ịsha
  • na nnu.

Etu e si esi ya

  1. Saa agwa tinye ya na ite ị tinyere iko mmiri anọ
  2. Sie ya ihe dịka nkeji iri anọ
  3. Dịka agwa na-asụ, gwọọ ịsha, ayo na ose gị
  4. Mgbe agwụ derela, tinye ịsha,ayo, ose na mmanụ
  5. Tinye nnụ etụ ị si chọọ ma hapụ ya ka ọ sụkota ọnụ n'ime nkeji iri.
  6. Gbanyụọ ọkụ ma chere nkeji ise tupu ị kuputa ya.

Akara

Image copyright Mastecooks
Nkenke aha onyonyo Akara, achịcha na akamụ na-aga serere

A si na nwata na-ata akara na-ata ego ya. Echetara m mgbe mmadu bụ nwata ọ na-abụkari ụtụtụ ụbọchị sunde ka a na-enye anyị akara.

Akara na-akacha atọ ụtọ mgbe ọ di ọkụ ọkachasị mgbe ị ji achịcha ata ya nke ụfodụ ndị na-akpọ 'Burger' ndị be anyị .

Image copyright Matsecooks
Nkenke aha onyonyo Biko arachakwala ekwentị gị

Ufodu na eji kwa akamụ ma ọ bụ garị erị akara.

Mana kedu etu e si esi akara?

  1. Nke mbụ bụ na ị ga-etinye agwa gị na mmiri n'ihe dịka nkeji iri atọ ka mmiri banye n'ime ya
  2. I ga-ewepụ azụ agwa dịka ị na asa ya mmiri.
  3. Mgbe ị mechara, ị tụgharịa ya nke ọma ka ọ rọo arọ.
  4. Tinye zia ose na ayo, nnụ na ihe eji enye nri ụtọ
  5. Mana echefu kwana ịsịnye mmanụ gị n'ọkụ.
  6. Were ngaji kunye agwa ị kwọro akwọ n'ime mmanụ ọku a
  7. Tugharịa ya n'obere oge ka ọ yee nke ọma.

Maị Maị

Image copyright Foodace

Hewu! Nke a na-atọba n'ụmị.

Maị maị bụ nri mmadụ nwere ike iri mgbe ọbụla nakwa ebe ọbụla.

Ị nwere ike iji ihe gunyere akwụkwọ nri, komkom igwe, komkom mmiri ara ehi, 'Foil' were kechie ya.

Ụfọdụ ndị dọkịta ahụike na-ekwu na akpa wakịrị wakịrị nke a na-akpọ 'Santana' adịghị mma iji kechie ya.

Ị chọrọzia ka Maị maị gị bụru oyoyo, i nwereike itinye ya azu ma ọ bụ akwa e siri esi.

Image copyright FoodAce
Nkenke aha onyonyo Moimoi na akwa esiri esi bụ erichaa amịchaa aka

Akamụ na garị na moimoi gbara ndụ, maka ị were ha rie moimoi ịghọta na ụtọ azu dị n'isi ya.

Ụfọdụ na-eji kwa achịcha eri moimoi mana otu ọbụla, moimoi na-atọ ụtọ pụru iche.

Etu e si esi Mọịmọị

  1. Tinye agwa n'ime mmiri hapụ ya otu awa
  2. saa ya ma wepụ azụ agwa
  3. kwọọ ya ma tinye ya mmiri ka ọ gbatụ obere mmiri
  4. tinye mmanu, ose, nnu, yabasị na ogiri bekee.
Image copyright Mastecooks
Nkenke aha onyonyo Mọịmọị na Kụstadị,Akamụ, achịcha ma ọ bụ oot na-agakọ nke ọma
  1. tee mmanụ n'ahụ komkom ị chọro iji sie ya
  2. wụnye agwa a akwọrọ akwọ na komkom ndịa.
  3. ị nwere ike itinye azụ ma ọ bụ akwa esiri esi na ya bu moimoi.
  4. Tupu ị sinye ya n'ọkụ, tinye osisi ma ọ bụ akwụkwọ nri n'ala ite maka ire ọkụ
  5. tinye mọịmoi na ite ma sikwasa ite n'ọkụ
  6. ọ na-ewekarị ihe dịka nkeji iri atọ ruo otu awa tupu o ghee

Agwa asụr asụ

Image copyright Matsecooks
Nkenke aha onyonyo Ọ bụ stu ya mere ka agwa a pụọ iche

Agwa asụrụ asu kacha baa ụba na mpaghara owụwa anyanwụ Naijirịa.

Ọ na-abụ a sụ chaa agwa esiri esi ewere stụ a na akpo 'Ewa Agoyin' were rie ya.

Akụkọ ndị ga-amasị gị

Ihe nkiri a ga-amasị gị:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionIhe ị ga-eme ka ị wee gbochie nri agbarighị agbari n'ahụ gị

Isiokwu Ndị Emetụtara