Tyson Fury vs Deontay Wilder III: Fury akụọla Wilder ihe a na-akụ onye zuru ohi n'Otu Nkwọ Ọnịcha

Fury na Wilder

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto,

Tyson Fury kụpụrụ Deontay Wilder mkpụrụ agịrị n'anya

Ọ bụrụ na Deontay Wilder pụta ụwa ọzọ, ọ gaghị echere Tyson Fury aka mgba ọzọ n'ihi ụdị ihe Fury kụrụ ya taa.

Mana nke bụ eziokwu bụ na Wilder gbalịrị ike ya, mana nwoke na ibe ya ha bụ n'ọnụ.

Lee etu ọkpọ ahụ siri gaa n'isi ụtụtụ ụbọchị Sọnde, abalị iri nke ọnwa Ọkụtoba afọ 2021

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto,

N'agba nke iri na otu ka onye ogbu opi kwụsịrị ya bụ ọgụ ma nye Tyson Fury mmeri.

N'agbanyeghị na Tyson Fury meriri ọgụ a, anya ya hụkwara ndị mmụọ n'ihi na Wilder abụghị ofe nkupu.

Oge ọgụ a ruru agba nke atọ, Fury kuturu Wilder n'ala, o bilie. N'agba nke anọ Wilder akụtuo Fury n'ala, o bilikwaa.

N'eziokwu, ugboro abụọ ka Wilder kụrụ Fury ọkpọ ọ sụọ ike n'ala, mana Fury bilichara.

Oge ọkpọ ahụ banyewere agba nke asatọ, ka ike malitere ịgwụ Wilder, mana ọ gbalịrị n'aga n'ihu.

N'agba nke iri, Fury kụnyekwara Wilder ajụ n'anya, ọ sọọ ganagana sụọ ike n'ala, mechaa bilikwaa.

Mana oge Fury chọziri iji ọkpọ kụkpọọ Wilder anya, n'agba nke iri na otu, Wilder ji afọ ruo ala, nke mere ka onye ogbu opi kpebie na ọgụ ahụ ebiela.

Ugbua, ihe fọziiri Fury bụ ichebiri Anthony Joshua maọbụ Oleksandr Usyk iji bụrụ ọkaibe n'ezie n'asọmpi ọkpọ n'ụwa.

Wilder vs Fury II: Tyson Fury akụpụla Deontay Wilder kpakpando n'anya

Ebe foto si, Getty Images

Tyson Fury abụrụla Eze dịka o meriri Deontay Wilder n'ọkpọ asọmpị WBC.

Ọ bụ n'agba nke asaa ka ndị otu Deontay Wilder weliri aka elu tupu asọmpi a abụru akwamozu.

Tyson Fury enyeghị Deontay Wilder efe imeharị ahụ.

Gịnị ka mmeri a pụtara?

I chetara na ọ bụ n'afọ 2015 ka Fury metụrụ mmerị dị etu a aka.

Akukọ kwuru mgbe ahụ na ihe kpatara Deontay ji anyụ ya anya kamgbe afọ ise ndị a bụ maka ahụ ibu ya nakwa ihe ndị ọzọ.

Mana ọ dịka Fury riri amosu eji atahụ were pụtazịa n'afọ 2020 wee mewa Deontay obi site n'ikụfụ kpakpando n'anya n'agba ugboro ugboro nke asọmpị a.

Nke a mere ka ndị ọnụ na-eru n'okwu kwuo na ọ bụ okwu ka Fury ji mmeri a kwuo.

Ihe na-ekwu n'elu soshal midia

Nke mbụ sị n'akara twitter nna ukwu @LennoxLewis kelere Fury ma gwa Wilder ka ọ mụrụ akọ site na mmeri a.

@nielo_2wit kwuru na ọ bụ etu a ka ụwa dị.

Mana @RyanCFowler nwere ozioma pụrụiche nye Deontay Wilder.

@luckiest2020 weputara ozi Wilder na Fury zigara onwe ha ma kwuo na ọ dịghị mma ka mmadụ kparịa Chukwu.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: