Anambra state: Ndị uweojii Anambara anwụchiela nwoke a na-ebo ebubo idina ụmụaka isii

Foto Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Foto a abụghị nke nwoke ahụ e boro ebubo a

Aka ndị uweojii akparala otu nwoke na-edina ụmụaka ụmụnwoke isii na-erughi eru n'ike n'Anambara steeti.

Nwoke ahụ sị na aha ya bụ Bassey, kwuru sị na ọ chọrọ ọgwụgwọ nsọ n'ihi na ọ na-eche na ọ bụ mmụọ ọjọo na-enye ya nsogbu.

A kpụpụla onyeisi ụlọomeiwu nta ụlọikpe

Image copyright Facebook/Femi Gbajabiamila

Otu na-ahụ maka ikike dịrị onye bụ Socio-Economic Rights and Accountability Project nke a ma dịka (SERAP) n'ịchafụ na ndị Naịjirịa ruru otu narị na iri itoolu na abụọ ejikọọla aka ọnụ gbaa Femi Gbajabiamila bụ onyeisi ụlọomeiwu nta akwụkwọ n'ụlọikpe.

Iwe ha bụ ka ụlọikpe kwụsị atụmatụ ndị omeiwu iji ijeri naịra ise na ọma zụọ ụgbọala ọhụrụ ruru narị anọ ha chọrọ inye ndị ụlọomeiwu.

Ọrịa Coronavirus Covid-19

Image copyright AFP
Nkenke aha onyonyo Obodo Daegu na mba Saụt Koriya ka ọnụọgụgụ ndị bu ọrịa a na mba ahụ kacha arị

N'ofesi, Mba Saụt Koriya etisiela mkpu ike na ọnụọgụgụ ndị bu ọrịa coronavirus covid-19 na mba ha ka na-arị dịka o gburula mmadụ ise ebe ihe karịrị mmadụ isii bu ya ugbua.

N'egwuregwu,

Real Madrid ekwuola na Eden Hazard bụ onye egwu ha gbajiri ụkwụ aka nri ya nke bụ na ọ gaghị eso agba bọọlụ mgbe ha ga-ezute Manchester City n'asọmpi Champions League n'ụbọchị wenesde.

Ọzọ bụ na ndị Manchester United ji ọkpụ goolu atọ chara acha gwọọ Watford ịba n'Old Trafford.

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Bruno Fernandes na Anthony Martial nyere goolu tupu Greenwood enye nke atọ

Odion Ighalo nke Naịjirịa e tinyere n'a nkeji iri asatọ nke ọkara nke abụọ ji ohere ahụ zute Watford bụ ebe ọ gbaburu bọọlụ mbụ.

'Ọ bụ amaghị ihe ma onye ọchịchị jiri ụgbọala 20 na-aga n'ụzọ'

Image copyright Getty Images

Onye ji ọkọlọtọ People's Democratic Party(PDP) zọọ oche osote onyeisiala na ntụliaka 2019 ekwuola hoha na ọ bụ amaghị ihe ma onye n'ọchịchị iji ụgbọala iri abụọ na-aga n'ụzọ.

Peter Obi na-ekwu nke a n'emume maka ndị gụchara mahadum Veritas.

Obi kwuru na n'oge ọ bụ Gọvanọ Anambra steeti na ụgbọala iri abụọ na-eso ya.

Kama otu ụbọchị, ọ chọpụtara na n'ime ụgbọala ndịa, na iri na atọ n'ime ha ebughi mmadụ ọbụla.

O kwuru sị na " ụgbọala iri abụọ ndịa bụ ọgbataughie nye ndị mmadụ, ma na-eme ka njem siere ndị mmadụ ike".

Obi si na ọ bụ nanị na Naijirịa ka ndị mmadụ na-akpa ụdịrị agwa a.

Ọ rịọrịọ ndị ntororbia ka ha nyere aka ma tinye uchu n'idozi ọchịchị na Naijirịa.

O kwuru sị " Anyị nọ n'ajọ ọnọdụ, mu onwe m nọ n'ajọ ọnọdụ. Onye gwara gị na anyị na-eme ọfụma na-asị asị. "

Obi sị kwa na ụjọ na-atụ ya ụbọchị ọbụla maka na ezigbo nchekwa adịghị.

Maka nzukọ Aisha Buhari na nwunye ndị isiala chịburu na mbụ

Image copyright Aisha Buhari Facebook
Nkenke aha onyonyo Nwunye Buhari na-ekwukarị uche n'ihe gbasara gọọmenti di ya

Ụlọọrụ onyeisiala ekwuola na onweghị ihe gbasara ndọrọndọro ọchịchị na nzụko nwunye onyeisiala bụ Aisha Buharị na nwunye ndị isiala chibụrụ mbụ.

Ọ bụ onye na-ahụ maka mgbasa ozi ụlọọrụ nwunye onyeisiala bụ Aliyu Abdullahi kwuru nkea were sị na nzụkọ ha bụ maka ịkwado ụmụnwaanyị Naịjirịa.

N'ofesi

Image copyright EPA
Nkenke aha onyonyo Onyeisiala mba Itali bụ Giuseppe Conte sị na-agaghị ekwe ka mmadụ bata ma ọ bụ pụọ obodo 12 ahụ

Mba Italị amachiela obodo iri na abụọ nke dị na Lombardy na Veneto maka ọrịa Coronavirus.

Nke a na-abịa dịka mmadụ abụọ nwụrụla na ya bụ ọrịa ebe mmadụ iri asaa na itoolu bụ ya na mba Itali.

N'Egwuregwu

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo N'agba nke asaa ka onye nchịkọta kwụsịrị asọmpị a

Na nwoke na nwoke ibe ya ha bụ n'ọnụ. Nke a bụ eziokwu dịka Tyson Fury tipuru Deontay Wilder ndi mụo n'anya na asọmpi WBC.

Ọ bụ na agba nke asaa ka ndị ndu Deontay Wilder weliri aka elu tupu asọmpị ha biara abụru ihe ọzọ.

Akụkọ ga-amasị gị