Assets Declaration: Ụlọikpe ukwu akụchapụla ebubo eboro Ike Ekweremadu

Ekweremadu Image copyright Ike Ekweremadu

Ụlọikpe ukwu akụchapụla ikpe gbasara ebubo eboro omeiwu Ike Ekweremadụ maka ịjụ ikwupụta akụnaụba ya.

Nkea na-abịa dịka nagalaba ehiwere maka ịnyọchapụta akụnauba ndị ọha di n'aka mmadụ.

Ngalaba a nke onyeisi ha bụ Okoi Obono-Obla sị na Ekweremmadụ jụwara isi mgbe ngalaba a gwara ya ka o kwuputa akụnaụba ya niile.

Ihe kpatara eji kụchapụ ya bụ ebubo bụ na amaghị ebe onye ọkaiwu jị akwụkwọ eji ekpe ya bụ ikpe nọ.

Onye ọkaiwu na-anọchite goomentị Naijirịa bụ Pius Akutah rịrịo ọkaikpe Binta Nyako ka ọ nye okaiwu ahụ iwu ka ọweghachị akwụkwọ ikpe o ji kama Nyako ekweghị.

Okaikpe Nyako gwara okaiwu Akụtah na mgbe ọ dị njikere ha bia ka ekpe ya bụ ikpe ma dịka ọ di ụgbụa, ọ ga-akụchapụ ya bụ ikpe.

Atụmaatụ nchekwa ọwụwa anyanwụ

Image copyright David Umahị onn Facebook

Ọ bụghịzị akụkọ ọhụrụ na ndị gọvanọ ọwụwa anyanwụ echepụtala atụmaatụ nchekwa imeobodo tọrọ atọ maka steeti ha.

Mana onyeisi ọgbakọ ndị gọvanọ ọwụwa anyanwụ bụ Dave Umahi apụtala kwuo na ha agwala onyeisi ndị uweojii ebumnobi ha gbasara ihibee otu nchekwa imeobodo n'ọwụwaanyanwu niile.

O kwuru na ndị uweojii kwuru na ha ga-enye ha ntụzịaka ha ga-eji hiwe ya bụ otu nchekwa.

Umahi kwuru na ha na-arịọ ikike ndị uweojii iji wee tụbata ụfọdụ egbe ndị otu nchekwa imeobodo a ga-eji na-eche nche.

Ipob kwesiri mgbaghara ọ bụghị Boko Haram - Ohaneze Ndigbo

Nkenke aha onyonyo Nnia Nwodo onyendu Ohaneze Ndigbo

Ohaneze Ndigbo ekwuola hoo haa na ha akwadoghị mgbaghara a chọrọ ịgbaghara ndị otu omekataraihepụọụjọ bụ Boko Haram.

Ha sị na ndị kwesiri ịgbaghara bụ ndị otu Ipob bụ ndị ji udo achụ mnwereonwe ha.

Damian Okeke-Ogene bụ onyeisi Ohaneze n'Anambra steeti sị na gọọmenti na-adọnyere Boko Haram ukwu site na ya bụ mgbaghara a chọrọ inye ha maka ọbara ha kwafuru na Naịjrịa.

Okeke-Ogene gwara gọọmenti Buhari ka o chefuo maka ya bụ atụmatụ n'isi ndị ogbuaraọbara bụ Boko Haram.

Ọ sị na ya bụ atụmatụ gosiri "na ikpe mara eziokwu na akaazụ dị ya" ma kwukwa na ya bụ atụmatụ nwere ike ibute ọgbaaghara n'obodo.

Okeke-Ogene kwuru nke a gbasara akwụkwọ iwu ahụ etinyere n'ụlọomeiwu bụ nke achọrọ iji hiwe ụlọọrụ maka ilete ndị otu Boko Haram sị na ha cheghariri anya.

Ndị Eze obodo na ndị ọnụ na-eru n'okwu sị na ha anabataghị ya bụ atụmatụ.

Yienu akwa ojii - CBCN

Image copyright Getty Images

Ndị isi ụka Katọlik na Naịjirịa enyela iwu ka ndị ụka ha niile yie akwa ojii n'ụbọchị Wenezde na-abịa abịa.

Nke a bụ iji ru ụjụ maka ọtụtụ ọbara ndị otu kraịst ndị omekome kwafurula n'ọdị nso a.

Ụbọchị Wenezde ga-abụ ụka ntụ bụ mmalite oge 'Lent' mgbe ndị otu kraịst ji echeta ahụhụ na ọnwụ Jesus Christ.

Anụ ehi akwụsịla

Image copyright Getty Images

Ndị obodo Uwheru nke dị na Delta State amachiela igbu, ire maọbụ iri anụ ehi n'obodo ha.

Iwe ha bụ maka ọtụtụ ndị be ha ndị ọchịehi Fụlanị gburula n'ọdị nso a.

Dịka akụkọ si kwuo, ndị ọchịchị obodo ahụ kwekọrịtara na onweghizi emume ọbụla a ga-eme na be ha nke a ga-eji anụ ehi wee sie ihe ọbụla.

N'Ofesi

Harvey Weinstein

Image copyright Reuters
Nkenke aha onyonyo Harvey Weinstein n'ụlọikpe n'afọ 2018

Ikpe amaala onye na-emepụta ihe ejije bụ Harvey Weinstein maka mwakpo ọwakporo ọtụtụ ụmunwaanyị.

Weinstein gbara afọ iri isii na asaa ma nwee ike irite afọ iri abụọ na ise na nga maka njọ ọ mere.

Nke mere na Jamanị

Image copyright Reuters
Nkenke aha onyonyo Ọ bụ na elekere 13:30 GMT ka ọnye a nyabara ụgbọala ebe ndị mmadụ nọ.

Akụkọ na-eme ugbua bụ na otu onye anyabala ụgbọala n'ike ebe ndị mmadụ na-enwe aṅụrị n'obodo Volkmarsen nke mba Jamanị.

A na-eche na ihe dịka mmadụ iri atọ merụrụ ahụ ma amabeghị ihe bụ uche obi onye kpara mkpamkpa.

Kama kepukepu na-ekwu na ọ di ka ọ bụ ụmụaka ka onye nyara ụgbọala bu n'obi.

Trump gara India

Image copyright Getty Images

Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump emeela njem nleta na Mba India n'ụbọchị Mọnde.

Trump nwere ọtụtụ ndị nkwado na India nke mere ọbịbịa ya ji ewu ewu na mba ahụ.

Emume ncheta Kobe na Gianna Bryant

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Kobe Bryant na nwa ya nwaanyị

N'elekere iri n'ụbọchị Monde ka a ga-eme emume iji cheta ndụ Kobe Bryant na nwa ya nwaanyị Gianna, bụ ndị e ji ịkụ bọọlụ nkata mara.

Kobe Bryant na nwa ya nwụrụ n'ihe mberede ụgbọelu helịkọpta n'ọnwa Jenụwarị.

Liverpool na Westham

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Mohammed Sala na Sadio Mane

Otu egwuregwu bọọlụ Liverpool ga-ezute ndị Westham n'asọmpi Premier League n'elekere asatọ nke abalị Mọnde a.

Ụfọdụ na-ekwu na Liverpool ga-emerikwa ka ha si emebu kamgbe a malitere EPL nke afọ 2019/2020.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Isiokwu Ndị Emetụtara