Ash Wednesday: Ụkantụ afọ 2020 aghọọla ụbọchị iru uju maka ndị nwụrụ n'aka ndị omekome

Onye yi akwa ojii maka emume ụka ntụ Image copyright Getty Images

Akwa ojii bụ ihe na-egosipụta obi mwute, maọbụ iru ụjụ, mana gịnị kpatara ndị isi ụka Katọlik na Naịjirịa ji gwa ndị ụka ha ka onye ọbụla yie akwa ojii n'ụbọchị ụka ntụ bụ 'Ash Wednesday'?

Nke a bụ nke mbụ ndị mmadụ ga-eyi akwa ojii n'ụbọchị ụka ntụ.

Mana otu jikọrọ ndị Bishọp ụka Katọlic niile dị na Naịjirịa kwuru na ọ bụ ihe mere ede ji bee nwịị.

Ihe kpatara e ji eyi akwa ojii

Image copyright Getty Images

Ndị Igbo tụrụ ilu na ọ bụrụ na okokporo emeghị ka onye ara, ụmụnna ya agaghị alụnye ya nwaanyị.

Ọ bụrụkwanụ na mmadụ gba nkịtị, e bufee ya ama nna ya.

Ya mere ndị ụka Katọlik ga-eji yie akwa ojii iji gosi na ala adịghị mma dị na Naịjịrịa agafeela egwu a chị ụtaba n'aka agba.

1) Otu 'Catholic Bishops Conference of Nigeria' (CBCN) kwuru na akwa ojii a bụ iji ruo ụjụ maka ọtụtụ ọbara ndị otu Kraịst nke ndị ekperima na ndị oyi egwu kwafurula n'ọdị nso a.

Iji maa atụ, Michael Nnadi, nwata akwụkwọ semịnarị ndị ntọ tọọrọ ma gbuo na Kaduna, nakwa Lawan Andimi bụ onye ndị Boko Haram bepụrụ isi.

2) Nke abụọ bụ iji kpọọ oku ka ndị otu Kraịst na mba ụwa niile sonyere ndị nke Naịjirịa n'ekpere.

3) Ọzọkwa bụ iji gwa ndị ọchịchị Naịjirịa na obi dị onye ọbụla njọ maka oke nkwafụ ọbara juru ebe dum.

4) Nke dị ka ibe ya bụ iji otu olu kwuo ka anwụchie ndị niile aka ha dị n'ịkwafu ọbara na Naịjirịa, kpee ha ikpe ma taa ha ahụhụ dịịrị ha.

5) Iji tie mkpu ka otu mba ụwa dị icheiche nụrụ ha ma gbata ọsọ enyemaka.

6) Iji rịọ Chineke ka ọzọ ghara imezi.

Nkenke aha onyonyo Ndị ụkọchukwu Katọlik Enugwu mere ngagharịiwe n'afọ gara aga.

Ugboro ugboro ka ndị ụka Kraịst dị icheiche merela ngagharịiwe maka ọnọdụ nchekwa nke na-akawanye njọ na Naịjirịa.

N'ọnwa Ọgọst afọ nke 2019, ndị ụkọchụkwu Katọlik niile na mpaghara Enugwu mekwara ngagharịiwe maka ntọ na ogbugbu ndị otu ha na steeti ahụ.

Na mbido ọnwa Febrụwarị, onye isi ụka 'Redeemed Christians Church of God' bụ Enoch Adeboye, duru ndị ụka ya mekwaa ihe ha kpọrọ ngagharị ekpere maka nchekwa.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:

Ihe nkiri ga-amasị gị:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionIhe mere ụlọ aja jiri bụrụ ọkachamma na mpaghara Afịrịka - Demas Nwoko

Isiokwu Ndị Emetụtara