Imo state Politics: Ihe mere m ji si na PDP wụbanye n'APC- Uche Ogbuagu

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionImo state Politics: Ihe mere m jị si na PDP wụbanye na APC- Uche Ogbuagu

Onye nnọchite anya Ikeduru constutency n'ụlọomeiwu Imo steeti bụ Uche Ogbuagu ekwuola ihe mere ọtụtụ n'ime ha jiri sị otu Peoples Democratic Party mafee APC.

Ogbuagu sị na ọgbaaghara karịrị na pati PDP mere ya na ndị otu ha ụfọdụ ji mafee APC.

O kwukwara na PDP nọ n'Imo steeti kwụsitụrụ ya isonye n'otu ahụ maka ebubo na ya na ndị si pati ọzọ gakọrọ emume.

N'okwu ya " ụfọdụ otu ndọrọndọrọ ọchịchị bụ agwọ na-erị nwa ha."

"Otu ndọrọndọrọ ọchịchị m nọ na ya anaghị akwado m n'ihe m na-arụrụ ndị be anyị."

Gere ihe ndị o kwuru n'uju ebe n'ihe nkiri dị n'isi akụkọ a.

Nke a na-abịa dịka otu onye ọkaiwu akpọrọ Nelson Okedinachi, kwuru ka achụọ onyeisi ụlọomeiwu Imo steeti nakwa ndị otu ya si PDP na APGA wụbanye APC.

O nwere iwu megidere isi otu ndọrọndọrọ wụbanye ọzọ?

Onye ọkaiwu aha ya bụ Malachy Ugwumadu kwuru na ọ bụrụ na onye ụlọomeiwu si pati ọ nọ wụbanye pati ọzọ enweghị ihe gosiri na pati ya nọ n'ọgbaghara, ị marana a ga-anapụ ya oche n'ike n'ụlọomeiwu.

Nke a bụ makana agwa a megidere iwu Naịjirịa dị na "section 109 (1)(g) nke afọ 1999 ahaziri.

Mana ọ bụrụ na onye ụlọomeiwu kọwara ọfụma etu pati ahụ ọ chọrọ isi na ya gbapụ si nọrọ n'ọgbaghara. ị mara na iwu ga-akwado ya nkeọma.

Mgbe anyị kpọrọ ọnụ na-ekwuru PDP nọ n'Imo steeti, obughi ekwenti ya ruo ugbua.

Akụkọ ndị ga-amasị gị

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionỌgba mbọ: E ji m asambodo mahadum m mana a na ma-azụ ezi'