PMB in Ondo: Ị hụrụ ihe mere mgbe Onyeisiala Buhari gara n'Ondo steeti?
Ka e si apịatu ndị mmadụ bịara ikele Onyeisiala Buhari ka ọ gbụsara ụkwụ n'Ondo steeti:

Ebe foto si, Presidency/Twitter
Lee ka Bashir Ahmed si gosi ihe onyoonyo a n'akara Twitter ya:
Hosni Mubarak aka chịburu Egypt anwụọla n'afọ 91
Ebe foto si, Reuters
N'afọ 2016 , Hosni pụtara n'ihu ụlọọgwụ ikele ndị mmadụ mgbe a na-eme otu emume ncheta na mba Egypt
Onye chiburu Egypt bụ Hosni Mubarak, nke ndị agha mba ahụ chụpoụrụ n'afọ 2011 mgbe ọ nọ n'ọchịchị anwụọla n'ụlọgwụ dị na Cairo.
Ọ dị afọ iri itoolu wee nwụọ.
Mubarak nọrọ afọ atọ n'ọchịchị tupu e nwee ọgbaghara na mba Ijipt.
Ihe ndị ị kwesịrị ịma maka Hosni Mubarak.
- Ọ natara ọchịchị n'afọ 1981 ka ndị echere bụ oke nkwenye n'okwukwe Alakụba gburu onye Ijipt bụ Anwar Sadat.
- Dịka onyeisi ya, Anwar Sadat, Onyeisiala Mubarak bụ onye agha.
- Ọ bụ okwụ ụgbọelu na onyeisi ndị agha na-echekwa ikuku obodo.
- Onyeisiala Mubarak bụ onye ndu na-elebaanya n'ihe gbasara mmekọrita mba na mba, hụrụ na udo chịrị n'etiti Ijipt (Egypt) na Izrel (Israel).
- N'Ijipt, o tinyekwara iwu gbatagbata n'afọ 30 ọ chịrị nyere obodo ikiere inwuchi onye sọrọ ha oge ọbụla.
- Aka ọchịchị ya gbasara nlekọta mkpata na mmefu ego enyeghị aka gbo mkpa ndị na-achọ ọrụ, nke mere ka nrụrụaka akwụrụ chịm n'obodo.
- N'ihi ọgbaaghara ndị Ijigpt mere nnukwu ngagharị iwe na Jenụwarị 2011
- N'ụbọchị iri na asatọ, akwaturu ọchịchị Hosni Mubarak.
- A kpọpụrụ ya n'ụlọikpe, nke mere na e jiri nyabata ya n'ụlọikpe, ma nye ya ikpe na-ebighiebi n'ihi ọbara ndị na-eme ngagharị akwapụrụ na mba Ijipt.
- Mana ekpegharịrị ikpe a na Maachị 2017, a tọhapụrụ ya maka o mela afọ atọ n'ikpe a mara ya maka mpụ na nrụrụaka, ma na nwoke a kpọrọ Pharaoh ndị ọgbara ọhụrụ, ọ bụ ihe ihere.
Anya mmiri, akwa arịrị juru elu na ala n'emume akwamozu Kobe Bryant
Ebe foto si, Getty Images
Ụwa niile gbakọrọ n'ọgbọ egwuregwu 'Staples Center' na mba Amerịka iji ruo ụjụ maka ọnwụ Kobe na Gianna Bryant.
Kobe Bryant bụ onye e ji ịkụ bọọlụ nkata mara n'ụwa niile; ya na nwa ya nwaanyị bụ Gianna, nwụrụ n'ihe mberede ụgbọelu helịkọpta na mbido ọnwa Febrụwarị a.
N'emume ụlọakwa ahụ, anya mmiri na akwa arịrị jupụtara ebe dum mgbe ndị mmadụ na-akọwa maka ndụ Kobe Bryant na nwa ya.
Nwunye Kobe Bryant bụ Vanessa, kwuru na Chineke ma na di ya hụrụ nwa ya nwaanyị n'anya nke ukwu nke mere o ji kpọrọ ha abụọ otu ụbọchị.
O kwuru na ya nwere okwukwe na Kobe na Gianna nọ ebe ka mma ugbua.
Ebe foto si, Getty Images
Nwunye Kobe Bryant, Vanessa
Onye ọzọ kwuru okwu n'emume ahụ bụ Michael Jordan, onye bụ ọkaibe n'egwuregwu bọọlụ nkata tupu ọ laa ezumike.
Jordan bere akwa oge ọ na-ekwu okwu n'ihi ịhụnanya o nwere n'ebe Kobe nọ.
Ebe foto si, Getty Images
Michael Jordan bere nnukwu akwa
Ọ kpọrọ Kobe "nwanne m nwoke nke nta", ma kwuo na ihe na-adabara ha abụọ nke ọma.
Ndị ọzọ a ma ama gara ya bụ emume gụnyere Beyonce, Christina Aguilera, Jennifer Lopez na Alicia Keys.
Nsogbu PDP na APC
Ebe foto si, Getty Images
Onyeisi ndị PDP - Uche Secondus, na onyeisi ndị APC Adams Oshiomhole
Ndị otu pati PDP agwala ụlọikpe kachasị ka ha lebakwa anya ọzọ n'ikpe gbasara ntuliaka ọkwa onyeisiala Naịjirịa, nakwa nke steeti dị iche bụ nke ụlọikpe ahụ kwuru na APC meriri.
Nke a na-abịa dịka ndị APC gwara ụlọikpe kachasị ka ha kpegharịa ikpe gbasara ntuliaka gọvanọ Bayelsa na Zamfara bụ nke ha kpebiri na PDP meriri.
O teela ndị otu ndọrọndọrọ ọchịchị abụọ a ji atakọrịta onwe ụkwụ.
Onye ọgba bọọlụ ndị SARS gburu
Ebe foto si, Twitter/@RemoStarsSC
Tiyamiyu Kazeem
Onyeisi ndị uweojii bụ Mohammed Adamu enyela iwu ka e nyochaa ihe kpatara ọnwụ otu nwaokorobịa onye ọgba bọọlụ aha ya bụ Tiyamiyu Kazeem, onye a na-ekwu na ọ bụ ndị SARS gburu ya.
Kazeem na-agbara otu egwu bọọlụ Remo Stars nke dị n'Osun steeti.
Akụkọ kwuru na ndị SARS si n'ụgbọala na-aga aga tụpụ Kazeem.
Mana ndị SARS na-agọ agọ na ọbụghị ha gburu ya kama na ọ bụ ụgbọala kuturu ya oge ọ chọrọ isi n'aka ha gbapụ.
Coronavirus
Ebe foto si, AFP
Ndị ọrụ ahụike na-agba mbọ igbochi coronavirus
Otu ahụike mba ụwa bụ WHO agwala mba dị icheiche ka ha kwado nkeọma maka igbochi ọrịa ọjọọ coronavirus dịka ọ na-agbasa n'akụkụ ụwa niile.
N'ụbọchị Monde, e nwetara ozi na ọrịa a abaala mba Iraq, Afghanistan, Kuwait, Oman na Bahrain.