Coronavirus in Nigeria: 'Ọtanisi ọzọ na-abịa kee nụ nkwụcha' - Ndị ọkammụta

  • Chris Sanctus Okereke
  • Broadcast Journalist
Ụmụnwaanyị nọ n'ahịa

Ebe foto si, Getty Images

Dịka ọnụọgụgụ ndị coronavirus metutara na-arịgo na mba ụwa, mmekọrịta mmadụ na ibe ya na-akpọ isi n'ala kwa ụbọchị.

Otu ahụ ka akụnaụba mba niile sịkwa akpụ afọ n'ala.

Naịjirịa nweburu olileanya na ha ga-ere mmanụ agbidi ihe uru $57 otu drọm, mana ụgbụa maka ọgbatauhie coronavirus butere ya na agwa ndị Saụdị Arebịa kpara na ahaa mmanụ, ya bụ ebumnụche anyụọla ka ọkụ.

Nke a mere BBC jiri kpọwa ndị ọkammụta ka ha gbaa afa ihe Naịjirịa nwere ike ime n'oge dị otu a.

Ọkammụta na Mahadum Nasarawa steeti bụ Uche Uwaleke bụ ọkamụta na okwụ akụ na ụba sị onye ọbụla kee ajị n'ume.

O kwukwere ihe ndị a:

  • Gọọmenti etiti kwesiri isepụ aka kpamkpam n'atụmatụ mbibi ego karịrị ijeri iri abụọ na ụma ha chọrọ ibite.

Ebe foto si, Uche Uwaleke

Nkọwa foto,

Prof. Uche Uwaleke bụbu kọmishona na ahụ maka akụ na ụba n'Imo steeti

  • Gọọmenti kwesịrị ikwupụta na e nwere ọnọdụ gbata gbata a kpọrọ ọtanisi n'akụnaụba Naịjirịa.
  • Gọọmenti kwesịrị ileba anya n'akwụkwọ mkpata na mmefụ akụ Bekee kpọrọ bọjet nke 2020, wetuo aka na ihe ndị ụfọdụ a chọburu ime.
  • Gọọmenti kwesịrị ime ka Ministri niile wetuo aka n'ego ha kwadoburu imefu, kee ajị n'ume.
  • Gọọmentị kwesịrị ịgba mbọ kwusịlata ndị isi ọrụ ya ime njem niile ha chọburu ime na mba ofesi nke gụnyere njem gbasara ọzụzụ ndị ọrụ.
  • Gọọmentị ga-akawa ahụ gbachie ma pịchie ụzọ niile e si ezu gọọmenti ohi nke na-eme ka ego gọọmenti ghara ịbanye ebe o kwesịrị.
  • Ebumnobi gọọmenti ihibe kọmiti ga-eweputa atụmatụ ga-eme ka ya bụ ọrịa ghara ịgbasa na Naịjirịa bụ ezigbo atụmatụ.

Uwaleke gara n'ihu sị na ọ bụrụ na ọ bụghị otu a, na ihe mere Naịjriịa na afọ 2016 (Recession) ga-eme ha ọzọ.

Onye ọkanchọcha ọzọ bụ Okey Ikechukwu tiri mkpụ sị na ịnwe olileanya n'ọnọdụ Naịjirịa ugbua siri ike.

Ọ dọrọ aka na ntị ka onye ọbụla kee aji n'ume maka ọtanisi na-abịanụ.

Ikechukwu, dịka Uwaleke, kwetara na ihe mbụ bụ gọọmenti ịkwụsị amụma ibite ego n'ụzọ ọbụla ugbua.

Ebe foto si, Okey Ikechukwu

Nkọwa foto,

Okey Ikechukwu bụ ọkachamara n'okwu gbara ọchichị obodo

Ikechukwu sị onye ọbụla kee nkwụcha maka ọtanisi na-abịanụ.

Ọ gwakwara ndị mmadụ ka ha beleta oke njem na-enweghị isi nke nwere ike ibutere ha ọrịa coronavirus na-amaghị ama.

Ihe ndị ahịa kwuru maka etu Coroniavirus si emetụta azụmmahịa

Uchechukwu Ayaji na-ebubeta ngwaahịa ekwentị na Legọs na-ekwu na ya bụ ihe ji ha n'onu ugbua maka na o nweghịzị ngwaahịa ọhụrụ na-abata.

Otu onye bụ isiahurukwawa okpu n'ịkụ ọgwụ bụ Chinedu Obiako bi n'Enugwu sị ya bụ ọrịa metutara ahịa ha nke ukwu.

Obiakọ sị na ahịa ogwu ha na-azụ "tinyere ego ugburu ise maka ụkọ ngwaahịa ahụ n'ahịa".

Nkọwa foto,

Uchechukwu Ayaji na-azụ ahịa ekwentị na Legọs

Ọ sị na ndị Chaịna kpọchitere ngwaahịa niile ndị mmadụ zụrụ azụ makana o zughịrị mba ha iji zọọ ndị mmadụ ndụ.

Obiako sị ndị Chaịna "na-akwụghachi ndị nwe ngwaahịa ahụ ụgwọ ha ugboro ise".

Ọ sị na ihe a butere ụkọ ngwaahịa gbasara ahụike na Naịjirịa ma meekwa ka ndị dị adị gara oke ọnụ.

Nkọwa foto,

Chinedu Obiako na-azụ ahịa ọgwụ

Obiakọ kwukwara na ihe na-esiwanye ike na Naịjirịa maka na ọ bụ mba bụ naanị oriri ka ha na-eri, ha anaghị emepụta emepụta.

O kwukwara na iwu ji usoro imepụta ngwaahịa na Naịjirịa tara akpụ nke bụ na ọ ka ngaraọnụ imepụta ngwaahịa ebe a karịa ibubeta ya.

Ebe foto si, Nigerian Stock Exchange/Twitter

Ụlọọrụ ndị na-ahụ maka orire azụmahịa nke a na-akpọ 'Nigerian stock market' sị na ọnụọgụgụ dara ruo 2 .5% n'ụbọchị Monde.

Onye ọnụ na-eru n'okwu n'ihe gbasara orire azụmahịa stọk bụ Kasimu Garba Kurfi sị nagbanyeghi na o metutala ọtụtụ ụlọ ahịa ụfọdụ na Naịjirịa, mana ikikere ụlọọrụ anọ maọbụ ise enyela ahịa stọk Naịjirịa ịkwụọtọ.

Kurfi sị na ụlọọrụ ndị a bụ Dangote Cement, MTN, AIRTEL na Nestle.

Ụlọọrụ ndị a bu ihe karịrị pasent 65 (65%) stọk n'ahịa obodo niile na Naịjirịa.

Kurfi sị na ndị ọzọ ejila 10 maọbụ 100% daa na Naịjirịa.

Akụkọ ga-amasị gị