Marriage crisis: Nwaanyị na-alụ di abụọ etinyela ụwa na gbagharịa

Nwoke na nwaanyị Image copyright Getty Images

Ndị uweojii nke alakụba nọ na Kano amanyela ọnụ n'okwu gbasara ụmụnwoke abụọ Bala Abdulsalam na Bello Ibrahim na-ekwusi ike na ha bụ di otu nwaanyị akpọrọ Hauwa Mariri.

Onyeisi ndị uweojii ahụ bụ Gwani Murtala n'okpuruọchịchị Kumbotso kwuru na ya bụ okwu di egwu nke mere ka ha buru ya gawa isi ụlọọrụ ha.

O kwuru na ha mere nke a maka na di nke mbụ nwaanyị ahụ gwara ha na ka afọ gachara , na ya batara hụ na nwoke ọzọ na-alụzị nwunye ya.

Mana Hauwa Mariri gwara ndị ntaakụkọ BBC na dị ya nke mbụ gbara ya alụkwaghịm tupu ọ gawa njem n'ime obodo. Nke a mere o ji lụrụ dị ọzọ.

Hauwa onye mụtarala ụmụ isii n'aka dị ya nke mbụ nakwa otu nwa na afọ ime n'aka dị ya nke abụọ kwuru na Bello ji ọnụ gba ya alụkwaghịm , o deghị ya n'akwụkwọ dịka ụka alakụba si eme.

Bello bụ dị ya nke mbụ kwuru na onweghị mgbe o ji gba ya alụkwaghịm.

Di ya nke abụọ kwuru na Hauwa kọwatara ọfụma na di ya nke mbụ gbara ya alụkwaghịm mere o ji lụwa ya.

Sheik Nazifi Inuwa bụ ụkọchukwu alakụba nọ na Kano kwuru na ikpe mara di nke abụọ makana ọ jụghị ese ọfụma.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Isiokwu Ndị Emetụtara