Cheating in Relationships: Ụmụnwoke a ka ụmụnwaanyị agba n'ezi?

  • Chimamaka Ihenacho
  • Broadcast Journalist, Igbo
Nwoke na-agba n'ezi

Ọtụtụ oge ka ndị mmadụ na-eche na ụmụnwoke na-agba n'ezi karịa ụmụnwaanyị, mana ọ bụ eziokwu?

Ọtụtụ mmadụ ga-akpọ ihe dị iche iche ịgba n'ezi, mana ọ bụghị onye niile ga-akọwanwu ihe ha chere ga-ebutenwu ha ịgba n'ezi.

Ọtụtụ ndị mmadụ amaghịkwa ihe ha ga-eme ma ha chọpụta na onye otu ha gbara n'ezi, n'agbanyeghi na ha etuola ọnụ ihe ha ga-eme tupu ya bụ ihe emee.

Ebe ọtụtụ ndị ọzọ anaghị ekweta na onye nke ha gbara n'ezi, ma ọ bụghị ma ọ bụzị onye ahụ jizi aka ya kwupute ya.

Ọtụtụ ndị ọzọ bụ ndị na-atụ ụjọ na ndị otu ha ga-agbarịrị n'ezi.

Ụzọ ụfọdụ si agba n'ezi

Ihe ụfọdụ kpọrọ ịgba n'ezi abụghị ihe ibe ha na-akpọ ya. Mana lee ụfọdụ ihe ndị mmadụ na-akpọ ịgba n'ezi:

  • Idina onye abụghị di maọbụ nwunye gị nakwa onye abụghị enyi gị nwoke maọbụ nwaanyị
  • Ịkpanyere onye abụghị onye obi ụtọ gị nkata ebe ọ dị ukwuu, ma na mmadụ ma n'ekwentị, nke nwereike ibute iche echiche maka onye ahụ ụfọdụ oge
  • Ịmịcha onye abụghị onye obi ụtọ gị ọnụ
  • Ile ihe nkiri ndị gba ọtọ nke Bekee kpọrọ "pornography".

Mana kedụ onye ka agba n'ezi n'etiti nwoke na nwaanyị?

N'akụkọ BBC dere oge gara aga, ha tinyere nchọpụta na ọtụtụ ndị gbara n'ezi ekwebughi na ha ga-agba n'ezi.

N'afọ 2000, ngalaba a kpọrọ "National Survey of Sexual Attitudes and Lifestyles" (Natsal) mere nnyocha ma chọpụta na pasentị ụmụnwoke 15 gbara n'ezi, ebe pasentị ụmụnwaanyị itoolu mekwara otu ihe ahụ.

Dọkịta Catherine Mercer, bụ onyeisi ndị mere nchọpụta Natsal a, kwuru sị na ohere a dị n'etiti ụmụnwoke na ụmụnwaanyị nwereike ịbụ n'ihi na ọ na-ara ụmụnwaanyị ahụ ikwenye na ha gbara n'ezi karịa ụmụnwoke.

O kwuru sị "Anyị enweghi ike ileru anya mara mgbe mmadụ gbara n'ezi, ya mere anyị ga-eji dabere n'ihe ndị mmadụ gwara anyị. Anyị makwu na ihe dị iche iche dị n'ihe gbasara etu nwoke na nwaanyị si ekwuputa maka mmekọrịta."

Nchọpụta Natsal kọwara na ihe ndị iche ji dịrị na pasentị ndị na-agba n'ezi bụ na ụmụnwaanyị anaghị edinakarị ọtụtu ụmụnwoke, ọzọ bụkwa na o nwereike ịbụ maka afọ ole onye dị.

"Anyị ma na ụmụnwoke na-atọkarị ụmụnwaanyị ọ bụ ha na ha. Ị chee ya eche hụ ebe nwoke dinara nwaanyị (nwereike ịbụ na o nweghi enyi nwoke) ọ tọrọ ọfụma ma ọ gbaa n'ezi, ị ga-ahụ na ọ bụ ya kacha nwee ike ịgba n'ezi karịa nke nwaanyị."

Mana nnyocha e mere n'afọ 2017 na-akọwa na ụmụnwoke na ụmụnwaanyị na-agba n'ezi aharala.

Ndị kacha nwee ike ịgba n'ezi

  • Ndị ha na obi ụtọ ha ebikọghị ọnụ
  • Ndị ekwenyechaghị n'ihe gbasara ụka na ofufe
  • Ndị na-apụkarị apụ maka ọrụ

Akụkọ ga-amasị gị:

Ihe nkiri a ga-amasị gị:

Aha onyonyo,

Gịnị ga-eme nwoke Igbo ajụ nri nwunye ya siri?