Gender Crisis: 'Ndị dọkịta akọwaraghị m ọfụma' - Nwaanyị gbanwere onwe ya ghọọ nwoke

Keira Bell
Nkọwa foto,

Keira Bell

Otu nwaanyị na mba Briten agbaala otu ụlọọgwụ akwụkwọ maka ịgbanwe ya ka ọ ghọọ nwoke.

Nwaanyị a aha ya bụ Keira Bell kwuru na ndị dọkịta akọwaraghị ya nke ọma oge ọ chọrọ igbanwe onwe ya.

Dịka Bell sị kọwaa, ọ dị naanị afọ iri na anọ oge ọ malitere ịṅụ nakwa ịgba ọgwụ iji gbanwee onwe ya.

Ọ gara n'ihu kwuo na ndị dọkịta ụlọọgwụ ahụ gaara ịkọwara ya ihe ọ chọrọ ịgabiga n'ihi na ọ ka bụ nwatakịrị n'oge ahụ.

Bell ṅụrụ ọtụtụ ọgwụ ma gbakwaa nke ọgbụgba iji gbanwee olu ya ka ọ dịka nke nwoke.

Nkọwa foto,

Keira Bell oge ọ dị na nwata

Ka ọ dị afọ iri na isii, o bepụrụ ara ya abụọ iji zuo oke dịka nwoke.

Ugbua, na mkparịta ụka ya na BBC, o kwuru na ọ bụrụ na ya ma, ọ garaghị eme ihe ndị ahụ.

O kwuru sị: "Abụ m nwata n'oge ahụ, naanị afọ iri na isii ka m dị."

"Ọ bụ ndị ụlọọgwụ ahụ ka ọ dị n'aka ịkọwara m ihe niile gbasara mmadụ ịgbanwe onwe ya."

"Ọ bụrụ na ha kọwaara m, enwere m ike ịgbanwe echiche m oge ahụ."

Nkọwa foto,

Ụlọọgwụ Tavistock ebe Keira Bell nọ gbanwee onwe ya

Ọ gakwara n'ihu kwuo na ya achọzighi ịbụ nwoke, kama ka ndị mmadụ kpọwakwa ya nwaanyị ọ bụbu na mbụ.

Ọkaikpe ekwuola na a ga-amalite ikpe ahụ n'izuụka a.

Ndị ọkaiwu na-ekwu na ụmụaka erubeghi afọ iri na asatọ amachabeghi ihe nke ọma, ya mere na ha enweghị ikike ikwu na ha ga-agbanwe onwe ha.

Ụlọọgwụ ebe Bell nọ gbanwee onwe ya bụ Tavistock and Portman NHS Trust kwuru na ha kpachapụrụ anya ma jụọ ajụjụ niile ha nwere ike ịjụ tupu ha amalite ya bụ mgbanwe.

Akụkọ ga-amasị gị:

Ihe nkiri ga-amasị gị:

Aha onyonyo,

Lee etu nje ọrịa si ebufe onwe ha site n'aka atịtị