Peer pressure: Etu ụdịrị ndị enyi ị nwere nwereike isi gbuo gị

  • Chimamaka Ihenacho
  • Broadcast Journalist, Igbo
Ụmụ okorobia na-ese ihe

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto,

Nchọpụta Suzanne Higgins na-agụ maka akparamagwa ndị mmadụ ji nrị maa atụ were sị na gị na ndị mmadụ na-eri oke nri na-erikọ nri, na ị nwereike iri karịa etu i si eribu

Ndị Bekee nwere okwu ha na-ekwu nke bụ "ị gosi m ndị enyi gị, m gwa gị ụdịrị mmadụ ị bụ".

Mana ọ bụ eziokwu na e nwereike isi n'ụdịrị enyi mmadụ nwere mara ụdịrị onye ọ bụ?

Azịza ajụjụ a nwereike ịbụ "ee" maọbụ "mba", mana otu ihe bụ eziokwu bụ na ọtụtụ oge ka mmadụ na-eṅomi ma na-amụta akparamagwa dị iche iche n'aka ndị gbara ya gburugburu.

Ọtụtụ oge ka ị na-amaghị na ị na-akpa agwa ndị ahụ, mana ọ ga-abụ ndị ọzọ nọ gị n'akụkụ ga-agwa gị "enyi lekwa ihe ị na-eme, ọ dịghị mma".

Ọ bụkwa eziokwu na mmadụ nwereike ịmụta agwa ọma maọbụ nke ọjọọ, mana nke anyị na-enyobanye anya bụ "n'ihe ọjọọ" mmadụ nwereike ịmụta n'aka ndị enyi ya.

Lee agwa ọjọọ nwereike imemila mmadụ

1) Ịṅụ mmanya:

Ebe foto si, Getty Images

Ịṅụ mmanya adịghị njọ, mana ịṅụbiga ya oke bụ ebe nsogbu dị makana o nwereike imebi otu ihe maọbụ abụọ n'ime ahụ gị.

Kedụ etu ndị enyi gị si banyekwa n'ime ya ka ị nwereike ịjụ, mana onye nwere ndị enyi ịkụ ngwọrị na-amasị nke ukwuu, onye ahụ ga-ahụ onwe ya ebe ọ ga na-eso ha na-aṅụ mmanya ma a gụrụ gụrụ.

Ọtụtụ oge ọ ga-abụ n'ihi na ị chọghị ịdị ka "onye kpe azụ" mgbe ndị enyi gị ga na-akpọku gị ka ị bịa soro ha ṅụọ mmanya, ị gaa mee ihe ị na-akwadoghị.

Ebe foto si, Getty Images

Nke a mere na ọtụtụ ndị nne na nna na-achọ iji aka ha ahọpụta ndị ga-abụ enyi ụmụ ha, mana kedụkwanụ maka ndị toferela ịhọpụtara enyi?

Ọrịa ịṅụ oke mmanya nwereike inye gị gụnyere ọrịa akpụ, ọbara mgbalielu ọrịa shuga, ọrịa imeju dị iche iche.

2) Ise anwụrụ:

Ebe foto si, AFP

Dịka ịṅụ oke mmanya, ise anwụrụ na-emebi mmadụ ahụ dịka ndị ọkachamara n'ihe gbasara ahụike si ekwu.

O nwekwara ike ibunye gị ọrịa ndị gụnyere ọrịa akpụ nke ume, ọrịa obi, ọrịa mkpọnwụ ahụ nakwa ndị ọzọ.

Ọtụtụ ndị na-ese anwụrụ ugbua mụtara ya n'aka ndị enyi ha, nke bụ na ụfọdụ na-ezonarị ya ezinaụlọ ha ka ha ghara ịmata.

Ụfọdụkwanu esila n'ise anwụrụ ṅụwa ọgwụ ike ndị na-ebute ezigbo nsogbu.

Ụfọdụ oge, ọ bụghị na ndị enyi gị ma ụma kwabanye gị n'ise anwụrụ, ọ bụrụ na ị mụtara ya site n'inọnyere ha maọbụ ilere ha anya.

3) Iri oke nri:

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto,

Nchọpụta Suzanne Higgins na-agụ maka akparamagwa ndị mmadụ ebe nri nọ na mba Briten mere, gosiri na gị na ndị mmadụ na-eri oke nri na-erikọ nri, na ị nwereike iri karịa etu i si eribu

Ị ma na iri oke nri na-emebikwa ahụ? Ngwanụ jụọ ndị oke ibu na-enye nsogbu.

Ụfọdụ ndị buru oke ibu ugbua ebughị ya site na iri naanị nri e siri n'ụlọ ha, ọtụtụ buru ibu site n'ụdịrị ihe ha riri mgbe ha na ndị enyi ha na-eri oke nri zukọtara.

Nke a bụ na ha na ndị enyi ha soro pụọ, ha erie ya ka ọ dịkwa ka ha eso n'ihe a na-arụ.

Ụfọdụ bụkwa ndị ga-achọ iri ihe ọbụla ego ha ga-azụtanwu ma ha na ndị enyi ha soro pụọ, ọtụtụ oge ihe ndị ahụ a na-eri ma ndị enyi gbakọọ anaghị abụ nri dị mma n'ahụ.

Oke nri nwereike ibute ọrịa ndị gụnyere oke ibu nke Bekee kpọrọ "Obesity", ọbara mgbalielu, bulie kọlesterọl gị, mee ka ọ na-ara gị ahụ iku ume ọkachasị mgbe ị na-arahụ ụra.

4) Agbatịghị ahụ:

Ebe foto si, Getty Images

Ndị na-ahụ maka ahụike ekwuola na ịgbatị ahụ bụ ihe mara mma mmadụ ime, mana ọ bụghị mmadụ niile ka ọ na-ekwe omume.

Mana ị ma na ị nwee enyi ndị ịgbatị ahụ na-amasị, ọ gaghị ara ahụ ọ gụọ gị agụụ isonye ha; nke bụ na ị mụtala agwa ọma ahụ.

Ọ bụghịkwa na ọ bụ onye niile ga-anwe mmasị isonye ndị enyi ha emegharị ahụ, mana ọtụtụ ga-ejiri n'ihi akụkọ na ịkpa nkata na ọchị ha na ndị enyi ha na-enwe ma ha nọkọọ, malite iso ha aga agbatị ahụ.

Ọrịa ndị nwereike ịpụta site n'agbatịghị ahụ gụnyere ndọtị akwara, ọrịa obi, mkpọnwụ ahụ, ọbara mgbalielu, ụfọdụ oge ọ na-ebute ọnwụ.

5) Ịchụ nwaanyị maọbụ ịchụ nwoke:

Ị jụọ ụfọdụ ndị na-achụ oke nwaanyị maọbụ ụmụnwaanyị na-eso nwoke,ihe mere ha ji eme ya ugbua, ọtụtụ n'ime ha ga-agwa gị na ha malitere ime ya makana otu enyi ha maọbụ abụọ na-eme ya.

Na nchọpụta MI Norton na ndị otu ya biputara na ngalaba National Institutes of Health nke mba Amerịka, ha kọwara etu ndị mmadụ na-esikarị eṅomi ndị enyi ha n'agwa ọjọọ.

Ụfọdụ malitere ime ya ka ndị enyi ha ghara iji ha mere ihe ọchị, ka ha wepụ ihere n'anya ha.

Ihe ndị ọzọ nnọkọ enyi na enyi na-ebutenwu

Nke a gụnyere arahụghị ezigbo ụra n'abalị ọkachasị ma ha bụrụ ndị na-emekarị mkpagharị n'abalị.

Ọzọ bụ ịkpanyere ndị enyi gị nkata n'ekwentị ọkachasị n'abalị; ị bụrụ onye akụkọ na-adị mma ị gaghị achọzị ịhapụ ha gaa laba ụra.

Ọzọ bụkwa na ị nwereike ịhụ onwe gị ebe ị na-emefusi ego n'ihi ụdịrị enyi ị nwere.

Ọtụtụ oge, ha bụrụ ndị "ịkụ ngwọrị" ụwa na-atọ oke ụtọ, unu ga na-aga ebe a na-emefu ego.

Akụkọ ga-amasị gị:

Ihe nkiri ga-amasị gị:

Aha onyonyo,

E kwesiri ime enyi tupu amalite alụmdinanwunye?