Imo Supreme Court Review: Mkpebi Ụlọikpe Kachasị n'okwu Ihedioha bụ ịkwado ntuliaka wuruwuru

PDP na Emeka Ihedioha

Ebe foto si, PDP/ Emeka Ihedioha

Otu PDP ekwuola na mkpebi Ụlọikpe Kachasị banyere okwu Ihedioha bụ ịdọnyere wuruwuru ntuliaka ukwu.

Ụlọikpe Kachasị nọrọ n'ehihie Tuzde n'Abuja, kụchapụ akwụkwọ Emeka Ihedioha gbagharịrị Hope Uzodinma gbasara oche gọvanọ Imo steeti, si ka ha nyobanyegharịa anya na mkpebi ha nyere.

Mana ndị ọkaipe Ụlọikpe Kachasị kwuru na ha enweghị ikike n'iwu Naijiria ịlaghachi azụ na mkpebi ọbụla ha nyerela.

N'akwụkwọ ozi PDP wepụtara nke odeakwụkwọ mgbasaozi ha bụ Kola Ologbondiyan binyere aka, ha kwuru na ya bụ mkpebi aghọọla ibu arọ nye ụlọikpe na ndị ọkaikpe kpere ya.

Ebe foto si, Emeka Ihedioha/Instagram

Nkọwa foto,

Emeka Ihedioha nọrọ n'oche gọvanọ Imo steeti ọnwa asaa tupu ụlọikpe kachasị chụdaa ya

" Ihe ụlọikpe kachasị mere bụ ịkwụdozike na mmadụ ide mpụtara ntuliaka kama ebumnobi ndị mmadụ kwupụtara na atụmvootu."

Ha gakwara n'ihu jaa ọkaikpe Chima Nweze ike sị na ihe o kwuru bụ ihe mere eme.

Mana otu APC toro ụlọikpe maka mkpebi ha sị na ọ‘bụ ihe na-egosi na ụlọikpe bụ 'ebe a gbata obie ndị ọha mmadụ.'

Cheta na Ihedioha chọrọ ka ụlọikpe kachasị kpegharịa ikpe ha kpeburu nke chụturu ya dịka gọvanọ Imo steeti ma nye Hope Uzodinma mmeri.

Ọkaiwu Ihedioha bụ Kanu Agabi kwuru na ọ bụ nghọgbu ka Uzodinma na ndị ọkaiwu ya ghọgburu ndị ọkaikpe nke mere ha ji kwe na ọ bụ ya meriri na ntuliaka gọvanọ e mere n'Imo steeti n'afọ 2019.

Aha onyonyo,

Imo State Election: Agbawara ndị Imo Steeti aka napụ ha ọchịchị

Mana ọkaiwu Hope Uzodinma sị na arịrịọ Ihedioha na PDP ekwesighi ịbịa ụlọikpe makana mkpebi ụlọikpe kachasị bụ ejacha agwu.

Otu n'ime ndị ọkaikpe ahụ bụ Olukayode Ariwoola kwenyere na 'Supreme Court' agaghị ekwu ọnụ abụọ, ya bụ na ihe ha kwuru, ha ekwuchaala.

Ndị ọkaikpe ise ndị ọzọ kwenyekwara n'ihe Ariwoola kwuru.

Ọkaikpe Chima Nweze ekwenyeghị na ihe ndị ogbo ya kwuru

Mana otu onye n'ime ndị ọkaikpe ahụ aha ya bụ Chima Nweze ekwenyeghị n'ihe ndị otu ya kwuru.

Nweze kwuru na ha kwesịrị ilebagharị anya n'ikpe ahụ ma ọ bụrụ na nke ha kpere mbụ adabachaghị adaba.

Ihe ụmụ Naijiria na-ekwu maka mkpebi lọikpe Kachasị

Onye ọkaiwu bụ Henry Ụlụmma ekwụọla na mkpebi Ụlọikpe Kachasị kpebiri n'akwụkwụọ Ihedioha gbara agbaghị ya gharịị n'ihi na Ụlọikpe Kachasị kpechaa, ikpe ahụ dịzị n'aka Chukwu.

Ụlụmma gwara BBC Igbo sị, "Ọ ga-ara ahụ ịbụpụ asọ racha ya.

"Ya bụrụ na ha nabata ya, ma ndị e kpere ikpe ha na 1980, ma ndị 1990, 2000, ndị mmadụ ga na-abịa ka ha lebanye ya anya."

Mana Ụlụmma tụrụ arịrị na ụdị mkpebi a nwere ike imetụta ka ndị mmadụ si esonye na ntuliaka.

"Ọ bụrụ na-emewe atụcha ntuliaka , ọ bụrụ n'Ụlọikpe Kachasị ga-ebi ya, ọ gaghị aba ụrụ ndị mmadụ ịpụta tụụ ntuliaka."

Pope Francis ebughi coronavirus

Ebe foto si, Reuters

Onyeisi ụka Katọlik bụ Pope Francis ebughi ọrịa coronavirus dịka ndị ntaakụkọ na mba Ịtali si kwuo.

Pope Francis kagburu ọgbakọ Lent nke mbụ n'ọchịchị ya n'ihi oyi mara ya n'izuụka gara aga ma kagbukwaa ịnabata ndị mmadụ.

Nke a mere e ji na-atụ ụjọ ma o butela ọrịa coronavirus mana nyocha gosiri na o bughi ọrịa a.

Ịtali bụ mba ọrịa a kachasị akpa ike na Yurope ebe mmadụ puku abụọ buterela ya ma gbuo mmadụ iri ise na abụọ.

Na mba Izrel

Ebe foto si, AFP

Praịm minista mba Izrel bụ Benjamin Netanyahu enwetela ọtụtụ vootu na ntulaika mba ha mere nke mere o ji na-akarị Benny Gantz na-ama ya aka.

Ntuliaka a ga-abụ nke ugboro atọ ha n'ime otu afọ mana onwebeghi onye nwere vootu ga-ezu ihiwe gọọmentị.

Chelsea na Liverpool na-achịpụ ya

Ebe foto si, Getty Images

Chelsea na Liverpool ga-adọbiri ya n'asọmpi itozuoke n'agba anọ nke ikpeazụ iko FA nke bụ na onye e meriri ọ kwakọrọ ngwongwo ya laarie.

Kepu kepu na-ekwu na Tammy Abraham nke Chelsea nwereike ịgbajọ asọmpi a n'ihi mmerụ ahụ.

Nkeji

Aha nkeananụānụ,

Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Gọvanọ El-Rufai arịọla mgbaghara

Ebe foto si, @GovKaduna

Aka na-achị Kaduna steeti bụ Nasir el-Rufai arịọla ndị bi na obodo ise dị n'okpuru ọchịchi Igabi na Giwa ndi omekome wakporo n'ụbọchị ụka maka na omeghi ihe o kwesiri ime iji hụ na echekwara ha ọfụma.

El-Rufai kwere nkwa na ndi ọrụ nchekwa ga-amalite ịgba mbọ hụ na ha chekwara obodo nille dị na steeti ahu ọfụma.

Ọ sị, "Dịka ndị enyere ikike ịchị obodo ọ bụ n'isi ka ọrụ nchekwa obodo dị. Ọ bụ ihe mere m jiri bịa ịrịọ arịrịo makana echekwaghị ha etu o si kwesi."

El-Rufai gara n'ihu kwuo na ha nwere olileanya na mwakpo a ndị omekome na-eme ga-akwụsị.

O kwukwara na steeti Kaduna anaghị emere ndị omekome ebere maọbụ na-agbaghara ha.

Ọ sị, "Anyi ga-ekpochapu ha ma zigara ha onye kere ha. Ndi ọrụ nchekwa na-achụba ha ime ọhịa ha zoro ma na-egbu ha."

Abụbụọrụ ndị dọkịta n'Enugwu

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto,

Dibia bekee

Gọomentị Enugwu akatọọla abụbụọrụ ndị dọkịta na-agba na steeti ahụ ma kwuo na a ga-ata ha ahụhụ ma onye ọbụla nwụọ n'ụlọọgwụ n'ihi ya.

Ọ bụ odeakwụkwọ ministri ahụike bụ Ifeanyi Agujiobi kwupụtara nke a n'aha gọọmenti.

Ndị dọkịta n'ụlọọgwụ Parklane malitere abubụ ọrụ ụnyaahụ.

Ntuliaka ukwu na mba Amerịka

Ebe foto si, Reuters

Ndị mmadụ na mba Amerịka na-ahazị ịtu vootu n'ụbọchị taa bụ ọkacha mkpa na njem ịhọta onye ga-azọsị Trump ọchịchị.

Steeti iri na anọ ga-eme ntuliaka iji mara onye ga-ebu ọkọlọtọ pati Demokrat gaa na ntuliaka iji họpụta onyeisiala ha n'ọnwa Nọvemba.

N'egwuregwu

Ebe foto si, Getty Images

Arsenal etozuola oke n'agba anọ nke ikpeazụ asọmpi iko FA site n'iji ọkpụ goolu abụọ asataghị otu merie Portsmouth ụnyaahụ.

Mmeria a bụ nke mbụ a na-emeri Portsmouth n'ụlọ ha n'ime asọmpi iri na itoolu ha gbarala.

Nkeji

Aha nkeananụānụ,

Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile