Imo Supreme Court Review: Ụlọikpe kachasị achụọla Ihedioha

Foto Akụkọ Mere Ugbua

Ngalaba nyocha n'Ụlọikpe Kachasị nke Ọkaikpe Ukwu Naịjirịa bụ Tanko Muhammed nọ n'isi ya ekwuola họ ha na mkpebi ha maka ndọrọndọrọ onye ga-abụ gọvanọ Imo steeti bụ...

Cheta na Emeka Ihedioha na pati ya bụ Peoples Democratic Party (PDP) gakwuru ụlọikpe ahụ si ka eleba anya na mkpebi ha wepuru Ihedioha na ọchịchi Imo steeti.

Ụlọikpe ahụ

Arịrịọ PDP na Ihedioha, dịka ọkaiwu ha bụ Kanu Agabi si kwuo bụ na nrụrụaka dị na mkpebi ụlọikpe makana Hope Uzodinma sị na ya meriri na ọgige ntuliaka 388 wetera sọsọ akaebe si ogige ntuliaka 366.

Ọkaiwu Agabi sịkwa na agbakọnye vootu si ogige vootu 388 ahụ ọnuọgụgu vootu ndị tozuru ịtu vootu na ntuliaka ahụ kwesiri ịtụ.

Mana ọkaiwu Hope Uzodinma sị na arịrịọ Ihedioha na PDP ekwesighi ịbịa ụlọikpe makana mkpebi ụlọikpe kachasị bụ ejacha agwu.