Chelsea vs Liverpool: Chelsea akwọriela Liverpool kpọọ ha n'imi ka ụtaba

Ndị Chelsea na-aṅụrị ọṅụ

Ebe foto si, Getty Images

Ndị Chelsea jị ụtali igwe pịakaa Liverpool ahụ oge ha abụọ zutere n'asọmpi FA cup n'abalị Wenezde.

Goolu abụọ asataghị asata ka ha ji chụlaa Liverpool.

Nkata ka Liverpool gaara iji buru goolu, mana ndị Chelsea riri ọtụtụ goolu ha kaara inye.

William bu ụzọ nye goolu na nkeji 13, ebe Ross Barkley nyere goolu nke ya na agba nke abụọ.

Ebe foto si, Getty Images

A ga-ama onye bụ 'azụ eru ala' n'etiti Chelsea na Liverpool ka ha ga-ezute n'asọmpi Iko FA n'iji tozuoke n'agba anọ nke ikpeazụ n'elekere asatọ nke abalị a.

Obi adịla na mbụ koro ọtụtụ ndị nkwado ha n'elu maka na ọ bụ onye e meriri ọ kwakọrọ ngwonwo ya laarie.

Mana dịka a sị na anaghị asọ mgbagbu ghara ọgụ', onye ọbụla nwere olileanya na otu ọ na-akwado ga-emeri.

Ndị a ga-achọ achọ n'asọmpi a

Ebe foto si, Getty Images

A bịa na Chelsea, ndị dịka Tammy Abraham, Ngolo Kante na Christian Pulisic agaghị agba bọọlụ ebe o dobeghi anya ma Andreas Christensen ọ ga-agba.

Na Liverpool ndị dịka Jordan Henderson, Naby Keita, Xherdan Shaqiri na Nathaniel Clyne agaghị eso gbaa mana Joe Gomez na James Milner ga-apụta n'ọgbọ.

Nke a mere ọtụtụ ndị ji eche na Liverpool nwereike imeri Chelsea tinyekwara na ha bụ ndị mbụ n'ogogo tebụlụ Premier League.

Ugboro ole Chelsea na Liverpool na-ezute onwe ha n'asọmpi FA

Ebe foto si, Getty Images

Nke a ga-abụ nke mbụ otu abụọ a ga-ezute ibe ha kamgbe ha zutechara n'agba ikpeazụ n'afọ 2012 mgbe Chelsea ji ọkpu goolu abụọ asatara otu merie.

Chelsea emeriela Liverpool ugboro ise n'ime asọmpi FA asaa ha zuterela.

Mana asọmpi a ga-abụ ugboro atọ ha ga-ezute onwe ha n'afọ a.

Liverpool emeriela Chelsea ugboro abụọ gụnyere asọmpi Uefa Super Cup.

Ajụjụ a na-ajụ bụ ma Liverpool ọ ga-ama afọ n'ala ọzọ dịka Watford gbachara ha ọkpụ goolu atọ n'ụbọchị anọ gara aga?

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Ihe nkiri ga-amasị gị:

Aha onyonyo,

Gịnị bụ 'Super Tuesday' na ihe mere o jiri dị mkpa?