Adams Oshiomole etinyela akwụkwọ ịgbagha ikpe chụpụrụ ya n'ọkwa

Adams Oshiomole

Ebe foto si, Google

Adams Oshiomole bụ onye ụlọikpe chụpụrụ n'ọkwa onyeisioche APC sị na o tinyela akwụkwọ ịgbagha ikpe a n'ụlọikpe mkpegharị.

Nke a dị n'ozi ọnụ na-ekwuru Oshiomole bụ Simon Ebegbulem zitere BBC na ha etinyela akwụkwọ n'ụlọikpe mkpegharị.

Ebegbulem sị na etu a ikpe a ka dị n'ụlọikpe mkpegharị na Oshiomole ka bụ onyeisioche pati APC.

N'agbanyeghi nke pati APC ewepụtala aha ndịisi ọhụrụ otu ha a kpọrọ 'National Working Commitee'.

Ndị a gụnyere Waziri Bulama ga-arụ ọrụ dịka odeakwụkwọ, Abiola Ajimobi osote onyeisioche mpaghara ndịda na Paul Chukwuma dịka onye nchịkọta ego

Ụlọikpe ukwu dị n'Abuja enyela iwu ga-akwụsịtụ Adams Oshiomole igosi onwe ya dịka onyeisi All Progressive Congress

Ọkaikpe Danlami Senchi nọ n'ụbọchị Wenezde nye iwu a ruo mgbe ọ ga-ekpebi ikpe n'akwụkwọ a gbara ya nke sị ka e wepụ ya kpam kpam n'ọkwa ahụ.

Mkpebi a na-abịa site n'akwụkwọ Mustafa Salihu bụ osote onyeisioche APC na mpaghara ugwu gbara Oshiomole n'ụbọchị 16 ọnwa Jenụwarị.

Ndị ọzọ aha ha dị n'akwụkwọ Salihu gbara gụnyere pati APC, onyeisi ndị uweojii nakwa ndị ọrụ nchekwa DSS.

Amerịka etinyela nde dọla asaa ($7m) n'isi Abubakar Shekau

Ebe foto si, AFP

Ngalaba gọọmentị Amerịka a kpọrọ 'United States Department of State' etinyela nde dọla asaa n'isi onye ndu Boko Haram bụ Abubakar Shekau.

Ha kwere nkwa ịkwụ onye ọbụla gbara ama ebe a ga-anwụchi Abubakar Shekau ego a.

Nke a dị n'ozi ha wepụtara n'akara twitter ha.

Itali na-atule ịgbachi ụlọakwụkwọ ha n'ihi coronavirus

Ebe foto si, Getty Images

Dịka ọrịa coronavirus na-abawanye na mba Ịtali, gọọmentị ha na-atụle ịgbachi ụlọakwụkwọ Sekọndịrị na Mahadum niile dị na mba ahụ.

Minista na-ahụ maka agụmaakwụkwọ bụ Lucia Azzolina sị na ha emebeghi mkpebi banyere nke a dịka ọtụtụ ndị ntaakụkọ si ekwu.

N'otu aka ahụ mba Izrel agwala ọtụtụ ndị gara asọmpi bọọlụ n'obodo Tel Aviv ka ha dosa onwe ha n'ọnọdụ a kpọrọ "self quarantine" na Bekee.

Nke a mere dịka otu nwata gara asọmpị ahụ butere ya bụ ọrịa.

Joe Biden ji ọkọlọtọ ndị Demokratz

Ebe foto si, Getty Images

Onye bụbụ osote onyeisiala mba Amerịka bụ Joe Biden adọkarala mmeri na steeti itoolu n'ime iri na anọ emere ntuliaka ime ụlọ iji họpụta onye ga-ebu ọkọlọtọ Demokrat zọọ ọkwa onyeisiala n'afọ 2020.

Bernie Sanders nwetere mmeri na steeti anọ mana njem ka tele aka na ndọrọndọrọ ọchịchị nke ọkpọ a.

Ka ọ kwụ ugbua, Biden nweela mmeri na steeti itoolu ka Sanders nwere na ise.

Ndọrọndọrọ ka fọro dịka ha na-achọ inwete ndi nkwado 1991 ga-abu na onye nwere ya meriri ntuliaka ime ụlo a.

Ọ bụ ndị nkwado nke Bekee kpọrọ "delegates" karịrị 1300 ka na-erite na ntuliaka "Super Tuesday".

Abụbọọrụ ndị dọkịta n'ụlọọgwụ Enugwu ka na-aga n'ihu

Abụbọọrụ ndị dọkịta n' ụlọọgwụ Esut Teaching Hospital Parklane abaala ụbọchị abụọ ụbọchị Tuzde.

Ndị dọkịta ahụ a kpọrọ 'Resident doctors' na bekee kwuru na iwe ha bụ na anaghị akwụ ha ụgwọ ọnwa ziri ezi ya na orubere ja ndị ọzọ nke mere ha jiri bagide abụbọọrụ ịdọ aka na ntị nke ụbọchị ise.

Mgbe BBC batara n'ụlọgwụ Parklane, ọtụtụ ndị ahụ na-aya kwara arịrị na ndị dọkịta na else ndị mmadụ ahụ pere mpe n'ihi ya bụ abụbọọrụ.

Otu nwaanyi bụ Benedicta Ugwu gwara BBC na ka mgbe ụnyịahụ ka ya biwara ụlọ ọgwụ mana rule tata ya ahụbeghi dọkịta.

Ụfọdụ ebe dị ka 'Accident and Emergency' bụ ebe ndị 'Resident doctor' na- eju eju bụ naani dọkịta ndị isi ọrụ nọ na ya.

Onye dọkịta bụ 'Consultant' gwara anyị na ha bụ ndị isi jisiri ike na-arụ ya bụ ọrụ sọsọ ha, ma yọọ gọmenti ka otinye anya na ihe ndị out ha na ana ha ka were nwee ikebido ọrụ ọzọ.

Permanent Secretary na ministri nke ahụike n'Enugwu adịla na mbụ katọọ abụbọ ọrụ ndị dọkịta ahụ.

Ministri ahụ kwuru na ha ekwesighị ịgba abụbọ ọrụ ugbua a na-alụ ọgụ Lassa Fever nakwa corona virus tinyekwara na ha gara ya bụ ihe na mberede na agwaghị gọọmenti n'oge.

Ministry ahụ kwuziri na onye ọbụla nwụrụ na Parklane n'ihi abụbọ ọrụa, na ọbara ya ga-adị ndị 'resident doctor' n'isi.

Otu nwoke asụgbuola nwanne ya nwoke nọ n'ụra maka okwu ala

Ebe foto si, NPF/Imo state

Ndị uweojii n'Imo steeti ejidela otu nwoke aha ya bụ Chibuzo Nwagbara si obodo Ụmụakpa dị n'okpuru ọchịchị Ọlụ n'Imo steeti maka ebubo na o ji mma sugbuo nwanne ya nwoke nọ n'ụra maka esemokwu ala.

Ndị uweojii nwụchịrị NWagbara na obodo Alaike Ụmụoyota nke dị n'Ụmụahịa Abia steeti.

Nyọcha ndị uweojii gosiri na ọteela ụmụ nwanne abụọ a bidoro ịse okwu maka ala.

Ndị uweojii sị kwa na ndị ntoroobia obodo ahụ jiri iwe gbaa ụlọ Chibụzo Nwagbara ọkụ.

Onye ọzọ egwuru maka okwu ala

Ọ bụ ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii nke Imo steeti bụ Godson Orlando Ikeokwu kọwapụtara nke a n'akwụkwọ ozi o depụtara ma sịkwa na-etigburu otu nwaanyị aha ha bụ Rita Dike si obodo Umueze Amuzi maka okwu ala ọzọ.

Ọ bụ otu nwaanyị aha ya bụ Ọdịnaka Dike kpesara ndị uweojii na otu nwoke aha ya bụ Chinedu Oduele eji "Bishop" mara na Onyebuchi Oduele eji "Papa" mara tigburu nne ya bụ Rita Dike gbara afọ iri anọ na otu.

Ndị uweojii sị na ọ bụ dịka Rita Dike tiri Boniface Oduele ihe ka ha na-ese okwu ala.

Nke a mere ka Oduele kpọo ụmụ ya nwoke abụọ ma si ha ka ha lọta. Mgbe ha lọtara, o zipụrụ ha ka ha ga-tie Rita Dike ihe ị jị bọkwara ihe ọ si na Dike tiri ya.

Ha mere ka nna ha siri kwuo mana Dike siri na ihe ha tiri ya banye n'ọnwụ.

Ndị uweojii anwụchiela Boniface Oduele ebe ụmụ ya nwoke abụo a ka nọ n'ọsọ.

Ikpe mmekọ nwoke na nwoke

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto,

Ihe onyonyo a na-egosi ụmụ nwoke gbagara Kenya maka mkpagbu na ha na-enwe mmekọ nwoke na nwoke

Ụlọikpe dị na Legọs eyigharịala ikpe ụmụnwoke iri anọ na asaa eboro ebubo idina nwoke ibe ha dịka nanị otu onye biara gbaa akaebe.

Nke bụ ụgboro asaa ka a na-eyigharị ya bụ ikpe kamgbe anwụchịrị ndị a n'ọnwa Ọgọọst 2018.

Ọ bụzị na Aprel 2020 ka a ga-ekpezi ya bụ ikpe.

N'Ofesi

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto,

Onye nchekwa na Senegal

Ngalaba na-ahụ maka ahụike nke mba Senigal ekwuola na ndị bu ọrịa Coronavirus na maba ahu di mmadu abuọ

Nke a na-abịa ka otu nwoke agbara afọ iri asatọ si mba France buru ọrịa CoronaVirus bata mba ahụ.

Akụkọ ga-amasị gị