Africa's Top Economy: Naijịrịa o kwesiri ịbụ mba akụnaụba ya kachasị n'Afrịka?

Ụmụnwaanyị nọ n'ahịa

Ebe foto si, Getty Images

Naijirịa alaghachila dịka mba kacha nwee akụnaụba n'Afrịka.

Dịka akụkọ na-ewu, kedu ihe nke a pụtara?

BBC jụrụ ọnụ na-ekwuchitere ụlọakụ kachasị na Naijirịa (CBN) bụ Isaac Okorafor ka ọ kọwatụrụ anyị ihe nke a pụtara.

Okorafor kwuru sị na Naijirịa kwesiri ị bụ mba akụnaụba ha kachasị n'Afrịka kama ọ bụ etu ụfọdụ ihe siri mee mere ka Naijirịa ji gbada.

O kwuru na ọ bụ ọtanisi dị na Saut Afrịka mere ka Naijirịa ji lọghachị dịka onye mbụ maka akụnụba n'Afrịka.

O kwukwara sị na obi adịghị Naijirịa mma na Saut Afrịka abanyela "Recession" kama ọ na-egosi na ndị Naijirịa rusie ọrụ ike na Naijirịa ga-akawanye mma.

Dịka o sị kwuo "Ihe dị mkpa ụgbua bụ ka ndị Naijirịa gbasie mbo ike nke ga-eme ka akụnụba Naijirịa sie ike ma agbagote".

Okorafọ kwuru na CBN nwere atụmatụ ha ji akwalite ndị ọrụ na arụpụta ihe dị iche iche ga-ebulite akụnaụba Naijirịa.

Atụmatụ a nke ha kpọrọ "PAVE" (Produce, Add value and Export) ga-enyere ndị na-arụ ọrụ ubi na ndị na-arụpụta ihe aka.

Etu ọkammụta maka Akụnaụba ụwa sị kọwaa ya

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto,

Ndị ọrụ aja na Legọs

Ọkanmụta n'ihe gbasara akụnaụba mba bụ Uche Ụwaleke kwuru sị na ị bụ onye nke mbụ n'Afrịka maka akụnaụba bụ maka ihe a kpọrọ GDP.

Uwaleke kọwara na GDP bụ nchịkọta ịchụ ego na nrụpụta n'otu ebe.

Ọ kọwara na Naijirịa ị bụ mba kacha nwee akụnụba n'Afrịka bụ maka na Naijirịa nwere ọtụtụ mmadụ.

O kwukwara sị "ihe kacha dị mkpa bụ etu ndị mmadụ si ebi, ahuike, ụlọ obibi, agụmakwụkwọ, ị nwe ọkụ latrik na ezigbo mmiri ọṅụṅụ kacha mkpa karịa nnụkwụ GDP."

Uwaleke sị kwa na mba Saụt Afrịka nwere ike ịpụta na ọtanisi ọsịsọ karịa Naijirịa n'ihi na ha nwere ihe eji edozi obodo karịa Naijirịa.

O kwukwara sị' "enweghị nchekwa na-eme ka Naijirịa hara irite elele dịka mba kacha nwe akụnụba n'afrịka".

Akụkọ ga-amasị gị