Hope Uzodinma: Aga m ebido ịgbasa oziọma APC n'Ọwụwa-anyanwụ

Hope Uzodinma

Ebe foto si, Hope Uzodinma/Facebook

Dịka o merichara n'Ụlọikpe Kachasị n'ikpe ya na Emeka Ihedioha, Gọvanọ Imo steeti bụ Hope Ụzọdinma ekwuola na ọrụ ya ugbua bụ idozi ihe ndị mebiri emebi na steeti ahụ.

O kwuru na ya achọghị ka ya na onye ọbụla nwee esemokwu kama ọ bụ ịrụrụ ndị Imo ọrụ.

Uzodinma, onye kwuru nke a n'ehihie Wenezde na mkparịtaụka ya na ụlọakụkọ Channels TV, gara n'ihu kwuo na ya ga-ebido ịgbasa oziọma APC.

Lee ihe ndị ọzọ o kwuru:

  • "Ihe atọ m ga-agbado ụkwụ na ya (ịrụ ọrụ n'imo) bụ nrụgharị (Rehabilitation), mweghachi (recovery), na nhazigharị(Restructuring)"
  • APC bụ pati bụ ebe anọ ugbua.Ọ bụ pati ji ọgbọ n'etiti
  • Imo steeti abụrụla steeti nwere otu pati
  • Aga m ebido mgbasa oziọma ndọrọndọrọ ọchịchị( maka APC)
  • Enweghị m ohere ịlụso onye ọbụla ọgụ kama abịara m ịrụrụ ndị Imo ọrụ.
  • "Akwụọla m ụgwọọnwa abụọ(kemgbe m banyere). M ga-elebanye ụgwọọnwa ndịọrụ nke gọọmentị gara aga akwụbeghi."
  • Na ya ga-elebanye n'okwu akụ gọọmenti e zuru ezu ma napụta ihe ndị furu efu.
  • Gbasara nchụda ụlọikpe chụdara Oshiohmole, Uzodinma kwuru sị: "Amaghị m ka ụlọikpe ga-esi wepụ onyeisioche. Aghọtabeghị m ya, mgbe m ghọtara ya ka m ga-ekwu okwu."

Akụkọ ga-amasị:

Ihe nkiri ga-amasị gị:

Aha onyonyo,

Security in Nigeria: Ihe Buhari kwesịrị iji achụ ndịisi nchekwa na Naịjirịa