Muhammadu Buhari: Ndị ụlọomeiwu akwadola ka Buhari bite ego dị ijeri $22.7

Akụkọ ndị dị mkpa taa:

Ndị ụlọomeiwu

Ebe foto si, Nigerian Senate

Ndị ụlọomeiwu akwadola ka Buhari bite ego dị ijeri $22.7

Ndị ụlọomeiwu etinyela aka n'akwụkwọ ịkwado ka onyeisiala Buhari bite ego dị ijeri dọla iri abụọ na abụọ na ụma asaa.

Ha mere nke a n'ụbọchị Tọzde na ngwụcha nrụrịtaụka dapụtara n'etiti ha banyere ego ahụ.

Onyeisi ụlọomeiwu bụ Ahmed Lawan ṅụrụ iyi na a ga-eji ego mepụta ihe a na-ahụ anya.

Mana maka ego mbite a ka #Buhari ji ewu ugbua na twitter.

Agbakọ ya ọ pụtara 829, 685, 000, 000, 000 na naịra

Bishop Okpaleke abụrụla onyeisi Katọlik na Dayosisi Ekwulobia

Ebe foto si, Catholic Bishops Conference of Nigeria

Onyeisi ụka Katọlik n'ụwa bụ Pope Francis emeela Bishọp Peter Ebere Okpaleke onyeisi dayosisi Ekwulobia bụ nke e mepere ọhụrụ.

Pope Francis nyere iwu a n'ụbọchị Tọzde dịka a na-ekwupụta ụfọdụ ndị e nyere ọkwa ọhụrụ n'ime ụka Katọlik.

Bishọp Okpaleke ga-abụ Bishọp mbụ nke dayosisi ọhụrụ a e kewapụtara na mpaghara dayosisi Ọka.

Cheta na ndị Ahiara Diocese dị na Mbaise, Imo steeti jụrụ ịnabata Bishọp Okpaleke dịka onyeisi ha n'afọ 2013 bụ nke butere ọgbaghara mana o mechara si ebe ahụ pụọ.

A mụrụ Okpaleke n'ụbọchị 1 Maachị afọ 1963, chie ya ya ụkọchukwu n'ụbọchị 22 ọnwa Ọgọstụ afọ 1992.

E chiri ya Bishop n'ụbọchị 7 Disemba afọ 2012. Mee ya Bishọp onyeisi Dayọsisi Ahiara n'ụbọchị 21 Mee afọ 2013.

R. Kelly sị na aka ya dị ọcha n'ebubo mmetọ ọhụrụ

Ebe foto si, Getty Images

Otiegwu a ma ama na mba Amerịka bụ R.Kelly ekwuola na aka ya dị ọcha n'ebubo na o metọrọ ụmụaka iri na atọ na Chicago gụnyere ebubo onye ọhụru.

Onye nke ọhụrụ a kpọrọ 'Minor Six' so na ebubo ọ hụụ ahụ.

Ebubo ọhụrụ e boro R.Kelly, kwuru sị na ya na 'Minor Six' nakwa ụmụaka anọ ndị ọzọ dị erubeghị afọ 18 nwere mmetụta ahụ nakwa mmekọrịta."

ọkaikpe highaziri ike ahụ ka ọ dịba n'abalị iri na atọ nke ọnwa Óktoba nke bụ ka ọnwa isii e jiburu kwuo na a ga-ebi ikpe ahú gachara.

Cheta na a nwụchiri R.Kelly na ọnwa July afọ 2019 ma kpụpụ ya ụlọikpe maka ebubo imetọ ụmụaka.

Ebe foto si, Google

Otu ụlọikpe dị na Kano nke ọkaikpe Lewis-Allagoa nọ n'isi ya akagbuola nchutu a chuturu Adams Oshiomole dịka onyeisioche APC.

ọkaipe Allagoa nyere iwu ka ụlọọrụ nchekwa DSS ka nye Oshiomole nchekwa ka o nwee ike gaa malite ọrụ n'ụlọọrụ ya.

Cheta na ọkaikpe Danlami Senchi nke ụlọikpe dị n'Abuja nọrọ n'ụbọchị Wenezde nye iwu ka Oshiomole kwụsị igosi onwe ya dịka onyeisioche APC.

Ọkaikpe Senchi sị na nke a ga-adị ruo mgbe a chabiri ikpe dị n'isi ya n'ụbọchị 7 na 8 nke ọnwa Epụrel.

Ihe ndị mmadụ na-ekwu maka nchutu Oshiomole

Ebe foto si, Adams Oshiomhole facebook

Ndị mmadụ na-etinye ọnụ n'okwu maka nkwụsị ụlọikpe kwụsịri Adams Oshimole dịka onyeisioche otu APC.

Otu onye kwupụtara owku maka nkwụsi a bụ Gọvanọ Edo steeti bụ Godwin Obaseki dịka o kwuru sị na ụbọchị anọ nke ọnwa Machị 2020 bụ ụbọchị ọma nye ndị Edo steeti.

Obaseki kwukwara na ikpe a ụlọikpe kpere ga-enye ohere ka udo bata Edo steeti ma sị kwa na nke a na-egosi na onweghị onye bụ Chineke ibe ya.

Ihe ndị mmadụ na-ekwu

AyeMojubar kwuru sị "Oshimole alahachịla ebe o si bido".

Oloye Ayo Gbadebo sị "Unụ echefu kwala na okaikpe Adams Oshimole ka akọwa etu o siri ghọta mpụta ikpe a. ọ gaghị ekwe o"

EjikeBenjamin kwuru sị " Oshimole rubere ihe ụlọikpe kpere, a ga m enye mmadu ise edemede a masịrị puku naira iri"

Khal BUSSIE sị na atụmatụ maka ntụlịaka 2023 ebidola.

Legọs na CoronaVirus

Ebe foto si, Getty Images

Kọmịshọna na-ahụ maka ahuike na Legọs steeti bụ Akin Abayomi ekwuola na ha ka na-achọ mmadụ iri atọ na ise bi na Legọs ha na nwoke onye mba Itali bụtere Coronavirus na Legọs bakọrọ otu ụgbọelu.

O kwuru na nke a bụ maka na ha enyeghị ihe mmata zuru oke mgbe ha na nwoke ahụ bakọrọ ụgbọelu butere ha na Legọs.

Enugwu steeti

Ebe foto si, Facebook/Adoration Ministry Enugu Nigeria

Nkọwa foto,

Ụkọchukwu Ejike Mbaka

Ụkọchukwu na-elekọta Adọration ministry n'Enugwu bụ Fada Mbaka ekwuola na mmeri niile Hope Uzodinma na-enweta n'ụlọ ikpe si na-aka chukwu.

O kwukwara na Uzodimma ga-ewebata ụloọrụ ga-enye ndị Imo puku narị anọ ọrụ ma sị kwa na o ji 'security vote' ya were kwụọ ụgwọ ọnwa n'Imo steeti.

N'Ofesi

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto,

Facebook ewepụtala onwe ha ibuso agha maka akụkọ ụgha gbasara Coronavirus

N'ofesi, ndị Facebook emechiela ụlọọrụ ha dị na Seattle dịka otu onye na-arụrụ ha ọrụ bụ ọrịa Covid-19.

Facebook kwuru na ha ga-emechi ụloọrụ ha ruo ụbọchị itoolu nke ọnwa March ma rịọ ndị ọrụ ha ka ha si n'ụlọ na-arụ ọrụ ha.

Obodo Kalifonịa dị n'Amerịka

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto,

Onyeisi obodo Eric Garcetti

Obodo Kalịfonịa nke dị na Amerịka etinyela onwe ha na ọnọdụ gbatagbata dịka coronavirus gburula mmadụ iri na otu na Amerịka.

Ọ bụ otu nwoke gbara afọ iri asaa na otu nwụrụ na Kalịfonia soro ụgbọ mmịri gaa njem nwụrụ na Kalịfonịa maka coronavirus.

Dịka ọ dị ugbua, mmadụ iri na ise ebutela ya bụ ọrịa na mba Amerịka.