Coronavirus: Kedụ ihe ndị mmadụ na-azụ edebe maka adịghị ama ama?

Ndị mmadụ na-azụkọba ihe dị mkpa dịka ọrịa coronavirus na-efesa

Ebe foto si, Getty Images

Ihe karịrị mmadụ 95,000 na mba 79 dị n'ụwa bụ ndị buterela ọrịa coronavirus.

Dịka ọrịa a na-ekesa n'ụwa niile, egwu ji ndị mmadụ nke mere na ọtụtụ na-azụkọba ihe maka ọ gbajuo dọrọ ma egwu bụrụ onye nọrọ be ya.

Mana kedụ ihe ndị mmadụ na-azụ, kedụ ihe na-akọzị ụkọ ugbua?

Lee ụfọdụ n'ime ha:

Ịchafụ mkpuchi ihu

Ebe foto si, EPA

Nkọwa foto,

E nwere ụkọ ihe mkpuchi imi naz mba Thailand na South Korea

N'agbanyeghị na o zughi oke na mgbochi ọrịa a, ịchafụ mkpuchi ihu bụ ihe a na-achọsike dịka akara ọkụ n'ọdọahịa, ọdọọgwụ nakwa n'Amazon kemgbe ọrịa Coronavirus bidoro.

Miguel Luiz Gricheno bụ onyeisi ụlọọrụ mba Brazil na-emepụta ịchafụ mkpuchi ihu gwara ụlọntaakụkọ Reuters na, "Ndị mmadụ na-achọ ịchafụ mkpuchi ihu ka a na-achọ ọlaedo."

Ụlọọrụ ya ji mmaji abụọ welite aka n'imepụta ịchafụ mkpuchi ihu dịka ndị mmadụ na-achọ ya.

Nwa mpekere ngwa ahụike abụrụla ihe mba dị icheiche na-achọ achọ maka ndị ọrụ ahụike - ndị nwereike ibute ọrịa ahụ oge ha na-elekọta ndị ọrịa.

Otu Ahụike mbaụwa bụ WHO kwuru na ndị ọrụ ahụike nwere mkpa ịchafụ mkpuchi ihu ruru nde 89, na mkpunaka (gloves) dị nde 76 nakwa igegbe anya dị otu nde na ụma isii maka nnyocha ahụ.

Onyeisi WHO bụ Tedros Adhanom Ghebreyesus sị, "Ụkọ mere na ndị dọkịta, nọọsụ nakwa ndị ọrụ ahụike enweghi ngwa ọrụ zuru oke maka ọrụ ha."

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto,

WHO na-ekwu na e nwere mkpa ịchafụ mkpụchi ihu dị nde 89 maka igbochi ọrịa coronavirus

Na mba South Korea, bụ ebe nke abụọ kachasị nwe ọrịa coronavirus, gọọmenti kwuru na ha na-amachi ibupu ịchafụ mkpuchi ihu na mba ndị ọzọ, iwelite mmepụta ya nakwa ịhụ na onye ọbụla anaghị azụkarịa ole ga-ezuru ya izuụka abụọ.

Onyeisiala mba ahụ bụ Moon Jae-in arịọla mgbaghara maka ụkọ ịchafụ mkpuchi ihu ma gwa ụlọọrụ na-emepụta ya na gọọmenti ga-amapụta ebe ndokwa ya - ka ha ghara ịtụ uche maka imepụta ya ebe ọ gafere oke.

Na mba Thailand, ebe enwere mgbaka ahụ maka ụkọ ịchafụ mkpuchi ihu, gọọmenti hiwere kọmitii lebara anya ịmata ma a na-ebupu ya na nzuzo maọbụ na-ere ya oke ọnụahịa n'azụ ụlọ.

Onyeisiala mba France bụ Emmanuel Macron sị na ha ga-enye ọrụ ahụike nakwa ndị bu ọrịa coronavirus.

Mmanụ mgbochi ọrịa(Hand sanitisers)

Nkọwa foto,

Mmanụ e ji egbochi mgbochi nje ifesa bụ ihe a na-achọ ka akara ọkụ dịka ndị mmadụ na-agba mbọ igbochi mfesa ọrịa

Ọnụahịa ịchafụ mkpuchi ihu nakwa mmanụ e ji egbochi mfesa nje arịala n'elụ oji dịka ọ na-adazị mmaji abụọ ihe a na-azụ ya na mbụ na Naijiria.

Na mba France, gọọmenti na-agba mbọ ibu agha mmegide ndị na-ere ahịa ngwa nchekwa ahụike n'azụ ụlọ

Minista na-ahụ maka ego na mba ahụ kwuru na igwe Twitter ya sị "Ejikerela m iji iwu tinye anya na-ego ole a na-ere ịchafụ mkpuchi ihu nakwa mmanụ mgbochi nje ma oke ọchịchọ karịa."

Na mba Pakistan, gọọmenti dọọ ndị ahịa aka na ntị maka iji oke ọchịchọ soo ngwa ahịa nchekwa ahụike nakwa ọgwụ.

Mịnịsta ahụike mba Iran kwuru na ụfọdụ ndị ahịa na-akpachi ihe ha nwere ma na-ere ya oke ọnụahịa.

Dịka ụlọakwụkwọ akụkọ mba Russia bụ Vedomosti, sị kwuo, ndị na-achọ mmanụ mgbochi, ncha nakwa akwụkwọ mposi n'ụlọahịa ọgwụ nakwa ahịa ịntanet n'ọnwa gara aga.

Akwụkwọ mposi

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto,

Akwụkwọ mposi kọrọ ụkọ na ọdọahịa dị na mba Australia

Dịka mmadụ ịnọrọ na be ya, sị n'ụlọ na-arụ ọrụ mabụ hapụ ịga akwụkwọ na-agbanyewanye mgbọrọgwụ,ndị mmadụ na-azụkọsị ihde dị ha mkpa maka adịghị ama ama.

Na mba Singapore, Japan na Hong Kong, e nwere ụkọ akwụkwọ mposi.

Na mba Australia, ike e ji achụ akwụkwọ mposi mere ka ọdọahịa tọgbọọ chakoo na egbughị oge nke n'otu ọdọahịa nyere iwu mmadụ azụla karịa akpa anọ akwụkwọ mposi.

Ọ bụghị naanị akwụkwọ mposi ka a na-achọzi achọ ugbua kama akwụkwụ a na-awanye ụmụaka nakwa ara ehi sokwa.

Ngwa nri

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto,

Ụkọ nrị adịghị na mba Briten mana o siri ike ndị tụrụ ahịa nri na ịntanet inweta ya n'ọnụ ama ha

N'afọ gara aga, pasent 45 ndị na-azụ ahịa na mba Briten zụrụ nri n'intanet nke na ndị nwere ọdọahịa (supermarket) na-adọ aka na ntị na ọ ga-aka njọ n'afọ dịka ọrịa coronavirus na-aga n'ihu.

onye chọọ ka ebutere ya ngwa nrị ọ zụụ ka eji n'oge kwuo ihe ọ chọrọ abali ole na ole tupu oge ọ ga-adị ya mkpa mana ha kwuru na e nweghị ụkọ ọbụla.

Mkpụrụọgwụ

Ebe foto si, Getty Images

Mba India bụ ha na-emepụta pasent 20 ọgwụ a na-aṅụ na mbaụwa gụnyere ọgwụ paracetamol bụ ọgwụ e jikarị agwọ ahụmgbu kwuru na ha ga-ewetu aka n'ọgwụ ha na-ebupu na mba ha - maka na ọ bụ Chaina ka ha si enweta oke abụọ n'ime oke atọ n'akọọngwa ha ji arụ ọgwụ ndị a.

Mana gọọmenti India kwuru na egwu adịghị na ọgwụ ga-anọru ọnwa atọ.

Nchọpụta BBC mere gosiri na enwewala ụkọ ọgwụ na Naijiria na mba Kenya.

Ọnụahịa ọgwụ gbaliri mmaji atọ na Kenya ,ebe ụlọakụkọ Daily Trust gbara ama na ụka ọgwụ ga-ebido na Naijiria maka mkpebi a India mere.