Olusegun Obasanjo: Ihe isii mere ndị Igbo ejighi echefu Obasanjo

Obsanjo na Ngozi Okonjo-Iweala

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto,

Obsanjo na Ngozi Okonjo-Iweala

Aha ọtụtụ mmadụ na Naịjirịa kpụ n'ọnụ taa bụ Olusegun Obasanjo bụ aka chịburu Naijiria malite n'afọ 1999 ruo 2007.

Nke a bụ maka na taa bụ abalị ise nke ọnwa Maachị ka ọ gbara afọ iri asatọ na atọ.

Ụfọdụ na-ekwu na Obasanjo bu dike, ebe ndị ọzọ na-ekwu na o meghị ọfụma.

Lee ihe ụfọdụ mere ọtụtụ ndị mmadụ, ọkachasị ndị Igbo ga-eji na-echeta Obasanjọ oge ọbụla.

1) Ịhafe ọchịchị n'aka ndị nkịtị

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto,

Obasanjo chịrị Naịjirịa dịka onyeagha ma hafee ọchịchị n'aka ndị nkịtị

N'afọ 1976, oge onyeagha aha ya bụ Dimka gburu onyeisiala oge ahụ bụ Murtala Mohammed, a họpụtara Obasanjo ka ọ bụrụ onyeisiala.

Mana ka afọ atọ gachara, n'afọ 1979, Obasanjo haziri ntuliaka ma were ọchịchị hafee n'aka ndị nkịtị.

Nke a nyere ya ihu ọma n'akụkụ ụwa niile.

2) Ọbịbịa nke abụọ

Ọbasanjọ bụ onye mbụ debara aha ya n'akwụkwọ akụkọ dịka onye mbụ chịrị Naịjirịa ugboro abụọ, dịka onyeagha na dịka onye nkịtị.

Ọbịbịa nke abụọ ya pụrụ iche n'ihi na Onyeisiala oge ahụ bụ Sani Abacha mara ya ikpe ọnwụ ma tụọ ya mkpọrọ.

Ọ bụ na mkpọrọ ahụ ka o si pụta oge Abacha nwụchara, zọọ ọkwa onyeisiala ma merie.

3) Itinye ndị ma ihe ha na-eme n'ọkwa dị elu

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto,

Obasanjo na Ngozi Okonjo-Iweala

Ọtụtụ gbara ama na ọchịchị Obasanjo bụ oge ndị ma ihe ekwe na-akụ nọ n'ọkwa kwesịrị ha na Naịjirịa.

Chidi Lemchi, onye ọkachamara n'okwu akụnaụba, kwuru na Obasanjo tinyere ndị kwesịrị ekwesị n'ọkwa.

Lemchi kwuru sị: "Ndị dịka Ngozi Okonjo-Iweala, Oby Ezekwesili, Charles Soludo, Ojo Maduekwe, na ndị ọzọ, bụ Obasanjo nyere ha ọkwa n'oge ahụ."

"Obasanjo achọghị ịma mpaghara onye si na ya pụta, onye ọbụla ma ọrụ ka ọ na-enye ọrụ ahụ."

4) Ụlọọrụ gbara ọkpụrụkpụ o hibere

Lemchi kwukwara na ọ bụ Obasanjo hibere ụlọọrụ dị icheiche gbara ọkpụrụkpụ ndị ka dịkwa ire ruo taa.

"Ọ bụ Obasanjo hibere NHIS (National Health Insurance Scheme, ya webatara ekwentị, ya hibere EFCC na ICPC."

Ọ bụkwa Obasanjo hibere atụmatụ 'Sovereign wealth fund' nke mere Naịjirịa ji malite idopu ego maka ọdịnihu.

Mana ọ bụghị sọ mma mma ka e ji echeta Obasanjo, ọ nwegara ụkwụ ọ kpọrọ nyere ya ajọ aha ebe ndị ụfọdụ nọ.

Ha gụnyere:

5 ) Agha Biafra

Obasanjo so n'otu n'ime ndị isi agha Naịjirịa n'oge a lụrụ agha Biafra.

Dịka ọkammụta Ugoji Egbujo si kwuo, Ọbasanjo so na ndị kacha mekpaa Bịafra ahụ n'oge agha.

6) 'Third term'

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto,

Obasanjo chọrọ ịchị Naịjirịa ugboro atọ mana o nweghi isi

Ọkammụta Ugoji Egbujo kwuru na ọ bụ eziokwu na Obasanjo hụrụ Naịjirịa n'anya, mana mpako ya bụ ihe metọrọ ihe niile o mere.

Egbujo kwuru na "Obasanjo chọrọ ịchị Naịjirịa ruo ụwatụwa".

Cheta na mgbe ọchịchị Obasanjo chọrọ ịbịa n'isi njedebe, ọ malitere ịkpa nkata etu ọ ga-esi chikwuo afọ anọ ọzọ ije mezuo ọchịchị ya afọ iri na abụọ.

Nke a ka a kpọrọ 'third term agenda' na bekee.

Mana ọtụtụ ndị ụlọ omeiwu ukwu gbadoro ụkwụ n'ala, jụwaa isi na ya bụ ihe agaghị enwe isi.

Na-agbanyeghi ihe ndị a, ọtụtụ kwenyere na Olusegun Obasanjo abụghị obere mmadụ, ma na Naịjirịa ma na mba ụwa.

Akụkọ ga-amasị gị:

Ihe nkiri ga-amasị gị:

Aha onyonyo,

'Hope Uzodimma ga-ewetere ndị Imo 400,000 ọrụ'