Coronavirus: Mmadụ atọ a na-enyo ebughi nje a - Legọs steeti

Coronavirus

Ebe foto si, Getty Images

Gọọmentị Legọs steeti ekwuola nnyocha e mere mmadụ atọ si njem mba Fransị,Ingland nakwa Chaina a na-enyo enyo maka ibu ọrịa Coronavirus gosiri na ha ebughị ya.

N'ozi Kọmịshọna ahụike na steeti ahụ bụ Akin Abayomi wepụtara n'igwe okwu Twitter ya, na mgbede Fraide, o kwuru na a hapụla mmadụ atọ ahụ ka ha lawa.

Ọ bụ ndị otu nzuzo gburu onwe ha n'Okigwe - Ndị uweojii

Ebe foto si, Getty Images

Ndị uweojii Imo Steeti ekwuola na ọ bụ ndị otu nzunzo na-alụ ọgụ gburu onwe ha na mpaghara Okigwe nke steeti ahụ.

Ọnụ na-ekwuru uweojii bụ Orlando Ikeokwu sị na mmadụ atọ nwụrụ ebe mmadụ anọ merụrụ ahụ n'ọgbaghara dapụtara n'elekere iri nke abalị Wenezde 4 Febụwarị, 2020.

Ọ sị na ha anwụchiela ọtụtụ ndị so n'ọgụ a ebe nyocha ka na-aga n'ihu ugbua.

Akụkọ na-efegharị na soshal midia sị na ọ bụ ndị ọchịehi gburu ndị mmadụ bụ nke mere ụlọomeiwu Imo steeti ji kpọọ kọmishọna uweojii ka ọ bịa zara ọnụ ya.

Mana Ikeokwu sị na onweghi mgbe ndị omeiwu ji kpọọ kọmishọna oku.

Ọ sị dịka ọ dị ugbua na gọvanọ Hope Uzodinma na kọmishọna uweojii nọ n'Ọkigwe ịmara etu ihe si kwụrụ ebe ahụ.

Coronavirus: 'Anyị agaghị emechi ụlọakwụkwọ na ebe okpukperechi'

Ebe foto si, Getty Images

Mịnịster ahụike Naijiria bụ Dọkịta Osagie Ehanire ekwuola na mmadụ abụọ n'ime mmadụ atọ a na-enyọ enyo na ha bụ ọrịa coronavirus bata Naijiria ebughị ya.

Ehanire onye gbara ama a na mkparịtaụka ya na ndị ntaakụkọ nwere na Abuja ụbọchị Fraide kwuru na mpụtara nnyocha e mere onye nke atọ apụtabeghị.

O kwuru na ka ọ dị ugbua, gọọmenti agaghị emechi ụlọakwụkwọ maọbụ ebe okpukperechi.

Kama na gọọmenti na-etinye anya ike n' ebe e si abata Naijiria iji hụ na ebughị ọrịa ahụ bata Naijiria.

Legọs steeti edopụla mmadụ atọ ọzọ iche maka Coronavirus

Ebe foto si, Getty Images

Dịka ụwa niile na-agba mbọ ịhụ na ha chekwara ma gbochie ọrịa CoronaVirus, gọọmentị Legọs steeti ewepụla mmadụ atọ ọzọ maka nyocha na ha nwere ike i bụ ọrịa corona Virus.

Ọ bụ ngalaba na-ahụ maka ahuike na Legọs steeti kwuputara nke a ma kọwaa na mmadụ atọ a sị mba Chaịna, Fransị na Inglandị n'otu n'otu.

Ha kwukara na ha na-eche ka mpụtara nyọcha ahụ mmadụ atọ a pụta ka ha mara ihe ọzọ ha ga-eme.

Lee ihe ha depụtara na Twitter ha

Ulọomeiwu na Abaribe

Dịka ndị ụloomeiwu nyere ikike ka gọọmentị Naijirịa bite ijeri dọllar iri abụọ na abụọ na ọma, omeiwu Enyinnaya Abaribe ekwuola na usoro esi nye ikike ibite ya bụ ego ezighịezi.

O kwuru na ndị omeiwu niile kwesiri itule ya bụ mbibi ka amara nke kwesiri ekwesi na nke ga-enyere aka dozie obodo.

N'ofesi,

Kamerun

Nkọwa foto,

Akwụkwọ ndị mba Kamerun depụtara maka Corona Virus

Ngalaba na-ahụ maka ahụike na mba Kamerun ekwuola n'ezie na enwere nwoke bụ ọrịa coronavirus na mba ahụ.

Ha kwukwara na nwoke a gbara afị iri ise na asatọ bụ onye mba Fransị batara isi obodo Yaounde n'ụbọchị iri abụọ na anọ nke afọ 2020.

Dịka ọ dị ugbụa, ha edopụla nwoke a iche maka ọgwụgwụ ma rịọ ndị Kamerun ka ha tinye ụchụ na ichekwa onwe ha maka ya bụ ọrịa.

Ebe foto si, CDC

Nkọwa foto,

Akụrụngwa eji enyocha onye nwere Corona virus

Gọọmentị Amerịka ekwupụtala na akụrụngwa ha nwere eji enyọchapụta ọria coronavirus agaghị ezu.

Ọ bụ osote onyeisiala bụ Mike Pence kwuru na ọ bụ na izuụka na-abịa ka ha nwere ike imezu nkwa ha kwere iwepụta akụrụngwa dị otu nde.

Ụgbụ a , ọrịa a egbuola mmadụ iri na abụọ na mba, ebe iri na otu n'ime ha sị Washington ebe nanị otu sị steeti ọzọ.

Dịka ọ dị ugbụa, ọrị a egbuola mmadụ puku atọ n'ụwa niile.

N'Egwuregwu

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto,

Odion Ighalo enyela goolu atọ n'ime asompi abụọ ọ gbarala ndị otu Manchester United

Odion Ighalo akwọfeela ụgbọ ndị Manchester united dịka ha jiri ọkpụ goolu atọ merịe ndị Derby Copunty n'Asọmpi FA cup.

Ighalo enyela goolu atọ n'ime asọmpị abụọ ọ gbaarala ndị ManUtd kamgbe ha zụtara ya n'ọnwa Jenụarị.