Coronavirus: Lee akụkọ asi niile na-ewu n'Afrịka maka ọrịa a

Ndị na-eme nyocha maka corona virus

Ebe foto si, Getty Images

Dịka ndị bu ọrịa Coronavirus n'Afrịka ebubeghị ibu, kama ọtụtụ gọọmentị n'Afrịka ka na-agba mgba imegide akụkọ asị gbasara ya bụ ọrịa.

Anyị ga-egosipụta ụfọdụ akụkọ asi ndị a na etu ha si bụrụ eziokwu ma ọ bụ asị.

1) Asi! Ọ bụghị iwu na ị ga-akpụcha afụ ọnụ gị maka nchekwa onwe gị maka corona virus.

Ebe foto si, CDC/BBC

Ọ bụ ihe onyịnyo ochie ndị ngalaba na-ahu maka nchekwa nke Amerịka wepụtara maka afụ ọnụ na ihe nchekwa e ji ekpuchi imi.

Ọ bụ ndị akwụkwọ ozi nke "Punch" nke Naijirịa buru ya bụ akụkọ.

2) Onye ndụ ndị ofufe Kraist

Akụkọ na David Kingleo Elijah onye ndụ na " Mount of Possibility church" kwuru na ya ga-aga mba Chaina ibuso coronavirus ọgụ wuru na intanetị.

N'oge na adịghị anya, akụkọ asị bidoro na-efegharị na ya bu ụkọchukwu gara Chaịna ma bute ya bụ ọrịa.

Ha gosikwara ihe onyonyo ebe ha sị na ọ nọ n'ụlọọgwu maka na obutele ya bụ ọrịa.

3) Akụkọ asị maka onye na-akwọ ụgbọala

Akụko asị na-enwere otu nwoke na-anya ụgbọala butere ya bụ ọrịa dịka o buru nwoke onyeọcha bụ ọrịa corona virus.

Akụko asị a kwuru na nwoke a si n'ụlọọgwụ gbapụ ma kwuo ka enye ya otu nde narị naịra ma ọbụghị ya ọ ga-ebusa ya bụ ọrịa.

4) Ndị mba Kenya

Ndị mba Kenya etiela mkpu na akụkọ na-agagharị na Shosal midia ebe gọọmentị kwuru na enwere mmadụ iri isii na atọ bụ ya bụ ọrịa coronavirus na Kenya.

5) Ọgwụgwụ ya bụ ọrịa

Akụko ihe onyonyo ebe onye ụkọchụkwụ kwuru na "pepper soup" na-akwọ ya bụ ọrịa coronavirus.

Aha nkeananụānụ,

Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile