Coronavirus: Ihe o ji raa ahụ ịkwụsị ndị mmadụ imetu aka n'ihu ya

Nwa na-eche echiche Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Anyị na-emetu aka n'ihu anyị ma ghara ịma na anyị na-eme ya

Otu n'ime ihe dị iche anyị na ụmụanụ bụ na mmadụ na-emetukarị aka n'ihu na-amaghị ama.

Ọ bụ agwa a na-enyekarị ọrịa Covid 19 aka agbasa.

Maka gịnị ka anyị ji emekarị ya ma kedụ otu anyị ga-esị kwụsị ya?

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ụmụnje na-esikarị n'ọnụ, ime nakwa n'anya aba mmadụ ahụ

Gịnị ka anyị ji eme ya?

Ọ dịka ọ bụ ebum pụtaụwa na mmadụ na ụfọdụ anụmanụ dịka adaka na-emetụkarị aka n'ihu ha.

Ọkammụta na Saịkọlọji bụ Dacher Keltner nke mahadum UC Berkeley for America sị na imetu aka n'ihu na-eme ka mmadụ nwete onwe ya ma mgbe ụfọdụ anyị na-eme ya ma anyị hụ onye anyị huru na anya.

Ndị ọkammụta ọzọ gbasara agwa mmadụ sị na anyị na-eme ya mgbe ụfọdụ ka anyị were chịkọnata obi anyị maọbụ dowe obi anyị otu ebe.

Mana nsogbu bụ na ọ bụ ya bụ agwa na-ebusa nje n'ahụ mmadụ.

Iji maa atụ, ọrịa Covid 19 na-esi na mmiri ahụ mmadụ dịka asọmmiri abanye ndị ọzọ n'imi maọbụ n'ọnụ.

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ọ bụghịkwa naanị mmadụ na-emetu aka n'ime

Mmadụ nwere ike ibute nje site n'imetu ihe ya bụ nje dị aka bụ ebe ọ nwere ike ịnọ rụọ abalị itoolu.

Ọ bụ ogologo ndụ a ya bụ nje na adị, ya na ka o sị esi n'aka mmadụ meturu n'ihu banye na ahụ mmadụ mere ya bụ nje ji dị ajọ njọ.

Ọkammụta ndị Mahadum Leeds bụ Stephen Griffin na-akọwa na iji akwanza bekee kpọrọ "face mask" kpuchie ihu nwere ike ime ka mmadụ metudebe aka n'ihu karịa ịza ikuku nke ha che na o bu nje ọrịa ahụ.

Kedụ ihe anyi nwere ike ime iji kwusilata imetu aka n'ihu?

Ọkammụta n'ihe gbara agwa ndi mmadụ na Mahadum Columbia bụ Michael Hallsworth sị na ịkwusị ndị mmadụ imetu aka n'ihu ha hiara ahụ.

Ọ sị na ọ ka mfe ịsị ndị mmadụ kwọwa aka karịa ịsị ha emetuzila aka n'ihu.

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Kedụ ka ị ga-esi kwusili ihe ị maghị na ị na-eme?

Ọkammụta a sị ka anyị chọwa ihe mere mmadụ jikarị emetu aka n'ihu iji mata ka anyị ga-esi kwọọ ya bụ ọrịa.

"Ọ mara atụ sị na onye ọkọ na-akọ n'ihu nwere ike iji azụ aka kọo ya karịa iji mbọ".

Ọ sịkwa na "ọ bụghị na nke ahụ dị mma kama na ọ ka mma".

Ọ sịkwa "ndị na-akọkarị ọkọ n'anya nwere ike iyi ugegbe anya, maọbụ tukwuruala n'elụ aka ha ị iji gbalahụ ọnwụnwa ya".

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ịkwọcha aka nke ọma bụ ebe anọ

Ị nwere ike iji ihe ndị ọzọ ị ga-eji emegharị aka dịka nke akpọrọ "stress ball" na Bekee bụ nke ị ga-eji ọgwụ eji egbu nje hichaa nke ọma.

Mana a eyikwala afe aka Bekee kpọrọ "glove" maka ọ bụrụ na ị naghị agbawe ya ka o kwesiri ma yiri ya na-akwọ aka gị, nje nwere ike ị banye na ya.

Ụzọ kacha mma iji gbochie ya bụ ọrịa bụ ịkwọcha aka nke ọma.

Dịka onyeisi na WHO bụ Tedros Adhanom Ghebreyesus kwuru "e chela ka e wepụta ọgwụ mgbochi ọrịa a, ị mara ihe ị ga-eme iji nyere onwe gị na ndị ọzọ ka taa, bido ozugbo".

Isiokwu Ndị Emetụtara