Ngọzị Okonjo-Iweala: Ihe mere ụwa jiri echu nwa ada Igbo a ka mmiri ngene

Ngozi Okonjo-Iweala

Ebe foto si, Getty Images

Nwaada Igbo bụbu Minista okwu ego dị n'aka bụ Ngozi Okonji Iweala bụ onye so agbaọsọ onyeisi World Trade Organisation (WTO) na-ekele ndị niile na-ekpere ya ekpere ọma nakwa ndị niile na-akwado ya na ya bụ ọsọ onyeisioche.

Ọ na-ekelekwa Onyeisiala Muhammadụ Buhraị nakwa ndị ọrụ WTO bụ ndị na-akwado ya na ya bụ nhọpụta dịka ha na-eke nkwụcha maka agba nke ikpeazụ.

Akụkọ na-ekwu na Okonjo-Iweala so mmadụ abụọ fọrọ na ndọrọndọrọ ọkwa onyeisi otu na-ahụ maka mgbere na mba ụwa bụ World Trade Organisation (WTO).

Ya bụrụ na Okonjo-Iweala meriri ọ ga bụrụ nwaanyi mbụ nakwa onye Afrịka mbụ na-achị ngalaba WTO.

Ị bụ onyeisi WTO ga-enye Okonjo-Iweala ntụru ugo pụrụiche ọhụrụ gunyere ndị kpọcha kpọcha o nweburu.

Onye bụ Ngozi Okonjo-Iweala?

Nwaanyị a bụ onye gụru akwụkwọ na mahadum Harvard ebe o nwetere asambodo maka ọkachamara n'ihe banyere akụnaụba.

A mụrụ ya n'ụbọchị 13 nke ọnwa Jun, 1954 dịka Ngozi Okonjo.

Nna ya bụ Chukwuka Okonjo bụbu obi nke Ọgwashị Ukwu na Delta steeti.

Di ya bụ Dọkịnta Ikemba Iweala

Nwa ya nwoke bụ ode akwụkwọ a ma ama bụ Uzodinma Iweala.

Ọ bu ya bụ nwaanyị mbụ rụrụ ọlụ dịka minista minista ego nakwa mmekọ Naịjirịa na mba ndị ọzọ.

Ọ rụrụ ọrụ dịka onyeisi na ụlọ akụ mba ụwa nke Bekee kpọrọ World Bank.

Ebe foto si, Twitter/@NOIweala

Nkọwa foto,

Okonjo-Iweala na Onyeisiala mba Saụt Afrịka b Cyril Ramaphosa

Olileanya Okonjo-Iweala na WTO

A bịa na olielenya WTO, Okonjo-Iweala chọrọ ha ngalaba ahụ nọdụ n'ihu inyere mba enweghi ego nwete ọgwụ mgbochi na ọgwụgwọ covid-19.

Ọ chọkwara imezi mmekọ mba Amerịka na ngalaba WTO.

Amerịka na-akatọ ngalaba ahụ maka usoro ya na-eme mba Chaịna ka mba ka na-emepe emepe.

Aha onyonyo,

Ihe mere ndị ntọ jiri tọrọ nne m - Okonjo-Iweala

Ihe mere aha ya ji ada ụda oge ọbụla

1: Ọ rụrụ ọrụ dịka onye nke abụọ na "World Bank"

Okonjo-Iweala no afọ iri abụọ na ise na "World Bank" ma ruo ọkwa a kpọrọ "Managing Director, Operation (2007-2011). Ọ rụrụ ọrụ dịka ihe Bekee kpọrọ "Development Economist" na Ụlọakụ Mbaụwa bụ "World Bank"

2: O mepeere ụmụnwaanyị ụzọ ịbụ minista ego na Naịjirịa

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto,

Obasanjo na Ngozi Okonjo-Iweala

Ọ bụ Olusegun Obasanjo kpọlatara Okonjo-Iweala ka ọ bịa nyere obodo ya aka dịka Minista na-ahụ maka ego.

Ọ malitere ọrụ n'afọ 2003 ruo afọ 2006 were laghachi Ụlọakụ "World Bank".

N'afọ 2011 Goodluck Jonathan bụ onye bụ onyeisiala n'oge ahụ kpọkwara ya okwu ife ala nna ya.

Ọ rụru ọrụ dịka minista ego ọzọ ruo afọ 2015. Ọ bụ

3: Aka ya dị n'ịtọpụ Naịjirịa na agbụ iji ụgwọ

Ọ bụ oge Okonjo-Iweala bụ Minista na-ahụ maka ego ka Naịjirịa nwetera mgbaghara ego nọ na-asụgbụ ha kemgbe ebutere ya n'aka ndị a kpọrọ "Paris Club".

Ego agbaghara n'oge ahụ bụ ijere dọla iri na asaa.

4: Ụlọ ọrụ ọkaibe na mbaụwa ejighị ya egwu egwu

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto,

Okonjo-Iweala na onyeisi IMF bụ Christine Lagarde

A ga-akọ ole ghara ole maka Okonjo-Iweala?

A bịa n'ihe gbasara nchekwa akụnaụba obodo, ọ nọ ya.

A bịa n'ihe gbasara mkpata na mmefu na mbaụwa, ọ kwụ chịm.

Nke pụtara ihe mere ndị mmadụ ji achọ ya ka azụ si akchọ mmiri

Ọ bụ otu n'ime ndị ndụmọdụ ụlọọrụ Okonjo-Iweala abụrụla otu n'ime ndị ndụmọdụ na Twitter, ma bụrụkwa nke ụlọakụ Standard Chartered.

Ọ bu onyeisi ndi ndụmọdụ ngalaba a kpọrọ "African Risk Capacity" nke Otu Mba Afịrịka nakawa nke Gavi (bụ ngalaba na-ahụ maka ọgwu mgbọchị ọrịa ụmụaka).

Ka ọ kwu ugbua, ihe ọfọdụ ndi seputere isi na-enye ya bụ ekele maka ugo ọhụrụ ọ tụrụ.

Peter Obi sị ya deme ma na-asi na ya ma na ọ ga-eme ọfụma.

Aka na-achị steeti Delta bụ Ifeanyi Okwa na-enye ekele ma na-akwado ada ha nwaanyị.

Atiku Abubakar sokwa kelee ya