Man United vs Man City: Udu ndị Man City ji bịa ichu iyi na be Man United akụwasịala

Pep Guardiola

Ebe foto si, Getty Images

Manchester United emeela nwanne ha Man City e cheta e bewe site n'iji ọkpụ goolu abụọ asataghị otu merie ha na premier league.

Anya mmiri pụrụ onye nchịkọta Man City bụ Pep Guardiola n'anya mgbe ụmụnne ha gbawara ha obi nke ugboro abụọ.

Dịka umunne maara onwe ha nke ọma, ọ dịghịrị mfe inye goolu n'asọmpi a ruo na nkeji 30 mgbe oche goolu ndị City bụ Ederson meghere ka Anthony Martial ji nye goolu.

Man City gbalịrị ike ha inyeta goolu mana Man United ji igodo gbachie ọnụụzọ goolu ha.

Mana nke kachasị gbawa ndị Man City obi bụ mgbe Scott McTominay nke Man United nyere goolu ha nke abụọ na nkeji 90 dịka ọ fọrọ tịkọm tịkọm ka e gbuchie bọọlụ.

Ole gunnar solskjær emeriela Guardiola ugboro abụọ ha na-ezute ibe n'asọmpi premier league nke afọ a.

Mmeria na-eme ya ugboro iri emeribeghi ndị Manchester United na nso nso dịka ha bụ ndị ise na tebụlụ premier league.

Chelsea ayọchaala Everton ka akamụ ndụ

Ebe foto si, Getty Images

Ihe Chelsea mere Everton n'asọmpi premier league dịka ebe okenye kpọbatara nwata n'ime ụlọ ma were agbajara na-apịazu ya ahụ niile.

Ụkwụ Everton jiri malite asọmpi a abụghị 'ụkwụ nnama ji a ga Ụmụahịa'. Ha dịka ndị ike gwụrụ tupu asọmpi amalite.

Nke a mere Chelsea ji were ohere ahụ gbaa aha ọkpụ goolu anọ chara acha iji sị ha 'anyị a na-achịkwanụ?'

Ọ malitere na nkeji 14 mgbe Mason Mount gbara gburu gburu sụnye goolu nke mbụ ndị Chelsea.

Na nkeji asaa (nkeji 21) na-eso ya Pedro nyere goolu nke abụọ. Mana Chelsea ezughi ike dịka ha tara ọtụtụ ohere inye goolu.

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto,

Anclotti bụbụ onye nchịkọta Lampard n'afọ 2009 banye 2010 mgbe ọ na-achịkọta ndị Chelsea

Mgbe ọkara nke abụọ malitere Willian na Olivier Giroud nyere goolu nkeji 51 na 54 iji mee ya goolu anọ.

Lampard bụ onye nchịkọta Chelsea asọghị anya na Ancelotti onye nchịkọta Everton bụ onye nkuzi ya n'oge gara, o wee nye ya ụdị mkparị a.

Nke a ga-abụ ugboro abụọ Lampard na-emeri ndị nkuzi ya (Mourinho na Ancelotti) kamgbe o were ọkwa na Chelsea.

Mmerie a dosara Chelsea n'ogodo anọ na tebụlụ premier League.