Oil Prices: Ka ego mmanụ agbidi nwere ike ị si nyụọ Naijirịa anya

Ụlọọrụ na-egwupụta mmanụ agbidi

Ebe foto si, Reuters

Nkọwa foto,

Mmanụ agbịdị Naijiria na-egwupụta gbagoro kemgbe ndị agha nnupụisi Naija-Delta belatara mkpamkpa ha na-akpa na mpaghara ahụ

Enweela ọtụtụ nzụkọ maka mwakpo ọrịa Coronavirụs. kama nke mba ụwa niile kacha kpụrụ n'ọnụ bụ ndapụta nzụko mba ndị na-amịpụta ma na-ere mmanụ agbidi bụ OPEC (Organisation of the Petroleum Exporting Countries) mere n'ụbọchi isii nke ọnwa march afọ 2020 n'obodo Viena dị na mba Austria.

Nzụkọ a bụ ka ndị mba bụ ndị otu ngalaba a belata etu ha si emepụta mmanụ agbidi dịka mba Chaịna bụ ndị kacha azụta ya bụ mmanụ n'ụwa niile anaghi azụ zị ka ha si azụ.

Ọ bụ mba Saudi Arabịa bu ya bụ okwu n'isi.

Ha sị na nke a bụ ka mgbere mmanụ agbịdi baara mmadụ niile ụrụ.

Kama mba Rụshịa jụrụ ị so na ya bụ atụmatụ nke mere ka enwee nghọtahi na ya bụ nzụkọ ndị otu OPEC.

Dịka ọ dị ugbua, enweghịzị iwu jikọrọ mba ndị bụ otu OPEC nke bụzị na mmadụ niile ga-eme etu o siri sọ ha site ọnwa Aprelu.

Na-emeghị eme, ọnụ ahịa mmanụ agbidi "Brent" ejirila pacentị iri abụo na itolu daa rụọ dọlla iri atọ na asaa na ọma ebe mmanụ agbidi nke "West Texas Intermidiate" (WTE) ejirila pacantị iri atọ na abụọ daa ruo dọla iri atọ na atọ na ọma.

N'agbanyeghị mkpa mkpa a bidoro ọhụrụ, Mba Saudi Arabia ekwuola na ha ga-ebido ịmepụta mmanụ agbidi karịa etu ha sị emepụta ya ugbua.

Mbọ a niile bụ ka ha jiri aka ike mee ka mba Rụshịa kwenye na nkwekọrịta nzukọ ndị OPEC kwetara.

Ụzọ ego mmanụ agbidi sị họrọ Naijirịa njọ ahịa

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto,

Naijirịa na-akwado ibite $22.7B

Atụmatụ mmefu ego (bọọjeti) gọọmentị Naijirịa mere maka afọ 2020 hibere isi na n'ọnụ ahịa mmanụ agbidi bụ dọlla iri ise na asaa.

Nke a pụtara na ọ bụ ego sitere na ire mmanụ agbidi n'ọnụ $57 otu Barelụ ka Naijirịa ga-eji mezuo ihe ha tinyere na bujet.

Mana dịka ọ dị ụgbụa "agwọ nọ n'akịrịka".

Cheta na ọ bụ site na mmanụ agbịdị ka Naijirịa si eweta ego ha ji akwado mmefu gọọmentị dị iche iche.

Ọ bụrụ na ego Naijirịa na-emefu akarịa ego ha na-akpata, ya bụ na ọtanisi nwere ike iwakpo ụmụ naijirịa.

Kedu ihe njọ ahịa ego mmanụ agbidi nwere ike i butere Naijirịa?

1) Mbibi ego

O nwere ike isiri Naijirịa ike ibite ego ụgbụ a n'ihi na ndị ga-ebinye ha ego ga-ajụ; "kedu etu ị ga esi kwuo m ya?".

Ọ bụrụ kwanụ na nke a emeghị, gọọmentị na-akwado ibite ijeri dọlla iri abụọ na abụọ na ọma tupu ego mmanụ agbidi adaa.

Mana dịka ego mmanụ agbidi kụrụ afọ n'ala ugbua, ego a a na-eti mkpu na ọ pere mpe nwere ike ọ gaghị ezuzi n'ihi ego echere na a ga-esi na mmanụ agbidi kwado bujet agaghị ezuzi.

2) Ụtụisi na mmefu

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto,

G ọọmentị nwere ike i ji ụtụisi belata njọ ahịa ego mmanụ agbidi.

Ọ bụrụ na ego mmanụ agbịdị gaa n'ihu na-akụ afọ n'ala, Naijirịa ga-achọ ụzọ ọzọ ha ga-eji nweta ego nke nwere ike ị bụ ibulite ụtụisi.

Nke abụọ ga-abụ iwetulata aka na mmefu ihe ndị na ebulite ọnọdụ ndị mmadụ nke a kpọrọ "Social Expenditure".

3) Ụlọakụ

Dịka n'afọ 2018 mgbe ọnụ ego mmanụ agbidi belatara, ụloakụ binyere ụlọọrụ na-amịpụta mmanụ agbịdị banyere na gbaharịa.

Nke a bụ maka na ndị ụlọọrụ ndị a enweghịzị ego ikwuchi ego ha bitere maka njọ ahia mmanu agbịdị.

4) Enweghị ọrụ

Ebe foto si, Getty Images

Mgbe ụlọọrụ na-amịpụta mmanụ agbidi na ụloakụ enweghịzi ego ha ji arụ ọrụ, ha na-achụkarị ndị ọrụ ha iji webileta mmefu ha.

Ihe nke a pụtara bụ na otụtụ ndị mmadu agaghị enwe ọrụ.

5) Idozi obodo

Ebe foto si, AFP/Getty Images

Nke a bụ na gọọmentị Naijirịa agaghịzị enwe ike itinye ego na-arụmarụ na ihe ndị dị iche iche eji edozi obodo. Nke a pụtara na ụloọrụ na arụpụta ihe na-eji ihe dịka ọkụ latrik na ezigbo okporo ụzụ arụ ọrụ ga anụ ụda ya.

6) Ndị na-achụ nta ego si ofesi

Ọ bụrụ na obodo enweghị ihe arụmarụ di iche iche dịka Latrik na okporo ụzọ, ndị na-achụ nta ego si ofesi anaghị abiakarị obodo ndị a.

Gịnị ka ndị ọkammụta maka akụnaụba na-ekwu

Ọkammụta Michael Famoroti nke ụloorụ "Stears Data" kọwara na mmefu gọọmentị dị mkpa nke ukwu maka ịghazị akụnaụba obodo.

Kama ọ sị na ọ na-atụ anya na mmefu gọọmentị n'afo 2020 ga-ebelata n'ihi na ego agaghị abata etu o si abata.

O kwu kwara sị "Goọmentị nwere ike ịmachi ọrire dọlaa dịka esiri mee n'afọ 2015".

Famoroti kọwara na dịka ọ bụ dọlaa ka mba na mba jị azụ ahịa, ọ bụrụ na Naijirịa ereghị mmanụ agbidi nweta dọlla, ya bụ na ha ga-amachị nke ha nwere.

Ọ nyere ndụmọdụ ka ndị mmadụ hapụ ịtụ ụjọ ma ọ mefuo ego ha n'ụzọ ọbụla maka ụjọ.

Dịka o si kọwaa na OPEC na mba ndị bụ ide n'ịzụ ahia mba na mba nwere ike iwepụta atụmatụ ga-akwụsị nghọtaghe dị na etiti ndị otu OPEC.