Corn meal: Ụzọ ị ga-eji sie ọka ọ ghọọ eri-amịcha-ọnụ

Ọka a hụRụ n'ọkụ, agwa na ọka na akamụ na akara Image copyright BBC,@Ụkaegbu1,@Chefmide

A na-eche na ọ bụ na ebe mba Mexico dị ugbua ka ọka siri malite njem ihe karịrị afọ puku ise gara were gbasaa na mpaghara ụwa dị iche iche.

Ebe ọbụla o feghara, ndị mba ahụ nwere ụzọ dị iche iche ha ji esi ma nweta ụtọ na uru dị na ya.

Ọka bụ nri na-enye ike, "vitamin" ma na-enyekwa "fibre". Ọ na-enyekwa aka ka nri gbarie ọfụma n'afọ.

Lee ụfọdụ ụzọ ndị Igbo si esi ya nweta ụtọ ya n'ụzọ pụrụ iche:

1. Agwa na ọka

Image copyright @Foodace

Ngwa nri ị ga-eji sie ya:

1. Ọka - iko abụọ

2. Agwa Iko abụọ (maọbụ ịkpọcha ogbe ọka anọ maọbụ ise)

3. Mmanụ - ngaji ofe abụọ

4. Ịsha - otu ngaji Ngaji

5. Ose - Mkpụrụ ose ndụ ise maọbụ isii

6. Ogiri maọbụ ihe ọzọ eji nye nrị ụtọ - Otu mkpụrụ

7. Azụ ọkpọọ - Abụọ maọbụ atọ

8. Iyabasị - Otu ogbe

9. Nnu - Tinye oke ga-atụ ya

Usoro e ji esi ya

Image copyright @Ụkaegbu1

Kpachaa ọka gị, saa ya mmiri ma sinye ya n'ọkụ ruo elekere 45 maọbụ ruo oge o ghere ọfụma.

Saa agwa gị ma sie ya iche maọbụ sanye ya n'ime ọka gherelanụ, gbanyekwuo mmiri ọhụrụ. Sie ya n'ọkụ ganye mgbe agwa ahụ ga-eghee.

Saa azụ ọkpọ gị, wepụ ya ọkpụkpụ ma dowee ya n'akụkụ. Agwa ghee, tinye azụ, mmanụ, ose, ịsha, nnu na ogiri.

Sie ya nkeji 10 ọzọ maọbụ rue na mmiri nọ n'ime ya ataa, fotuo ya.

2. Ọka a hụrụ n'ọkụ

Image copyright Uche Akolisa
Nkenke aha onyonyo E ji ọka na ụbe dị ọkụ egbọ agụụ vma gbọkwa oyii n'oge Udummiri

Nke a bụ ome ngwangwa. Ọ na-egbo ahụ oge ọ dị oke mkpa ma egbughị ọbụla. I weta ọka n'ụgbọ, i wepụ ahịhịa, itinye ya n'ọkụ, nwa oge, ya eghee, nri adaa.

I nwere ike iji ube maọbụ akị oyibo zigaa ya bee ndị mụọ.

3. Ọka e siri esi

Image copyright @Foodace/Instagram

O nweghị ihe nke ga-eri gị karịa ọka na mmiri i ji sie ya.

Ngwa nri e ji esi ya

1. Ọka - Ole ị chọrọ ya

2. Mmiri - Ole ga-ezu isi ya

3. Nnu - Ole ga-atụ ya

Usoro e ji esi ya

Wepụ oke ọka dị ndụ ahịhịa na ajị dị ya n'ahụ.

Saa ya mmiri ma tinye ya n'ite. Gbanye ite ahụ mmiri ka ọ karịa ọka nọ n'ime ite.

Sie ya elekere 45 maọbụ rụọ ma o ghee. Fotuo ya.

Mouth organ agbaala!

Sie ya Elekere 45 maọbụ otu awa. O ghee, tinye ya nnu ma hapụ ya nwa oge n'ọkụ tupu ị họpụ ya n'elu ọkụ.

Nri adaala! I nwere ike iji akị maọbụ akị bekee gwọọ ya ịba.

4. Ịkpọ ọka

Image copyright @Mastecooks

Ụfọdụ na-akpọ ya ịkpọ ọka, ebe ụfọdụ ji elele ọka mara ya.

Ngwanri e ji esi ya

1. Ọka (ndụ maọbụ nke kpọrọ nkụ) - Iko atọ maọbụ anọ

2. Akwụkwọ e ji eke

3. Mmanụ - Ngaji ofe abụọ

4. Ịsha - otu ngaji ofe

5. Magị - otu mkpụrụ

6. Nnu - ole ga-atụ ya

Usoro e ji esi ya

Suo ọka n'odo maọbụ were ingini kwọrie ya.

Tinye mmiri, mmanụ, isha, maggi na nnu n'a nnukwu efere ma gwọkọta ngwa nri ndị a.

I nwere ike itinye akwụkwọnri dịka ụgụ ma ọ masị gị.

Sinye mmiri n'ọkụ n'ite. Ọ sụọ, bido were ngaji kunye obere obere n'akwụkwọ elele maọbụ akwụkwọ ojoko a ghara n'ọkụ. ikechie, itinye na mmiri ọkụ na-asụ n'ọkụ.

Ha niile banyechaa n'ite ahụ, were nnukwu akwụkwọ sachie ya ma kwuchie ite ahụ nke ọma ka ụgọfụ were ghee ndị dị n'elu ọfụma.

5. Ịkpọ ọka-ogede

Image copyright @matsecooks

A na-esi ịkpọ ọka-ogede etu e si esi ịkpọ ọka, naanị ihe dị iche bụ na ị ga-etinye ogede chara acha na ngwa nri gị.

Ngwanri e ji esi ya

1. Ọka (nke ndụ maọbụ nke kpọrọ nkụ) - Iko anọ

2. Akwụkwọ e ji eke

3. Mmanụ - Ngaji ofe abụọ

4. Ịsha - otu ngaji ofe

5. Magị - otu mkpụrụ

6. Nnu - ole ga-atụ ya

7. Ojoko chara acha- Abụọ

Usoro e ji esi ya

Tinye ngwa nri niile dịka ọ dị na isi ịkpọ ọka n'efere maka ngwọkọ. Suo ogede (ojoko) abụọ chara acha n'ikwe ma tinyeazị ya n'ime efere ahụ. Gwọkọọ ha niile.

Kee ya n'akwụkwọ elele tinye na mmiri ọkụ na-asụ asụ. Hapụ ya elekere 45 maọbụ otu awa ka o ghee.

Ka anyị zunye gị ori ụka: Ikpọ ọka ogede na-atọwa ntị!

6. Akamụ

Image copyright @Chefmide
Nkenke aha onyonyo Akamụ na akara na-adị mma ịgba azị ụtụtụ

Ngwanri e ji esi ya

1. Ọka - Iko iri

2. Mmiri - otu gallon

3. Udu maọbụ bọketi nwere okwuchi

Usoro e ji esi ya

Saa ọka gị ma nwụnye n'ime udu.

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionNri ogbenye ọgalanya na-erizi

Hapụ ya na mmiri abali atọ.

Gụpụta ya na mmiri ma saa ya ụgbọọ atọ maọbụ anọ ka isi ọjọọ pụọ ma gwọ ya na'ingini.

Were nnyọ yọọ ọka ahụ ma wepụ okirikọ dị ya.

Gbanye mmiri ọka ahụ n'akpa nnu ka mmiri niile nọ n'ime ya pụọ.

Akamu adịla! Wara ole dị gị mma, were obere mmiri gbarie ya ma gbanye ya mmiri ọkụ.

Akamụ oyo oyo abịala! I nwere ike iji akara maọbụ elele (agwa) dị ọkụ nyụọ ya ịkpakwụ.

7. Nri ọka/Agidi

Nri ọka bụ ụzọ pụrụ iche Igbo si esi ọka ọ ghọọ eri-aracha-aka.

Ngwanri e ji esi ya

Image copyright @matsecooks

1. Ọka (nke kpọrọ nkụ) - Iko asatọ

2. Mmiri - otu galọnụ maọbụ karịa

3. Udu maọbụ bọketi nwere okwuchi

4. Akwụkwọ e ji eke elele

Usoro e ji esi ya

Saa ọka ahụ, machuo ya n'okụ nwa oge, ihe dịka elekere ise.

Họpụ ya, saa ya mmiri ọzọ ma tinye ya n' injini kwọrie ya.

Gbanye mmiri n'udu maọbụ bọketị dị ọcha ma rịọ ya, iji yọchapụ okiriko ọka.

Ị yọchaa ha niile, hapụ ya n'ime ude ahụ nwa oge. O dolata, ị gbafulata mmiri sere n'elu ma wụnye nke fọọ n'ime ite.

Sinye ya n'ọkụ ma nọrọ nso na-akpagharị ya bụ mmiri ọka na-esepụghị aka rue oge ọ dịrị ka akamụ rọrọ arọ.

Image copyright Ntanta
Nkenke aha onyonyo Agidi na ofe ose dị ọkụ na-achụ oyi

I nwere ike iji ngaji tulee ma ọ ka na-atọ ndụndụ were mara oge ị ga-afotu ya n'ọkụ.

Were eku ma ọ bụ ngaji were kunye ya bụ ọka etu ị chọrọ ya n'akwụkwọ maọbụ n'efere

Ọ jụọ oyi, inweta nrị ọka gị maọbụ agidi.

Dịka i na-eme ihe ndị a niile nke a gbaa mbọ hụ na nnu abaghị na ya bụ ọka bido na mbido rue na njedebe. Nnu banye ọ ga-agbatọ nrị ọka ahụ mee ka o mebie na- egbughị oge.

Nri ọka na-atọwa isi ma e jiri ofe ọkwụrụ maọbụ ọgbọnọ rie ya.

Ụfọdụ obodo n'ala Igbo na-eji ofe akwụ eri nri ọka, ebe ụfọdụ na-eji ofe ose nke Bekee kpọrọ 'pepper soup' ezila ya ala mụọ.

Akụkọ ga-amasị gị: