AMVCA 2020: Ndị meriri na ndị e meriri na'emume nke afọ

Stanley 'Funnybone' Chibunna Image copyright Instagram/Funnybone
Nkenke aha onyonyo Stanley 'Funnybone' Chibunna

Stanley Chibunna eritela nturuugo onye kacha akpa ọchị n'ejije Nollywood.

Chibunna onye e ji Funnybone mara ritere nturuugo a n'emume 'Africa Magic Viewers Choic Awards' nke afọ 2020.

N'okwu ya, Funnybone kwuru na ya na-echeta nne ya onye nke nwụrụ ọnwa olemole gara aga.

Image copyright Instagram/Ramsey Noah

Living in Bondage eturula ugo dịka ejije kacha ibe ya mma na mpaghara ọdịda anyanwụ Afrịka n'afọ 2019/2020.

Ya bụ ejije nwetara nturuugo a n'emume 'Africa Magic Viewers Choic Awards' e mere n'ụbọchị Satọde.

Ejije a bụ mmegharị ejije nke mbụ e ji malite Nollywood bụ nke a kpọkwara 'Living in Bondage'.

Onye haziri ejije nke a bụ Ramsey Noah.

Ndị ọzọ sokwa mee ya gụnyere Kenneth Okonkwo, Kanayo O. Kanayo, Bob Manuel Udokwu na ndị ọzọ.

Image copyright Instagram/Victor Iyke
Nkenke aha onyonyo Nne ritere ntuuruugo maka ejije kacha mma e ji asụsụ Igbo mee

BBC Igbo kwụ chịm dịka a na-etunye ndị gbara mbọ na Nollywood ugwu kwesịrị ha.

N'ime ntuurugo 26 e wepụtara na AMVCA nke afọ a, naanị asaa ka ndị ọha mmadụ nwere ike ịtụrụ vootu.

Lee ka okwe si gbaa:

Nkenke aha onyonyo Ihe nkiri a kpọrọ 'Nne' nke Victor Iyke mepụtara, ritere nzere ejije kacha bụ nke e ji asụsụ Igbo mee
  • Ejije Igbo kacha mma bụ nke a kpọrọ 'Nne' nke onye mere ya bụ Victor Iyke
  • Onye meriri onye kacha mara ka e si eme 'Make up' bụ Lilian Omoyele Paul
  • Onye meriri 'Best Costume Designer' ejije TV bụ Dimeji Ajibola
  • Ndị meriri 'Best Picture Editor' bụ Tosin Igho and Bryan Dike
  • Onye meriri 'Best Sound Editor' bụ Christina Aragon
  • Ụlọorụ meriri 'Best Lighting Designer' bụ Cardoso
  • Onye meriri 'Best Cinematographer' bụ John Demps
  • Ihe nkiri ritere nturuugo 'Best Documentary' bụ Beverly Naya
  • Nke ritere 'Best soundtrack in a series' bụ Larry Gaga
  • Mkpụmkpụ ejije kacha mma bụ nke a kpọrọ 'Thorn'. Onye mere ya bụ Bola Enigma Akanbi
  • Ejije mkpaọchị kachc mma bụ 'Truth', nke onye mere ya bụ Anis Halloway