House Rent: Lekwa ebe ụgwọ ụlọ kacha dị ọnụala na mpaghara ọwụwa anyanwụ

Housing Estate in Enugu Image copyright AFam Okereke

Ihe atọ kachasị mmadụ mkpa n'ụwa a bụ nri oriri, akwa oyiyi na ụlọ obibi.

Mana ọbụghị mmadụ niile na-ahụ ebe ha ga-edebe isi n'ihi oke ọnụ ụgwọ ụlọ n'ada.

N'obodo niile mepere emepe na mpaghara ọwụwa anyanwụ, ịkwụ ụgwọ ụlọ abụghị egwu a chị ụtaba n'aka agba.

Mana kedu ebe ụgwọ ụlọ kacha ada ọnụ?

BBC Igbo bara n'ahịa ịmata nke ekwe na-akụ.

Ajụjụ anyị bụ: Kedu ebe ụgwọ ụlọ ihe dịka ọnụụlọ atọ (three-bedroom) kacha galaa ọnụ n'ala Igbo?

Enugwu

Image copyright Enugu State Govt.

N'ebe dịka GRA maọbụ 'Independence Layout', ụgwọụlọ maka ọnụ ụlọ atọ ahụ dị ga-ebido na puku 800 ruo otu nde naịra maka otu afọ.

Na 'New Heaven', ego ya ga-eru bido na puku 500 ruo puku 650.

Mana ị gaa n'akụkụ Achara Layout maọbụ Trans-Ekulu, ọ ga-abụ ihe dịka puku 300 maọbụ 350.

Ọnịcha

Nkenke aha onyonyo Ụlọelu bụ ihe e ji mara Ọnịcha

Nnamdị Obiejesi onye oji ego achụ ego na otu nkwọ Ọnịcha, kwuru na ụgwọ otu afọ maka ọnụ ụlọ atọ ga-eru puku 700 maka ụlọ ọhụrụ, maọbụ puku 400 maka ụlọ ochie na mpaghara GRA Ọnịcha.

Mana ụlọ di etu ahụ na mpaghara 'Housing Estate' dị na Three-three ga-abụ ebe puku 350 maọbụ 400.

N'Awada, Ugwuagba Obosi, Oba, ego ọnụ ụlọ atọ bụ bido na puku 250 ruo 300.

Owerri

Owere bụ obodo e ji ikpori ndụ mara, nke mere ọtụtụ ji echu ya ka mmiri.

Mana ịkwụ ụgwọ ụlọ ebe ahụ abụghị atọ kọbọ.

Ịchọta ọnụ ụlọ ato na mpaghara Ikenegbu, 'Concorde' maọbụ Spillberg ga-efu gị bido na puku 600 ruo 800.

I gaa na mpaghara Ọjị, 'Okigwe Road', Amakọhịa, Obinze, dịrị gawa, ị ga-enweta ọnụ ụlọ atọ a rụrụ ochie n'ọnụ puku 300 ruo 350.

Mana ụlọ ọhụrụ anaghị adị ala karịa puku 400.

Abakiliki

BBC Igbo jụrụ ese wee chọpụta na ụgwọ ọnụụlọ atọ na mpaghara GRA nke Abakiliki bụ bido na puku naịra 500 ruo otu nde.

Mana ebe ndị ọzọ dịka Azuiyiokwu, 'New Layout', 'Mile fifty' dịrị gawa, bụ bido na puku naịra 300 ruo 400.

Image copyright AFam Okereke

Awka

Ebe ụgwọ ụlọ ka ada ọnụ n'Awka bụ na mpaghara Agu Awka.

N'ebe ahụ, ọnụ ụlọ atọ kwụ chịm bụ bido na puku 600 ruo puku 800.

Ụlọ ochie dị ebe ahụ bụ bido na puku 400 ruo puku 450.

Ebe dị ka 'Awka town' bụ puku 300 maọbụ puku 350.

Mana ịbanye n'ime Amọbịa, Amansii, dịrị gawa, mmadụ nwere ike inweta ọnụ ụlọ atọ maka puku 250.

Aba

Na mpaghara 'Aba-Owerri road', 'Okigwe road' Ekenna, ọnụụlọ atọ nwere ike ịbụ malite na puku 400 ruo 600.

N'Ọgbọ hill, Ngwa road, Umuode, dịrị gawa, ọnụụlọ atọ bụ malite na puku 130 ruo 200.

Cheta na ụlọ ọhụrụ na-aka ụlọ ochie ada ọnụ.

Image copyright AFam Okereke

Nnyocha BBC gosiri na ịkwụ ụgwọ ụlọ n'Enugwu abụghị ihe ụmụaka.

Anyị chọpụtakwara na ebe ndị na-akpọtụ akpọtụ n'Owerri abụghịkwa obere ego.

Abakiliki na Ọka sokwa na-ebe okwu na-agala ọnụ.

Mana ị gaa Aba, Ọnịcha, maọbụ Ụmụahịa, ebe ahụ ka ụlkọ kacha ọnụ ala.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:

Ihe nkiri ga-amasị gị:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAmputee Model: 'Mmadụ agaghị afụ gị n'anya ma ọ bụrụ na ịhụghị onwe gị n'anya'