Fertility Checks : Ajụjụ dị oke mkpa i kwesiri ịjụ onye nke gị tupu ụnụ alụọ

Nwoke na nwaanyị Image copyright Getty Images

Alụmdi na nwunye abụghị egwu achị ụtaba n'aka agba.

O kwesịrị na ndị ọ dị n'obi ịlụ ga-ajụ ajụjụ dị mkpa banyere ahụike ha, ọkachasị ọnọdụ ịmụta nwa tupu ha alụwa.

Lee ụfọdụ ese dị mkpa na nwoke na nwaanyị ga-ajụ banyere onwe ha tupu ha biri ka nwaanyị na di:

1. Ị riaala ọrịa nsina mmekọ mbụ?

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Nwaanyị a dịka ọ na- atụ arịrị sị,"Ọ kọwatasịghị m n ọfụma"

Ọrịa nsina mmekọ nke Bekee kpọrọ "Sexually transmitted Infections" bụ ọrịa na-emebi akpa amụ maọbụ akpa akwa (gonads) ma ọ bụrụ na a gwọọghị ya n'oge.

Dọkịta Ayodeji Oluwole nke Lagọs University Teaching Hospital kwuru na "ọ bụrụ na agwọghị ọrịa 'Gonorrhea', 'Syphilis,' 'Chlamydia', 'Hepatitis B' n'oge maọbụ na-agwọghị ya ọfụma, ha nwere ike imebi akụkụ ahụ metụtara ọmụmụ nwa."

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionDi na nwunye mụrụ nwa ka afọ 17 gachara

Nghọta ụfọdụ bụ na ọ bụ naanị nwaanyị na-agba 'alabanko' na-emebi ihe e ji amụ nwa n'ihi ọrịa so inwe mmekọrịta, mana ka ọ dị be oke ka ọ dị be ọgịnị.

Idina onye ọbụla na-enweghị mgbochi nwere ike imetụ nwoke n'ihi na ọrịa nsina mmekọ taa akụ n'ime ahụ nwoke, o nwere ike ime ịmetụ mmiri amụ maọbụ mee ka mkpụrụ nwa ghara ịdị n'ime ya (azospermia).

Cheta na ihe mere ụfọdụ ime ji apụ nwaanyị bụ n'ihi na mkpụrụ nwa si na-ahụ nke nwoke ejighị ahụ.

2. Gịnị bụ 'blood group' gị?

Image copyright Science Photo Library

E nwere otu ọbara atọ, Otu 'A', otu 'B' na otu 'O'.

Ndị ọkachamara na-ekwu na ọ bụrụ na nwaanyị nwere Rhesus- negative (Rh−) lụọ nwoke nwere 'Rhesus- positive' ( Rh+ ) dị ime mbụ ya ọ bụrụ 'Rhesus- positive' ( Rh+ ), o nwere ike isi n'alọ (placenta) banye n'ọbara nwa ọzọ butere ya ọrịa a kpọrọ "rhesus Disease.

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionỌ dị mma di na nwunye inwe otu ọbaego n'ụlọakụ?

Dkta Joseph Akinde , onye nwe ụlọọgwụ Livingspring Hospital, Ejigbo, Legọs kọwara na "nke nwere ike ime ka ime pụọ nwaanyị, maọbụ a mụọ nwa ahụ ọ nwụọ, maọbụ o nwee ọrịa obi, maọbụ nke ụbụrụ, maọbụ nwa ahụ enwe ọrụsị."

Ọ bụghị na nwaanyị nwere 'Rhesus- negative' agaghị alụ di, kama ọ dị mkpa ịmata nke a n'oge iji gbochie ọdachi amaghị ama.

A na-agba nwaanyị nwere ya ọgwụ awa 72 o ji mụcha nwa iji mebie nke Bekee kpọrọ "Rhesus-positive cells" si n'ahụ nwa ọhụrụ banye ya n'ahụ.

Nwaanyị mụọọla nwa mbụ maọbụ nke terela ime mbụ nwere ike inwe nsogbu a.

3. Nke nwaanyịtụọla ime mbụ? o teela ime mbụ?

Nke a dị nnukwu mkpa n'ihi na dịka dọkịta akụ ike ụmụnwaanyị bụ Ngọzị Obi siri kọwa ọ bụrụ na ọ tụọla ime mbụ ya bụ na o nwere ike ịtụ ọzọ.

Obi kwukwara na ọ bụụ na oteela ime mbụ, o nwere ike ibute nsogbu ga-eme ịtụ ime ọzọ ahịa ahụ.

Ndị ọkachamara na-ekwu na-ite ime nwere ike ime ka ọcha dị nwaanyị n'akpa nwa nke nwere ike ibute ọgbachị na-'fallopian tube' nke nwere ike ime ka ọ ghara ịtụnwụ ime.

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionNdụmọdụ Charly Boy maka alụm di na nwunye

Oke ite ime nwekwara ike ibute akpanwa enwenwughị ike ijidenwu nwa nke Bekee na-akpọ "cervical incompetence.'

"Cervical incompetence' dịka ka ndị ọkammụta siri kọwa, na-eme na ime na-apụ ụfọdụ nwaanyị.

5. O nwere ọrịa ala ala?

Ọrịa ala ala dịka varicocele , prostatis-ọrịa na-emetụta agede (prostate)- na ọrịa shuga nwere ike ime ka o sie ike nwoke ịtụwali nwaanyị ya ime.

N'ụmụnwaanyị, ọrịa ala ala dịka "endometriosis" nwere ike ibute amụtaghị nwa, ebe ọrịa shuga nwere ike inye nwaanyị nsogbu n'afọ ime.'

. Kedụ ụdị 'family planning' imerela mbụ? Kedụ nke ụnụ ga-agbaso ma ụnụ lụọ?

O nweela atụmatụ igbochị ịmụ nwa imerela na mbụ? Ajụjụ a dị mkpa n'ihi na atụmatụ ọbụla nwere ihe so ya nke nwere ike imetụta ịmụ nwa.

Ụmụ ole ka ụnụ ga-amụ? Nwoke ole, nwaanyị ole? so na-ajụjụ dị mkpa ụnụ kwesịrị ịjụ ma saa onwe ụnụ.

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAnyị alụọla afọ 57 mana anyị anaghị atọ ka shuga mgbe niile

6. Kedụ oge ibidoro hụwa nsọ gị?

Oge nwaanyị bidoro hụwa nsọ ya maọbụ ụgboro ole ọ na-ahụ ya n'afọ( , ọ dị 'regular' ka ọ dị 'iregular', nwere ike ịrụtụ aka otu ọnọdụ ọmụmụ nwaanyị.

Dr Joseph Akinde kọwara na ime nwere ike siere nwaanyị na-ahụ nso ya naanị ugboro abụọ maọbụ atọ n'afọ ike.

7. Kedụ mgbe o ji enwe 'ovulation' ya

Nwoke ị ma ma onye nke ya ọ na-ama oge ọ nọ n'izi (ovulation) n'ihi na ọ bụrụ na ọ naghị anọ n'izi, ị mara na ọ ga-enwe nsogbụ ịmụ nwa .

Dọkịta Obi sị,"Ihe ọ pụtara na ya bụ nwaanyị anaghị eyi akwa.

Mkpa ọzọ ọ dị dịka ndị ọkachamara siri kọwaa bụ na ọ ga-enyere ha abụọ aka ịmata oge ha ga-anọkọ ime achapuo nakwa oge ha kwesịị ị nọrọ onwe ha maọ bụrụ na ha achọghị nwa.

8. Gịnị bụ 'Genotype' gị?

Ọ bụ 'A' , 'AS' ka ọ bụ 'SS'? Onye nwere ọbara otu 'A' nwere ike ịlụ onye masirị ya, asịrị agaghị ịba ya.

Mana onye nwere AS lụọ onye nwere AS ha nwere ohere pasent 25 ịmụta nwa nwere ọrịa 'sickle cell.'

Dọkịta Akinde kwuru na ị mata nke ị bụ ga-enyere gị aka ịgbalahụ ị mụ nwa nwere sickle cell anamia.

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionIgbochi afọime nwereike ịzọ nwaanyị ndụ

Ọ gara n'ihu kwuo,"ilekọta nwa nwere sicjkle cell adịghịghị mfe. Ọ na-erikwa ego."

8. I nwere HIV?

O kwesịrị ka ndị chọro ịlụ onwe ha mee nnyocha ọbara iji mata ma ha enwere nje ọrịa HIV.

Cheta na HIV bụ ọrịa a na-eke site na mmekọ, iji ihe dị nkọ onye bu ya bụ nje jiri mee ihe.

Nnyocha ndị ọzọ dị mkpa gụnyere innyocha ahụike mkpụrụ nwa(sperm) nke Bekee kpọrọ 'seminal analysis'.

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionNneka na Isaac Moses maka Goge Africa

9. Nke nwoke enwere ọrịa mump oge ọ dị na nwata?

Nchọpụta sayensi na-egosi na ụmụnwoke nwere mụmp oge ha dị na nwata na-enwe nsogbu ịtụwali nwaanyị ime ma ha tozuo dimkpa.

'Mump' bụ ọrịa na-emetụta akụkụ ahụ na-emepụta asọmmiri nke na-ebute akwakanti(nti ịza aza) nke a na-ekute n'asọmmiri onye bu ya..

Ụlọọgwụ Mayo Clinic rụtụrụ aka na 'mump' nwere ike ibute ntị ochichi, ọrịa obi, ime ipụ maọbụ bute mee mkpụụ amụ nwoke ịzawa aza ma otoruo okoro bịa

Okwu dị mkpa

Ọ dị mkpa ịmata na mmadụ nwere ike izu oke, na enweghị ọrịa ọbụla maọbụ nkwarụ ọbụla mana ha lụọ onwe ha, ime e sierie ha ike.

Nke a ka Bekee na-akpọ 'unexplained infertility' nke bụ ime isi ike amaghị ihe butere ya.'

Akụkọ ga-amasị gị: