Coronavirus Lockdown: Etu ị ga-esi kwado dika a sị ka a nọdụ n'ụlọ

Ndị na-azụ ahịa Image copyright Luke Nwachukwu
Nkenke aha onyonyo Ebe ndị mmadụ kwụ na-eche ka enyochaa ihe ha zụrụ tupu ha akwụọ ụgwọ, n'otu ụlọahịa dị n'Owere

Ndị Igbo na-asị na nkwụcha abụghị ụjọ.

Dịka gọọmenti steeti ụfọdụ na Naịjirịa na-akwado ịsị ndị mmadụ nọrọ n'ụlọ maka igbochi mfesa coronavirus, ọ ga-adị mma ka ị mara etu ị ga-esi kwado ka ihe ghara iribido gị na ndị be gị.

Onyeisi ngalaba na-ahụ maka ikuziri ndị mmadụ etu e si ebi ndụ zuruoke bụ Rajiv Sharma kọwara ihe anọ mmadụ ga-eme iji chebiri mgbe a ga-asị onye ọbụla nọrọ n'ụlọ.

1. Jide obi gị aka

Sharma kwuru na ọ dị mma ka ndị mmadụ kwụsị ige maọbụ ikesa akụkọ ụgha gbasara ọrịa coronavirus.

O kwuru na kama ime nke a, tinye uchu n'ime ihe ga-egbochi ya bụ ọrịa ịbata n'ahụ gị site n'iwepụ ụjọ.

Jide obi gị aka.

2. Na-eri mkpuru osisi ọfụma

Image copyright Getty Images

Sharma dụrụ ọdụ ka ndị mmadụ rie mpkuru osisi dịka oroma, , kiwi, oroma, nkịrịsị, guava, grapefruit, akwụkwọ nri dịka broccoli, cauliflower, Brussel sprouts na capsicums nke gụnyere vitamin C.

O kwuru na ọ dịmma iri nri Alkaline ya karịrị asidi ọrịa ahụ na-ebute. Ụfọdụ nri ndị a gunyere Lemon, Lime, Avocado, Garlic Mango, Tangerine, Pineapple, Dandelion, Oroma nkịrịsị.

3 Na-akwọsi aka ike akwụsị akwụsị

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionLee etu nje ọrịa si ebufe onwe ha site n'aka atịtị

Sharma kwuru ka ndị mmadụ na-akwọ aka ha mgbe ọbụla ghara iji makana asị ka a nọdụ n'ụlọ kwụsị ime nke a.

Were kemikalụ na-egbu nje wee na-agbagasị na bee gị.

Kpuru akwa eji ekpuchi ihu maọbụrụ na ịgaghị ahapụ imetụ aka n'ihu.

4. Kwupute maka onye na-egosi na o bu ọrịa ahụ

Kpesara ndị na-ahụ maka ịchọpụta onye ọrịa coronavirus ji ma ọ bụrụ na onye nọ n'akụkụ gị na-egosi na ha bu ọrịa ahụ.

Ịmaghị ndụ onye inwere ike ịzọ site n'ime nke a.

5. Gokọta ihe ndị ga-abara gị uru

Nwaane gbaa mbọ gote ihe nri ga-anọteturu gị na ndị be gị aka n'oge ahụ ịnọ n'ụlọ.

Gote mmiri ọṅụnụ, ncha na ihe ndị ọzọ eji ehicha ụlọ nakwa ihe nri.

Gote ụmụ ihe egwuregwu ga-enyere ụmụ gị aka izu ike ọfụma.

Ụfọdụ ihe ga-eme maọbụrụ na ịnọ n'ụlọ kwụsị

  • Akwụsịla ịkwọ aka gị
  • Rie nri zuru oke
  • Gbatia ahụ gị
  • Akwụsịkwala inyocha ndị nọ n'akụkụ gị
  • A gaghị akwụsị ịgwa ụmụakwụkwọ ka ha ga-esi na-echekwa onwe ha
  • Gọọmenti etiti nakwa nke mba ụwa niile kwesiri ịhụ na ha nyochara ọfụma ndị na-abata be ha

Akụkọ ga-amasị gị:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAbule Ado Explosion: Onye bụ Henrietta Alokhai nke Bethlehem Girls?

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: